Abụ Ọma 112:1-10
112 Toonụ Jaa!+
א [Alef]Obi ụtọ na-adịrị onye na-atụ egwu Jehova,+
ב [Bet]Bụ́ onye ihe o nyere n’iwu+ na-atọ ụtọ nke ukwuu.+
ג [Gimel]
2 Ụmụ ya ga-aghọ ndị ukwu n’ụwa.+
ד [Dalet]A ga-agọzikwa ọgbọ nke ndị ziri ezi.+
ה [Hee]
3 Ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nakwa akụnụba dị n’ụlọ ya;+
ו [Wọọ]Ezi omume ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+
ז [Zayin]
4 O nwuworo ndị ziri ezi dị ka ìhè n’ime ọchịchịrị.+
ח [Het]Ọ na-eme amara, na-emekwa ebere, bụrụkwa onye ezi omume.+
ט [Tet]
5 Onye na-eme amara,+ nke na-agbazinyekwa mmadụ ihe,+ bụ ezigbo mmadụ.
י [Yod]Ọ na-eji ikpe ziri ezi eme ihe ndị ọ na-eme.+
כ [Kaf]
6 Ọ dịghị mgbe a ga-eme ka ọ maa jijiji.+
ל [Lamed]A ga na-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+
מ [Mem]
7 Ọ gaghị atụ akụkọ ọjọọ egwu.+
נ [Nun]Obi ya kwụ chịm,+ daberekwa na Jehova.+
ס [Samek]
8 Obi ya adịghị ama jijiji;+ ọ gaghị atụ egwu,+
ע [Ayin]Ruo mgbe ọ ga na-ele ndị iro ya anya, na-achị ha ọchị.+
פ [Pee]
9 O kesawo ihe n’ụba; o nyewo ndị ogbenye ihe.+
צ [Sadee]Ezi omume ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.+
ק [Kof]A ga-eme ka mpi ya dị elu ma nwee nsọpụrụ.+
ר [Resh]
10 Onye ajọ omume ga-ahụ ya wee iwe.+
ש [Shin]Ọ ga-ata ikikere ezé wee pụọ n’anya.+
ת [Tọọ]Ihe na-agụ ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.+