Abụ Ọma 108:1-13
Abụ. Abụ olu ụtọ Devid.
108 Obi m kwụ chịm, Chineke.+M ga-abụ abụ, meekwa ka ọ bụrụ abụ olu ụtọ,+Ọbụna ùgwù m ga-abụ abụ.+
2 Ụbọ akwara, teta; tetakwa, gị une.+M ga-akpọte chi ọbụbọ.+
3 Jehova, m ga-eto gị n’etiti ndị dị iche iche;+M ga-abụkukwa gị abụ olu ụtọ n’etiti mba dị iche iche.+
4 N’ihi na obiọma* gị dị ukwuu ruo n’eluigwe,+Eziokwu gị dịkwa ukwuu ruo na mbara igwe.+
5 Chineke, ka e bulie gị ka ị dị elu karịa eluigwe;+Ka ebube gị dị elu karịa ụwa dum.+
6 Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya,+Biko, jiri aka nri gị zọpụta m ma za m.+
7 Chineke ekwuwo okwu n’ịdị nsọ ya, sị:+“M ga-aṅụrị ọṅụ, m ga-enyefe Shikem ka ọ bụrụ ihe nketa;+M ga-atụkwa ndagwurugwu Sọkọt+ atụ̀ wee nye ya ndị ọzọ.
8 Ọ bụ m nwe Gilied;+ ọ bụkwa m nwe Manase;+Ifrem bụkwa ebe e wusiri ike nke onye m mere onyeisi;+Juda bụ mkpara nke onye m mere onye na-achị achị.+
9 Moab+ bụ ite m ji asa ihe.+M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m+ n’Idọm.+M ga-eti mkpu mmeri+ n’isi Filistia.”+
10 Ònye ga-akpọga m n’obodo ahụ e wusiri ike?+Ònye ga-eduru m ruo Idọm?+
11 Ọ́ bụghị gị, Chineke, bụ́ onye jụrụ anyị,+Onye na-adịghịkwa eso ndị agha anyị eje agha dị ka Chineke?+
12 Nyere anyị aka ka anyị pụta n’ahụhụ,+N’ihi na nzọpụta nke si n’aka mmadụ abaghị uru.+
13 Anyị ga-enweta ike site n’enyemaka Chineke,+Ya onwe ya ga-azọdakwa ndị na-emegide anyị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”