Abụ Ọma 122:1-9
Abụ Nrịgo. Abụ ọma Devid.
122 Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m:+“Ka anyị gaa+ n’ụlọ Jehova.”+
2 Jeruselem, ụkwụ anyị guzo+N’ime ọnụ ụzọ ámá gị.+
3 Jeruselem bụ ebe e wuru dị ka obodo+Nke e jikọtara ọnụ ka ọ bụrụ otu,+
4 Ebe ebo dị iche iche na-agbago,+Bụ́ ebo dị iche iche nke Jaa,+Ịga nye aha Jehova ekele,+Dị ka ihe ncheta o nyere Izrel si dị.+
5 N’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ocheeze ikpe dị,+Bụ́ ocheeze ụlọ Devid.+
6 Rịọnụ arịrịọ ka Jeruselem nwee udo.+Gị obodo, ndị hụrụ gị n’anya agaghị echegbu onwe ha.+
7 Ka udo dịgide n’ime ékpè gị,+Ka nchegbu ghara ịdị n’ime ụlọ elu gị.+
8 M ga-ekwu okwu n’ihi ụmụnne m na ndị enyi m, sị:+“Ka udo dị n’ime gị.”+
9 M ga na-achọ ọdịmma gị+N’ihi ụlọ Jehova Chineke anyị.+