Abụ Ọma 111:1-10

111  Toonụ Jaa!+ א [Alef]M ga-eji obi m dum too Jehova+ ב [Bet]N’etiti ìgwè ndị na-akpachi anya+ bụ́ ndị ziri ezi nakwa n’ime nzukọ ha.+ ג [Gimel]   Ọrụ Jehova dị ukwuu,+ ד [Dalet]Ndị niile ọ na-atọ ụtọ na-echebara ya echiche.+ ה [Hee]   Ọrụ ya+ dị ebube, maakwa mma,+ ו [Wọọ]Ezi omume ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+ ז [Zayin]   O mewo ihe a ga-eji na-echeta ọrụ ya dị ebube.+ ח [Het]Jehova na-eme amara, na-emekwa ebere.+ ט [Tet]   Ọ na-enye ndị na-atụ egwu ya ihe oriri.+ י [Yod]Ọ ga na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.+ כ [Kaf]   Ọ kọworo ndị ya banyere ike o ji rụọ ọrụ,+ ל [Lamed]Site n’inye ha ihe nketa nke mba dị iche iche.+ מ [Mem]   Eziokwu na ikpe ziri ezi ka e ji mara ọrụ aka ya;+ נ [Nun]Iwu ya niile bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi,+ ס [Samek]   Ọ na-akwụsi ike ruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe niile ebighị ebi,+ ע [Ayin]A na-eji eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ edebe ya.+ פ [Pee]   Ọ gbapụtawo ndị ya.+ צ [Sadee]O nyewo iwu ka ọgbụgba ndụ ya dịruo mgbe ebighị ebi.+ ק [Kof]Aha ya dị nsọ, bụrụkwa ihe a na-atụ egwu.+ ר [Resh] 10  Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe.+ ש [Sin]Ndị niile na-edebe iwu ya nwere ezi nghọta.+ ת [Tọọ]Otuto ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji