Abụ Ọma 118:1-29
118 Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma;+N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
2 Ka Izrel kwuo, sị:“N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+
3 Ka ndị ụlọ Erọn kwuo, sị:+“N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+
4 Ka ndị na-atụ egwu Jehova kwuo, sị:+“N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+
5 Anọ m n’ọnọdụ ọjọọ kpọkuo Jaa;+Jaa zara m wee kpọba m n’ebe sara mbara.+
6 Jehova nọnyeere m; agaghị m atụ egwu.+Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?+
7 Jehova nọnyeere m, ya na ndị na-enyere m aka,+Ka m wee na-ele ndị kpọrọ m asị anya, na-achị ha ọchị.+
8 Ọ dị mma ịgbaba n’ime Jehova+Karịa ịtụkwasị mmadụ obi.+
9 Ọ dị mma ịgbaba n’ime Jehova+Karịa ịtụkwasị ndị a ma ama obi.+
10 Mba niile gbara m gburugburu.+Ọ bụ aha Jehova ka m ji na-eguzogide ha.+
11 Ha gbara m gburugburu, ee, ha gbara m gburugburu.+Ọ bụ aha Jehova ka m ji na-eguzogide ha.
12 Ha gbara m gburugburu dị ka aṅụ;+E menyụrụ ha dị ka ọkụ osisi ogwu.+Ọ bụ aha Jehova ka m ji na-eguzogide ha.+
13 Ha kwasiri m aka ike ka m daa,+Ma Jehova nyeere m aka.+
14 Jaa bụ ebe mgbaba m na ike m,+Ọ ghọkwaara m nzọpụta.+
15 Mkpu ọṅụ na mkpu nzọpụta+Na-ada n’ụlọikwuu+ ndị ezi omume.+Aka nri Jehova na-akpa ike.+
16 Aka nri Jehova na-eme onwe ya ka ọ dị elu;+Aka nri Jehova na-akpa ike.+
17 Agaghị m anwụ, kama m ga na-adị ndụ,+Ka m wee kọsaa ọrụ Jaa.+
18 Jaa gbaziri m n’ụzọ siri ike,+Ma o nyefeghị m n’aka ọnwụ.+
19 Megheerenụ m ọnụ ụzọ ámá ezi omume.+M ga-abanye n’ime ya; m ga-eto Jaa.+
20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ámá Jehova.+Ndị ezi omume ga-abanye n’ime ya.+
21 M ga-eto gị, n’ihi na ị zara m,+Ị ghọkwaara m nzọpụta.+
22 Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ+Aghọwo isi nkuku.+
23 Ọ bụ Jehova mere ya;+Ọ dị ebube n’anya anyị.+
24 Nke a bụ ụbọchị Jehova mere;+Anyị ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ na ya.+
25 Biko, Jehova, biko, zọpụta anyị!+Biko, Jehova, biko, mee ka ihe gaziere anyị!+
26 Ka Onye na-abịa n’aha Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi;+Anyị esiwo n’ụlọ Jehova gọzie unu.+
27 Jehova bụ Chineke,+Ọ na-enye anyị ìhè.+Jirinụ alaka osisi+ chọọ ìgwè ndị kwụ n’ahịrị n’oge ememme mma;+Chọọnụ ha mma ruo na mpi ebe ịchụàjà.+
28 Ị bụ Chineke m, m ga-etokwa gị;+Chineke m—m ga-ebuli gị elu.+
29 Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma;+N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+