Abụ Ọma 119:1-176

א [Alef] 119  Obi ụtọ na-adịrị ndị ụzọ ha na-enweghị ntụpọ,+Ndị na-eje ije n’iwu Jehova.+   Obi ụtọ na-adịrị ndị na-edebe ihe ncheta ya;+Ha ji obi ha dum na-achọ ya.+   N’ezie, ha adịghị eme ajọ omume.+Ha na-eje ije n’ụzọ ya.+   Gị onwe gị enyewo iwu ka e debe iwu gị,+Ka e jiri nlezianya debe ya.+   A sị nnọọ na ụzọ m guzosiri ike+Ka m wee debe ụkpụrụ gị!+   Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m,+Mgbe m lekwasịrị anya n’ihe niile i nyere n’iwu.+   M ga-eji obi ziri ezi too gị,+Mgbe m mụtara mkpebi ikpe gị ziri ezi.+   M ga na-edebe ụkpụrụ gị.+Biko, ahapụla m kpamkpam.+ ב [Bet]   Olee otú nwa okorobịa+ ga-esi mee ka ụzọ ya dị ọcha?Ọ bụ site n’ịkpachara anya na-eme ihe i kwuru.+  10  Ejiriwo m obi m dum chọọ gị.+Emela ka m si n’ihe i nyere n’iwu kpafuo.+  11  Edebewo m okwu gị n’obi m,+Ka m wee ghara imehie gị.+  12  Jehova, ị bụ onye a gọziri agọzi.Kụziere m ụkpụrụ gị.+  13  Ejiriwo m egbugbere ọnụ m kọsaa+Mkpebi ikpe niile i ji ọnụ gị kwupụta.+  14  Ana m aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ncheta gị,+Dị nnọọ ka m na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe niile ọzọ dị oké ọnụ ahịa.+  15  M ga na-echebara iwu gị echiche,+M ga-elekwasịkwa ụzọ gị anya.+  16  Ụkpụrụ gị ga na-atọ m ụtọ.+Agaghị m echefu okwu gị.+ ג [Gimel]  17  Meso ohu gị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ka m wee dị ndụ,+Ka m wee debekwa okwu gị.+  18  Meghee anya m, ka m hụ+Ihe dị ebube ndị dị n’iwu gị.+  19  Naanị ihe m bụ n’ala a bụ onye mbịarambịa.+Ezochirila m ihe i nyere n’iwu.+  20  Ike agwụwo mkpụrụ obi m+ n’ihi agụụ mkpebi ikpe gịNke na-agụsi m ike mgbe niile.+  21  Ị baworo ndị mpako a bụrụ ọnụ mba,+Bụ́ ndị si n’ihe i nyere n’iwu na-akpafu.+  22  Wepụ nkọcha na nlelị a na-elelị m,+N’ihi na edebewo m ihe ncheta gị.+  23  Ọbụna ndị isi anọdụwo ala; ha agbawo izu imegide m.+Ma, ọ bụ ụkpụrụ gị ka ohu gị na-echebara echiche.+  24  Ihe ncheta gị na-atọkwa m ụtọ,+Dị ka ndị na-enye m ndụmọdụ.+ ד [Dalet]  25  Mkpụrụ obi m anọwo na-arapara n’ájá.+Chebe m ndụ dị ka i kwuru.+  26  Ekwupụtawo m ụzọ m, ka i wee za m.+Kụziere m ụkpụrụ gị.+  27  Mee ka m ghọta ụzọ e kwupụtara n’iwu gị,+Ka m wee chebara ọrụ gị dị ebube echiche.+  28  Mkpụrụ obi m adịghị arahụ ụra n’ihi iru uju.+Kulite m dị ka i kwuru.+  29  Wepụ ụzọ okwu ụgha n’ebe m nọ,+Meere m amara site n’ịkụziri m iwu gị.+  30  Ahọrọwo m ije ije n’ụzọ ikwesị ntụkwasị obi.+Agụwokwa m mkpebi ikpe gị n’ihe kwesịrị ekwesị.+  31  Araparawo m n’ihe ncheta gị.+Jehova, biko, emela ka ihere mee m.+  32  M ga-eji ọsọ na-aga n’ụzọ nke ihe i nyere n’iwu,+N’ihi na ị na-eme ka obi m saa mbara.+ ה [Hee]  33  Jehova, biko, kụziere m ije ije n’ụkpụrụ gị,+Ka m wee deberuo ya n’isi.+  34  Mee ka m nwee nghọta, ka m wee debe iwu gị,+Ka m wee jiri obi m dum debe ya.+  35  Mee ka m jee ije n’ụzọ nke ihe i nyere n’iwu,+N’ihi na ọ na-atọ m ụtọ.+  36  Mee ka obi m dịrị n’ihe ncheta gị,+Ọ bụghị n’uru.+  37  Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru;+Chebe m ndụ n’ụzọ nke gị.+  38  Mezuoro ohu gị ihe i kwuru,+Nke na-eme ka ọ na-atụ egwu gị.+  39  Mee ka nkọcha a na-akọcha m, bụ́ nke m na-atụ egwu ya, gabiga,+N’ihi na mkpebi ikpe gị dị mma.+  40  Lee! Iwu gị agụsiwo m agụụ ike.+Chebe m ndụ n’ihi ezi omume gị.+ ו [Wọọ]  41  Jehova, biko, mee ka m nweta obiọma* gị+Na nzọpụta gị dị ka i kwuru,+  42  Ka m wee zaa onye na-akọcha m okwu,+N’ihi na atụkwasịrị m okwu gị obi.+  43  Ewepụla okwu nke eziokwu n’ọnụ m kpamkpam,+N’ihi na echerewo m mkpebi ikpe gị.+  44  M ga na-edebe iwu gị mgbe niile,+Ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+  45  M ga na-ejegharị n’ebe sara mbara,+N’ihi na achọwo m iwu gị.+  46  M ga-ekwukwa okwu banyere ihe ncheta gị n’ihu ndị eze,+Ihere agaghịkwa eme m.+  47  Ihe i nyere n’iwu, bụ́ nke m hụrụ n’anya,+Ga na-atọ m ụtọ.+  48  M ga-agbasara ihe i nyere n’iwu, bụ́ nke m hụrụ n’anya, ọbụ aka m,+M ga na-echebara ụkpụrụ gị echiche.+ ז [Zayin]  49  Cheta okwu ị gwara ohu gị,+Bụ́ nke i mere ka m chere.+  50  Nke a bụ ihe na-akasi m obi mgbe m nọ ná mmekpa ahụ́,+N’ihi na okwu gị echebewo m ndụ.+  51  Ndị mpako akwawo m emo gabiga ókè.+Ma esighị m n’iwu gị pụọ.+  52  Jehova, echetawo m mkpebi ikpe gị nke dịwara malite mgbe ebighị ebi,+M na-enwetakwa nkasi obi.+  53  Oké iwe ji m n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ,+Bụ́ ndị na-ahapụ iwu gị.+  54  Ụkpụrụ gị aghọworo m abụ olu ụtọ+N’ụlọ ndị m biri dị ka ọbịa.+  55  Jehova, ana m echeta aha gị n’abalị,+Ka m wee debe iwu gị.+  56  Ihe a niile abụrụwo nke m,N’ihi na edebewo m iwu gị.+ ח [Het]  57  Jehova bụ òkè m;+Ekwewo m nkwa idebe okwu gị.+  58  Ejiriwo m obi m dum mee ka obi gị jụrụ.+Meere m amara dị ka i kwuru.+  59  Echebarala m ụzọ m echiche,+Ka m wee mee ka ụkwụ m laghachi n’ihe ncheta gị.+  60  Emere m ọsọ ọsọ, egbughịkwa m oge+Idebe ihe i nyere n’iwu.+  61  Ụdọ ndị ajọ omume gbara m gburugburu.+Echefughị m iwu gị.+  62  Ana m ebili n’etiti abalị kelee gị+N’ihi mkpebi ikpe gị ziri ezi.+  63  Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị,+Bụrụkwa enyi ndị na-edebe iwu gị.+  64  Jehova, obiọma gị jupụtara ụwa.+Kụziere m ụkpụrụ gị.+ ט [Tet]  65  Jehova, i mesowo ohu gị ihe n’ụzọ dị nnọọ mma,+Dị ka i kwuru.+  66  Kụziere m ịdị mma,+ ezi uche+ na ihe ọmụma,+N’ihi na enwewo m okwukwe n’ihe i nyere n’iwu.+  67  Tupu mụ anọrọ ná mmekpa ahụ́, anọ m na-emehie n’amaghị ama,+Ma ugbu a edebewo m okwu gị.+  68  Ị dị mma, ị na-emekwa ihe ọma.+Kụziere m ụkpụrụ gị.+  69  Ndị mpako ejiriwo okwu ụgha tezuo m ahụ́.+Ma mụ onwe m ga-eji obi m dum debe iwu gị.+  70  Dị nnọọ ka abụba, obi ha adịghịzi enwe mmetụta.+Ma mụ onwe m, iwu gị na-atọ m ụtọ.+  71  Ọ dị mma na e mekpara m ahụ́,+Ka m wee mụta ụkpụrụ gị.+  72  Iwu+ si n’ọnụ gị dị m mma,+Karịa ọtụtụ puku ọlaedo na ọlaọcha.+ י [Yod]  73  Ọ bụ aka gị kere m, o mekwara ka m guzosie ike.+Mee ka m nwee nghọta, ka m wee mụta ihe i nyere n’iwu.+  74  Ọ bụ ndị na-atụ egwu gị na-ahụ m wee ṅụrịa ọṅụ,+N’ihi na echerewo m okwu gị.+  75  Jehova, amaara m nke ọma na mkpebi ikpe gị ziri ezi+Nakwa na i jiriwo ikwesị ntụkwasị obi mekpaa m ahụ́.+  76  Biko, ka obiọma gị kasie m obi.+Dị ka ị gwara ohu gị.+  77  Mee ka m nweta ebere gị, ka m wee dịrị ndụ;+N’ihi na iwu gị na-atọ m ụtọ.+  78  Ka ihere mee ndị mpako, n’ihi na ha eduhiewo m n’enweghị ihe kpatara ya.+Ma mụ onwe m na-echebara iwu gị echiche.+  79  Ka ndị na-atụ egwu gị laghachikwute m,+Tinyere ndị maara ihe ncheta gị.+  80  Ka obi m debe ụkpụrụ gị n’ụzọ na-enweghị ntụpọ,+Ka ihere wee ghara ime m.+ כ [Kaf]  81  Agụụ nzọpụta gị emewo ka ike gwụ mkpụrụ obi m;+Echerewokwa m okwu gị.+  82  Atụkatala m anya okwu gị anya kpọọ m,+Ka m nọ na-asị: “Olee mgbe ị ga-akasi m obi?”+  83  N’ihi na adịzi m ka karama akpụkpọ+ a kwụwara n’uko ọkụ.Ma echefughị m ụkpụrụ gị.+  84  Afọ ole ka ohu gị ga-adị ndụ?+Olee mgbe ị ga-emezu ihe i kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị na-akpagbu m?+  85  Ndị mpako, bụ́ ndị na-adịghị eme ihe iwu gị kwuru,+Egwuwo olulu iji nweta m.+  86  Ihe niile i nyere n’iwu kwesịrị ntụkwasị obi.+Ha akpagbuwo m n’enweghị ihe m mere ha. Biko, nyere m aka.+  87  Ọ fọrọ nke nta ka ha laa m n’iyi n’ụwa;+Ma mụ onwe m ahapụghị iwu gị.+  88  Chebe m ndụ dị ka obiọma gị si dị,+Ka m wee debe ihe ncheta nke si n’ọnụ gị.+ ל [Lamed]  89  Jehova, okwu gị na-eguzosi ike n’eluigwe+Ruo mgbe ebighị ebi.+  90  Ikwesị ntụkwasị obi gị na-adị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+Ị tọsiwo ntọala ụwa ike, ka o wee dịgide.+  91  Ha adịrịwo ruo taa dị ka mkpebi ikpe gị si dị,+N’ihi na ha niile na-ejere gị ozi.+  92  A sị na iwu gị adịghị atọ m ụtọ,+M gaara ala n’iyi n’ime mmekpa ahụ́ m.+  93  Agaghị m echefu iwu gị ruo mgbe ebighị ebi,+N’ihi na i ji ha chebe m ndụ.+  94  Abụ m nke gị. Biko, zọpụta m,+N’ihi na achọwo m iwu gị.+  95  Ndị ajọ omume echebiriwo m, ka ha gbuo m.+Ana m echebara ihe ncheta gị echiche.+  96  Ahụwo m nsọtụ nke izu okè niile.+Ma iwu gị sara mbara nke ukwuu. מ [Mem]  97  Lee ka m si hụ iwu gị n’anya!+Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.+  98  Ihe i nyere n’iwu na-eme ka m mara ihe karịa ndị iro m,+N’ihi na ọ bụ nke m ruo mgbe ebighị ebi.+  99  Enwewo m nghọta karịa ndị nkụzi m niile,+N’ihi na m na-atụgharị uche n’ihe ncheta gị.+ 100  Ana m eji nghọta eme ihe karịa ndị okenye,+N’ihi na edebewo m iwu gị.+ 101  Egbochiwo m ụkwụ m ịga n’ụzọ ọjọọ ọ bụla,+Ka m wee debe okwu gị.+ 102  Esighị m ná mkpebi ikpe gị pụọ,+N’ihi na gị onwe gị eziwo m ihe.+ 103  Lee ka okwu gị si atọ okpo ọnụ m ụtọ,Ọ dị m ụtọ n’ọnụ karịa mmanụ aṅụ!+ 104  Iwu gị mere ka m jiri nghọta na-eme ihe.+Ọ bụ ya mere m ji kpọ ụzọ okwu ụgha niile asị.+ נ [Nun] 105  Okwu gị bụ oriọna nke na-enye ụkwụ m ìhè,+Bụrụkwa ìhè na-enwu n’okporo ụzọ m.+ 106  Aṅụwo m iyi idebe mkpebi ikpe gị ziri ezi,+M ga-emezukwa ya.+ 107  E mekpawo m ahụ́ nke ukwuu.+Jehova, biko, chebe m ndụ dị ka i kwuru.+ 108  Jehova, biko, ka àjà afọ ofufo m ji ọnụ m na-achụ tọọ gị ụtọ,+Kụziekwara m mkpebi ikpe gị.+ 109  Mkpụrụ obi m nọ n’ihe ize ndụ mgbe niile;+Ma echefughị m iwu gị.+ 110  Ndị ajọ omume esiworo m ọnyà,+Ma esighị m n’iwu gị kpafuo.+ 111  Ewerewo m ihe ncheta gị ka ọ bụrụ ihe onwunwe m ruo mgbe ebighị ebi,+N’ihi na ọ bụ ihe na-enye obi m aṅụrị.+ 112  Edoziwo m obi m idebe ụkpụrụ gị+Ruo mgbe ebighị ebi, ruo n’isi.+ ס [Samek] 113  Akpọrọ m ndị obi ha kewara ekewa asị,+Ma ahụrụ m iwu gị n’anya.+ 114  Ị bụ ebe nzuzo m na ọta m.+Echerewo m okwu gị.+ 115  Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ,+Ka m wee debe ihe Chineke m nyere n’iwu.+ 116  Kwado m dị ka i kwuru, ka m wee dịrị ndụ,+Emela ka ihere mee m n’ihi olileanya m nwere.+ 117  Kwado m, ka m wee bụrụ onye a zọpụtara,+M ga-elekwasịkwa ụkpụrụ gị anya mgbe niile.+ 118  Ị tụfuwo ndị niile si n’ụkpụrụ gị kpafuo;+N’ihi na aghụghọ ha bụ ụgha.+ 119  I wepụsịwo ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa dị ka ifurifu ọla.+N’ihi ya, ahụrụ m ihe ncheta gị n’anya.+ 120  Ahụ́ na-ama m jijiji n’ihi ụjọ m na-atụ gị;+M na-atụkwa egwu n’ihi mkpebi ikpe gị.+ ע [Ayin] 121  M kpewo ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume,+Biko, ahapụla m n’aka ndị na-emegbu m!+ 122  Nara ohu gị n’ibé maka ọdịmma ya.+Ekwela ka ndị mpako megbuo m.+ 123  Atụkatala m anya nzọpụta gị+ nakwa anya okwu ezi omume gị+Anya kpọọ m. 124  Meso ohu gị ihe dị ka obiọma gị si dị,+Kụziekwara m ụkpụrụ gị.+ 125  Abụ m ohu gị.+ Mee ka m nwee nghọta,+Ka m wee mata ihe ncheta gị.+ 126  Oge eruwo ka Jehova mee ihe.+Ha emebiwo iwu gị.+ 127  Ọ bụ ya mere m ji hụ ihe i nyere n’iwu n’anya+Karịa ọlaedo, ọbụna ọlaedo a nụchara anụcha.+ 128  Ọ bụ ya mere m ji were iwu niile i nyere banyere ihe niile dị ka nke ziri ezi;+Akpọrọ m ụzọ okwu ụgha niile asị.+ פ [Pee] 129  Ihe ncheta gị dị ebube.+Ọ bụ ya mere mkpụrụ obi m ji na-edebe ya.+ 130  Ikpughe okwu gị na-enye ìhè,+Na-eme ka ndị na-amaghị ihe nwee nghọta.+ 131  Emeghewo m ọnụ m, ka m wee na-eku ume ọkụ ọkụ,+N’ihi na ihe i nyere n’iwu na-agụsi m agụụ ike.+ 132  Chee ihu n’ebe m nọ ma meere m amara,+Dị ka mkpebi ikpe gị n’ebe ndị hụrụ aha gị n’anya nọ si dị.+ 133  Mee ka ụkwụ m guzosie ike n’okwu gị,+Ekwekwala ka ụdị ihe ọjọọ ọ bụla chịa m.+ 134  Napụta m n’aka onye ọ bụla nke na-erigbu mmadụ,+M ga-edebekwa iwu gị.+ 135  Mee ka ohu gị nweta ihu ọma gị,+Kụziekwara m ụkpụrụ gị.+ 136  Anya mmiri esiwo m n’anya na-asọda dị ka iyi+N’ihi na ha adịghị edebe iwu gị.+ צ [Sadee] 137  Jehova, ị bụ onye ezi omume,+Mkpebi ikpe gị zikwara ezi.+ 138  I jiriwo ezi omume gị nakwa ikwesị ntụkwasị obi dị ukwuu+ nye iwuKa anyị debe ihe ncheta gị.+ 139  Ekworo m erikpuwo m,+N’ihi na ndị iro m echefuwo okwu gị.+ 140  Okwu gị bụ ihe a nụchara nke ọma,+Ohu gị hụkwara ya n’anya.+ 141  Ọ dịghị ihe m bụ, a na-eledakwa m anya.+Ma echefughị m iwu gị.+ 142  Ezi omume gị bụ ezi omume nke na-adịru mgbe ebighị ebi,+Iwu gị bụkwa eziokwu.+ 143  Anọ m n’ahụhụ nakwa n’ihe isi ike.+Ma ihe i nyere n’iwu na-atọ m ụtọ.+ 144  Ihe ncheta gị ziri ezi ruo mgbe ebighị ebi.+Mee m ka m nwee nghọta, ka m wee dịrị ndụ.+ ק [Kof] 145  Ejiriwo m obi m dum kpọkuo gị.+ Jehova, biko, za m.+M ga-edebe ụkpụrụ gị.+ 146  Akpọkuwo m gị. Biko, zọpụta m!+M ga-edebekwa ihe ncheta gị.+ 147  Ebiliwo m n’isi ụtụtụ,+ ka m wee tie mkpu enyemaka.+Echerewo m okwu gị.+ 148  Anya m na-emeghe tupu oge nche abalị,+Ka m wee chebara okwu gị echiche.+ 149  Biko, nụrụ olu m dị ka obiọma gị si dị.+Jehova, biko, chebe m ndụ dị ka mkpebi ikpe gị si dị.+ 150  Ndị na-achụso omume rụrụ arụ+ abịawo nso;Ha nọ iwu gị n’ebe dị anya.+ 151  Jehova, ị nọ nso,+Ihe niile i nyere n’iwu bụkwa eziokwu.+ 152  Ọ dịwo anya m matara ụfọdụ n’ime ihe ncheta gị,+N’ihi na ị tọwo ntọala ha ka ọ dịruo mgbe ebighị ebi.+ ר [Resh] 153  Hụ mmekpa ahụ́ m, napụta m;+N’ihi na echefughị m iwu gị.+ 154  Kpeere m ikpe ma napụta m;+Chebe m ndụ dị ka i kwuru.+ 155  Nzọpụta dị anya n’ebe ndị ajọ omume nọ,+N’ihi na ha adịghị achọ ụkpụrụ gị.+ 156  Jehova, ebere gị dị ukwuu.+Biko, chebe m ndụ dị ka mkpebi ikpe gị si dị.+ 157  Ndị na-akpagbu m na ndị na-emegide m dị ọtụtụ.+Ma esighị m n’ihe ncheta gị pụọ.+ 158  Ahụwo m ndị na-aghọ aghụghọ,+Akpọrọ m ha asị, n’ihi na ha adịghị edebe okwu gị.+ 159  Lee ka m si hụ iwu gị n’anya.+Jehova, biko, chebe m ndụ dị ka obiọma gị si dị.+ 160  Okwu gị dum bụ eziokwu,+Mkpebi ikpe gị niile ziri ezi na-adịru mgbe ebighị ebi.+ ש [Sin] ma ọ bụ [Shin] 161  Ndị isi akpagbuwo m n’enweghị ihe m mere ha,+Ma obi m na-atụ okwu gị ụjọ.+ 162  Ana m aṅụrị ọṅụ n’ihi okwu gị,+Dị nnọọ ka mmadụ na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ kwatara ihe dị ukwuu n’agha.+ 163  Akpọrọ m okwu ụgha asị,+ ana m asọ ya oyi.+Ahụrụ m iwu gị n’anya.+ 164  Ana m eto gị ugboro asaa n’ụbọchị+N’ihi mkpebi ikpe gị ziri ezi.+ 165  Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu,+Ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.+ 166  Jehova, ana m atụ anya nzọpụta gị,+Ana m emekwa ihe i nyere n’iwu.+ 167  Mkpụrụ obi m na-edebe ihe ncheta gị,+Ahụkwara m ya n’anya nke ukwuu.+ 168  Ana m edebe iwu gị na ihe ncheta gị,+N’ihi na ụzọ m niile dị n’ihu gị.+ ת [Tọọ] 169  Jehova, biko, ka ákwá m na-ebesara gị bịa n’ihu gị.+Mee ka m nwee nghọta dị ka i kwuru.+ 170  Ka arịrịọ m na-arịọ ka i meere m amara bịa n’ihu gị.+Biko, napụta m dị ka i kwuru.+ 171  Ka ọnụ m kwupụta otuto dị ukwuu,+N’ihi na ị na-akụziri m ụkpụrụ gị.+ 172  Ka ire m jiri okwu gị na-abụ abụ,+N’ihi na ihe niile i nyere n’iwu ziri ezi.+ 173  Ka aka gị nyere m aka,+N’ihi na ọ bụ iwu gị ka m họọrọ.+ 174  Jehova, nzọpụta gị na-agụsi m agụụ ike, +Iwu gị na-atọkwa m ụtọ.+ 175  Ka mkpụrụ obi m dịrị ndụ, na-etokwa gị,+Ka mkpebi ikpe gị nyekwara m aka.+ 176  Ana m awagharị dị ka atụrụ furu efu.+ Biko, chọọ ohu gị,+N’ihi na echefughị m ihe i nyere n’iwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”