Abụ Ọma 120:1-7
Abụ Nrịgo.
120 Akpọkuru m Jehova n’oge m nọ n’ahụhụ,+O wee za m.+
2 Jehova, biko, napụta mkpụrụ obi m n’egbugbere ọnụ nke na-ekwu okwu ụgha,+Nakwa n’ire na-aghọ aghụghọ.+
3 Gịnị ka mmadụ ga-enye gị, gịnịkwa ka mmadụ ga-atụkwasịrị gị,Gị ire na-aghọ aghụghọ?+
4 Ọ bụ akụ́ a pịrị apị nke dike,+Tinyere icheku ọkụ nke osisi brum.+
5 Efuola m, n’ihi na ebiriwo m dị ka ọbịa na Mishek!+Ebiriwo m n’ụlọikwuu m mara n’etiti ụlọikwuu ndị Kida.+
6 Mkpụrụ obi m ebiriwo n’ụlọikwuu ruo ogologo oge+N’etiti ndị kpọrọ udo asị.+
7 Achọrọ m udo;+ ma mgbe ọ bụla m kwuru okwu,Ha na-ejikere ịlụ agha.+