Abụ Ọma 11:1-7
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid.
11 Agbabawo m n’ime Jehova.+Olee ihe mere unu ji na-asị mkpụrụ obi m:“Felaanụ n’ugwu unu dị ka nnụnụ!+
2 N’ihi na, lee! ndị ajọ omume na-ekwe ụta,+Ha na-etinye akụ́ ha n’eriri ụta,Ka ha nọrọ n’ọchịchịrị gbaa ya ndị obi ha ziri ezi.+
3 Mgbe e bibiri ntọala,+Gịnị ka onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume ga-eme?”
4 Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+Jehova—n’eluigwe ka ocheeze ya dị.+Anya ya na-ahụ, anya ya nke na-enwu gbaa na-enyocha+ ụmụ mmadụ.
5 Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume,+Mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.+
6 Ọ ga-eme ka ọnyà ma ndị ajọ omume, meekwa ka ọkụ na sọlfọ zokwasị ha dị ka mmiri,+Meekwa ka ifufe nke na-amịkpọ mmadụ bụrụ iko ha ga-aṅụ.+
7 N’ihi na Jehova bụ onye ezi omume;+ ọ hụrụ ezi omume n’anya.+Ọ bụ ndị ziri ezi ga-ahụ ihu ya.+