Abụ Ọma 125:1-5

Abụ Nrịgo. 125  Ndị tụkwasịrị Jehova obi+Dị ka Ugwu Zayọn,+ nke a na-apụghị ime ka ọ maa jijiji, kama ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.+   Jeruselem—dị ka ugwu si gbaa ya gburugburu,+Otú ahụ ka Jehova si gbaa ndị ya gburugburu+Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+   N’ihi na mkpanaka ajọ omume agaghị adịgide+ n’elu òkè ndị ezi omume ketara,Ka ndị ezi omume wee ghara ịmatị aka metụ ihe ọjọọ ọ bụla.+   Jehova, biko, meere ndị ezi mmadụ ihe ọma,+Bụ́ ndị obi ha ziri ezi.+   Ndị na-atụgharị gaa n’ụzọ ha nke gbagọrọ agbagọ,+Jehova ga-ekpochapụ ha na ndị na-eme ihe ọjọọ.+Udo ga-adịrị Izrel.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji