Abụ Ọma 109:1-31

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ. 109  Chineke, onye m na-eto,+ biko, agbala nkịtị.+   N’ihi na ọnụ onye ajọ omume nakwa ọnụ onye aghụghọ ekwuwo okwu megide m.+Ha ejiriwo ire okwu ụgha kwuo okwu banyere m;+   Ha agbawo m gburugburu na-agwa m okwu ịkpọasị,+Ha na-alụsokwa m ọgụ n’enweghị ihe m mere ha.+   Ha na-eji mmegide akwụ m ụgwọ ịhụnanya m nwere n’ebe ha nọ;+Ma, ọ bụ ekpere ka m na-ekpe.+   Ha na-eji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ ihe ọma,+Jirikwa ịkpọasị na-akwụ m ụgwọ ịhụnanya m nwere n’ebe ha nọ.+   Mee ka onye ajọ omume bụrụ onyeisi ya,Ka onye na-eguzogide ya+ guzorokwa n’aka nri ya.   Mgbe a na-ekpe ya ikpe, ka a ma ya ikpe na ọ bụ onye ajọ omume;Ka ekpere ya ghọọkwa mmehie.+   Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole;+Ka onye ọzọ weghara ọrụ nlekọta ọ na-arụ.+   Ka ụmụ ya ghọọ ụmụ na-enweghị nna,+Ka nwunye ya ghọọkwa nwaanyị di ya nwụrụ.+ 10  Ka ụmụ ya bụrụ ndị na-awagharị awagharị;+Ha ga na-arịọkwa arịrịọ,Ha ga-esikwa n’ebe tọgbọrọ n’efu ha bi na-aga achọgharị ihe oriri.+ 11  Ka onye na-anara ọmụrụ nwa siere ihe niile o nwere ọnyà,+Ka ndị ala ọzọ+ bukọrọ ihe ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ nweta.+ 12  Ka ọ gharakwa inwe onye ga-egosi ya obiọma,*+Ka a gharakwa inwe onye ga-emere ụmụ ya bụ́ ụmụ na-enweghị nna amara. 13  Ka ụmụ ụmụ ya bụrụ ndị a ga-egbu egbu.+Ka e hichapụ aha ha n’ọgbọ na-abịa abịa.+ 14  Ka Jehova cheta njehie nna nna ya hà,+Ka a ghara ihichapụ+ mmehie nne ya.+ 15  Ka ha dịrị n’ihu Jehova mgbe niile;+Ka o kpochapụkwa ihe e ji echeta ha n’ụwa;+ 16  N’ihi na o chetaghị igosi obiọma,+Kama ọ nọ na-achụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye ọsọ,+Na-achụkwa onye ihe na-ewute n’obi, ka o wee gbuo ya.+ 17  Ọ hụkwara nkọcha n’anya,+ o wee bịakwasị ya;+O nweghịkwa mmasị ná ngọzi,+O wee dị anya n’ebe ọ nọ;+ 18  E wee yiwe ya nkọcha dị ka uwe.+O wee bamie ya n’ahụ́ dị ka mmiri,+Bamiekwa ya n’ọkpụkpụ dị ka mmanụ. 19  Ka ọ bụụrụ ya uwe ọ na-eyi n’ahụ́+Nakwa ájị̀ ọ na-eke n’úkwù mgbe niile.+ 20  Nke a bụ ụgwọ Jehova na-akwụ onye na-emegide m +Nakwa ndị na-ekwu okwu ọjọọ megide mkpụrụ obi m.+ 21  Ma, ọ bụ gị bụ Jehova bụ́ Ọkaakaa+ Onyenwe anyị.Meere m amara n’ihi aha gị.+N’ihi na obiọma gị dị mma, napụta m.+ 22  N’ihi na anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye,+A mawaala m obi.+ 23  Aghaghị m ịpụ n’anya dị ka onyinyo mgbede;+E fechapụwo m dị ka igurube. 24  Ibu ọnụ emewo ka ikpere na-ama m jijiji,+Atawokwa m ahụ́, mmanụ adịkwaghị m n’ahụ́.+ 25  Aghọwokwa m onye ha ga na-akọcha.+Ha hụ m, ha amalite ifufe isi.+ 26  Jehova Chineke m, biko, nyere m aka;+Zọpụta m dị ka obiọma gị si dị.+ 27  Ka ha marakwa na nke a bụ aka gị;+Na ọ bụ gị, Jehova, mere ya.+ 28  Ka ha na-akọcha m,+Ma, ka gị onwe gị na-agọzi m.+Ha ebiliwo, ma ka ihere mee ha,+Ka ohu gị ṅụrịakwa ọṅụ.+ 29  Ka ndị na-emegide m yiri mmechuihu dị ka uwe,+Ka ha yirikwa ihere dị ka à ga-asị na ọ bụ uwe elu na-enweghị aka.+ 30  M ga-eji ọnụ m too Jehova nke ukwuu,+M ga-anọkwa n’etiti ọtụtụ ndị too ya.+ 31  N’ihi na ọ ga-eguzo n’aka nri nke ogbenye,+Iji zọpụta ya n’aka ndị na-ekpe mkpụrụ obi ya ikpe.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”