Abụ Ọma 109:1-31
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ.
109 Chineke, onye m na-eto,+ biko, agbala nkịtị.+
2 N’ihi na ọnụ onye ajọ omume nakwa ọnụ onye aghụghọ ekwuwo okwu megide m.+Ha ejiriwo ire okwu ụgha kwuo okwu banyere m;+
3 Ha agbawo m gburugburu na-agwa m okwu ịkpọasị,+Ha na-alụsokwa m ọgụ n’enweghị ihe m mere ha.+
4 Ha na-eji mmegide akwụ m ụgwọ ịhụnanya m nwere n’ebe ha nọ;+Ma, ọ bụ ekpere ka m na-ekpe.+
5 Ha na-eji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ ihe ọma,+Jirikwa ịkpọasị na-akwụ m ụgwọ ịhụnanya m nwere n’ebe ha nọ.+
6 Mee ka onye ajọ omume bụrụ onyeisi ya,Ka onye na-eguzogide ya+ guzorokwa n’aka nri ya.
7 Mgbe a na-ekpe ya ikpe, ka a ma ya ikpe na ọ bụ onye ajọ omume;Ka ekpere ya ghọọkwa mmehie.+
8 Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole;+Ka onye ọzọ weghara ọrụ nlekọta ọ na-arụ.+
9 Ka ụmụ ya ghọọ ụmụ na-enweghị nna,+Ka nwunye ya ghọọkwa nwaanyị di ya nwụrụ.+
10 Ka ụmụ ya bụrụ ndị na-awagharị awagharị;+Ha ga na-arịọkwa arịrịọ,Ha ga-esikwa n’ebe tọgbọrọ n’efu ha bi na-aga achọgharị ihe oriri.+
11 Ka onye na-anara ọmụrụ nwa siere ihe niile o nwere ọnyà,+Ka ndị ala ọzọ+ bukọrọ ihe ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ nweta.+
12 Ka ọ gharakwa inwe onye ga-egosi ya obiọma,*+Ka a gharakwa inwe onye ga-emere ụmụ ya bụ́ ụmụ na-enweghị nna amara.
13 Ka ụmụ ụmụ ya bụrụ ndị a ga-egbu egbu.+Ka e hichapụ aha ha n’ọgbọ na-abịa abịa.+
14 Ka Jehova cheta njehie nna nna ya hà,+Ka a ghara ihichapụ+ mmehie nne ya.+
15 Ka ha dịrị n’ihu Jehova mgbe niile;+Ka o kpochapụkwa ihe e ji echeta ha n’ụwa;+
16 N’ihi na o chetaghị igosi obiọma,+Kama ọ nọ na-achụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye ọsọ,+Na-achụkwa onye ihe na-ewute n’obi, ka o wee gbuo ya.+
17 Ọ hụkwara nkọcha n’anya,+ o wee bịakwasị ya;+O nweghịkwa mmasị ná ngọzi,+O wee dị anya n’ebe ọ nọ;+
18 E wee yiwe ya nkọcha dị ka uwe.+O wee bamie ya n’ahụ́ dị ka mmiri,+Bamiekwa ya n’ọkpụkpụ dị ka mmanụ.
19 Ka ọ bụụrụ ya uwe ọ na-eyi n’ahụ́+Nakwa ájị̀ ọ na-eke n’úkwù mgbe niile.+
20 Nke a bụ ụgwọ Jehova na-akwụ onye na-emegide m +Nakwa ndị na-ekwu okwu ọjọọ megide mkpụrụ obi m.+
21 Ma, ọ bụ gị bụ Jehova bụ́ Ọkaakaa+ Onyenwe anyị.Meere m amara n’ihi aha gị.+N’ihi na obiọma gị dị mma, napụta m.+
22 N’ihi na anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye,+A mawaala m obi.+
23 Aghaghị m ịpụ n’anya dị ka onyinyo mgbede;+E fechapụwo m dị ka igurube.
24 Ibu ọnụ emewo ka ikpere na-ama m jijiji,+Atawokwa m ahụ́, mmanụ adịkwaghị m n’ahụ́.+
25 Aghọwokwa m onye ha ga na-akọcha.+Ha hụ m, ha amalite ifufe isi.+
26 Jehova Chineke m, biko, nyere m aka;+Zọpụta m dị ka obiọma gị si dị.+
27 Ka ha marakwa na nke a bụ aka gị;+Na ọ bụ gị, Jehova, mere ya.+
28 Ka ha na-akọcha m,+Ma, ka gị onwe gị na-agọzi m.+Ha ebiliwo, ma ka ihere mee ha,+Ka ohu gị ṅụrịakwa ọṅụ.+
29 Ka ndị na-emegide m yiri mmechuihu dị ka uwe,+Ka ha yirikwa ihere dị ka à ga-asị na ọ bụ uwe elu na-enweghị aka.+
30 M ga-eji ọnụ m too Jehova nke ukwuu,+M ga-anọkwa n’etiti ọtụtụ ndị too ya.+
31 N’ihi na ọ ga-eguzo n’aka nri nke ogbenye,+Iji zọpụta ya n’aka ndị na-ekpe mkpụrụ obi ya ikpe.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”