Abụ Ọma 12:1-8
Ntụziaka e nyere onye nduzi. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya n’ụda dị ala.+ Abụ olu ụtọ Devid.
12 Jehova, biko, zọpụta m,+ n’ihi na onye na-eguzosi ike n’ihe anọkwaghị;+N’ihi na e nwekwaghị ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’etiti ụmụ mmadụ.
2 Ha na-agwa ibe ha okwu ụgha;+Ha na-eji egbugbere ọnụ ire ụtọ+ ekwu okwu ọbụna n’ihu abụọ.+
3 Jehova ga-ebepụ egbugbere ọnụ niile ji ire ụtọ ekwu okwu,Bụ́ ire nke na-ekwu okwu mpako,+
4 Ndị sịrị: “Anyị ga-eji ire anyị nwee mmeri.+Anyị ga-eji egbugbere ọnụ anyị na-ekwu ihe masịrị anyị. Ònye ga-abụ nna anyị ukwu?”
5 “N’ihi ibukọrọ ihe ndị nọ n’ahụhụ, n’ihi ude ndị ogbenye na-asụ,+M ga-ebili ugbu a,” ka Jehova kwuru.+“M ga-echebe ya ka onye ọ bụla nke na-elelị ya ghara ime ya ihe ọ bụla.”+
6 Okwu Jehova bụ okwu dị ọcha,+Dị ka ọlaọcha a nụchara anụcha, nke a nụchara ugboro asaa n’ite ọkụ e ji agbaze ihe nke e gwunyere n’ala.
7 Gị onwe gị, Jehova, chebe ha;+Chebe onye nke ọ bụla ruo mgbe ebighị ebi ka ọgbọ a ghara ime ya ihe ọ bụla.
8 Ndị ajọ omume na-akpagharị,N’ihi na ụmụ mmadụ na-eto ihe ọjọọ.+