Abụ Ọma 114:1-8

114  Mgbe Izrel si n’Ijipt pụọ,+Mgbe ụlọ Jekọb sikwa n’etiti ndị na-ekwu ihe a na-adịghị aghọta aghọta pụọ,+   Juda ghọrọ ebe nsọ ya,+Izrel ghọkwara ọmarịcha ala ọ na-achị.+   Oké osimiri hụrụ ya gbaa ọsọ;+Jọdan malitere ịgbaghachi azụ.+   Ugwu ukwu wụliri elu dị ka ebule,+Ugwu nta wụlikwara elu dị ka ụmụ atụrụ.   Oké osimiri, gịnị mere gị, i ji gbaa ọsọ,+Jọdan, gịnị mere gị, i ji malite ịgbaghachi azụ?   Ugwu ukwu, gịnị mere unu, unu ji wụlie elu dị ka ebule;+Ugwu nta, gịnị mere unu, unu ji wụlie elu dị ka ụmụ atụrụ?+   Ụwa, nọrọ n’oké ihe mgbu n’ihi Onyenwe anyị,+N’ihi Chineke Jekọb,   Bụ́ onye na-eme ka oké nkume ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị jupụtara,+Na-emekwa ka oké nkume siri ike ghọọ isi mmiri.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji