Abụ Ọma 116:1-19
116 Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ+Olu m na arịrịọ m.+
2 N’ihi na ọ tọworo m ntị n’ala,+M ga-akpọku ya ụbọchị ndụ m niile.+
3 Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu,+Anọ m n’ọnọdụ ọjọọ dị ka à ga-asị na m nọ na Shiol.+M nọ na-enwe ahụhụ na iru uju.+
4 Ma m kpọkuru aha Jehova, sị:+“Biko, Jehova, meere mkpụrụ obi m ụzọ mgbapụ!”+
5 Jehova na-eme amara, bụrụkwa onye ezi omume;+Chineke anyị bụkwa Onye na-eme ebere.+
6 Jehova na-echebe ndị na-amaghị ihe.+Ike gwụrụ m, o wee zọpụta m.+
7 Mkpụrụ obi m, laghachi n’ebe izu ike gị,+N’ihi na Jehova emesowo gị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.+
8 Ị napụtawo mkpụrụ obi m n’ọnwụ,+Napụtakwa anya m n’anya mmiri, napụtakwa ụkwụ m ka ọ ghara ịkpọ n’ihe.+
9 M ga-eje ije+ n’ihu Jehova n’ala ndị dị ndụ.+
10 Ekwuru m okwu+ n’ihi na m nwere okwukwe.+E mekpara m ahụ́ nke ukwuu.
11 Mgbe ụjọ tụwara m, mụ onwe m sịrị:+“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”+
12 Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ+Uru niile ọ na-eme ka m rite?+
13 M ga-eburu iko nke oké nzọpụta,+M ga-akpọkukwa aha Jehova.+
14 M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile.
15 Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọDị oké ọnụ ahịa n’anya ya.+
16 Biko, Jehova,+N’ihi na abụ m ohu gị.+Abụ m ohu gị, nwa ohu gị nwaanyị.+Ị tọpụwo agbụ e kere m.+
17 Ọ bụ gị ka m ga-achụrụ àjà ekele,+Ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpọku.+
18 M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile,+
19 N’ogige ụlọ Jehova,+N’ime gị, Jeruselem.+Toonụ Jaa!+