Abụ Ọma 107:1-43

(Abụ Ọma 107 ruo 150) 107  Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma;+N’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+   Ka ndị Jehova gbapụtara agbapụta kwuo otú ahụ,+Bụ́ ndị ọ gbapụtara n’aka onye iro,+   Ndị o sikwa n’ala dị iche iche kpọkọta,+Site n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa site n’ebe ọdịda anyanwụ,+Site n’ebe ugwu nakwa site n’ebe ndịda.+   Ha wagharịrị n’ala ịkpa,+ n’ọzara;+Ha ahụghị ụzọ ọ bụla ha ga-esi gaa n’obodo ha ga-ebi.+   Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ;+Ike wee malite ịgwụ mkpụrụ obi ha.+   Ha wee na-etiku Jehova mgbe ha na-ata ahụhụ;+O wee napụta ha n’ihe isi ike ndị ha nọ n’ime ha,+   Meekwa ka ha jee ije n’ezi ụzọ,+Ka ha wee bata n’obodo ha ga-ebi.+   Ka ndị mmadụ kelee Jehova n’ihi obiọma ya+Nakwa n’ihi ọrụ dị ebube ndị ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ.+   N’ihi na o nyewo mkpụrụ obi nke akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ka ọ ṅụọ;+O jiriwokwa ihe ọma nyejuo mkpụrụ obi agụụ na-agụ afọ.+ 10  E nwere ndị bi n’ọchịchịrị nakwa n’oké ọchịchịrị,+Bụ́ ndị mkpọrọ nọ ná mmekpa ahụ́, ndị a tụrụ ịgà.+ 11  N’ihi na ha nupụrụ isi+ n’ihe Chineke kwuru;+Ha leghakwaara ndụmọdụ nke Onye Kasị Elu anya.+ 12  Ya mere, o ji nsogbu bogbuo obi ha;+Ha sụrụ ngọngọ, ọ dịghịkwa onye nyeere ha aka.+ 13  Ha wee malite ịkpọku Jehova maka enyemaka n’oge ha na-ata ahụhụ;+Ọ zọpụtara ha n’ihe isi ike ha nọ na ya dị ka ọ na-eme.+ 14  O wee kpọpụta ha n’ọchịchịrị nakwa n’oké ọchịchịrị,+Wee dọbisịa ọbụna agbụ e kere ha.+ 15  Ka ndị mmadụ kelee Jehova n’ihi obiọma ya+Nakwa n’ihi ọrụ dị ebube ndị ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ.+ 16  N’ihi na o tiwawo ibo ụzọ e ji ọla kọpa rụọ,+Ọ gbajiwokwa ọbụna ígwè e ji atụchi ha.+ 17  Ndị nzuzu akpataworo onwe ha mmekpa ahụ́ n’ikpeazụ+ n’ihi ụzọ mmebi iwu ha+Nakwa n’ihi njehie ha. 18  Mkpụrụ obi ha kpọrọ ụdị nri ọ bụla asị,+Ha na-abịaru nso n’ọnụ ụzọ ámá nke ọnwụ.+ 19  Ha wee malite ịkpọku Jehova maka enyemaka mgbe ha na-ata ahụhụ;+Ọ zọpụtara ha n’ihe isi ike ha nọ na ya dị ka ọ na-eme.+ 20  O wee zipụ okwu ya ma gwọọ ha,+Meekwa ka ha si n’olulu ha dabara n’ime ha pụta.+ 21  Ka ndị mmadụ kelee Jehova n’ihi obiọma ya+Nakwa n’ihi ọrụ dị ebube ndị ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ.+ 22  Ka ha chụọkwa àjà ekele,+Jirikwa mkpu ọṅụ kọsaa ọrụ ya.+ 23  Ndị ji ụgbọ mmiri na-agbada n’oké osimiri,+Ndị na-azụ ahịa ná nnukwu mmiri,+ 24  Ọ bụ ha bụ ndị hụworo ọrụ Jehova+Nakwa ọrụ dị ebube ndị ọ rụrụ n’ogbu mmiri;+ 25  Otú o si kwuo okwu ma mee ka oké ifufe malite ife,+Nke kpaliri ebili mmiri nke oké osimiri.+ 26  Ha na-agbagoru n’eluigwe,Ha na-agbadaru n’ala ala osimiri.Mkpụrụ obi ha na-agbaze n’ihi ọdachi nke na-adakwasị ha.+ 27  Ha na-aṅagharị, na-adagharịkwa dị ka onye ṅụbigara mmanya ókè,+Ọbụna amamihe ha dum bụ ihe efu.+ 28  Ha wee malite itiku Jehova mgbe ha na-ata ahụhụ,+Ọ napụtakwara ha n’ihe isi ike ha nọ na ya.+ 29  Ọ na-eme ka oké ifufe nọrọ jụụ,+Ka ebili mmiri nke oké osimiri wee dajụọ.+ 30  Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ihe ndị a dajụrụ,Ọ na-eduru ha gaa n’ebe mgbaba ha nke gụsiri ha agụụ ike.+ 31  Ka ndị mmadụ kelee Jehova n’ihi obiọma ya+Nakwa n’ihi ọrụ dị ebube ndị ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ.+ 32  Ka ha tookwa ya n’ebe ndị mmadụ gbakọtara;+Ka ha tookwa ya n’etiti ndị okenye zukọrọ ọnụ.+ 33  Ọ na-eme ka osimiri ghọọ ala ịkpa,+Na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ,+ 34  Na-emekwa ka ala nke na-eme nri ghọọ ala nnu,+N’ihi ihe ọjọọ nke ndị bi na ya na-eme. 35  Ọ na-eme ka ala ịkpa ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị jupụtara,+Na-emekwa ka ebe mmiri na-adịghị ghọọ ebe mmiri si asọpụta.+ 36  Ọ na-emekwa ka ndị agụụ na-agụ biri n’ebe ahụ,+Ha ewee wusie obodo ha ga-ebi ike.+ 37  Ha na-akụ mkpụrụ n’ubi, na-akọkwa ubi vaịn,+Ka ha wee mịa mkpụrụ nke ukwuu.+ 38  Ọ na-agọzi ha, ha ewee baa ụba nke ukwuu;+Ọ dịghịkwa ekwe ka anụ ụlọ ha dị ole na ole.+ 39  Ma ha na-adị ole na ole ọzọ, makpurukwa ala+N’ihi mmegbu, ọdachi na iru uju.+ 40  Ọ na-eme ka nlelị zuo ndị a ma ama ahụ́,+Wee mee ka ha na-awagharị n’ebe tọgbọrọ nkịtị, n’ebe ụzọ na-adịghị.+ 41  Ma ọ na-echebe ogbenye ka ọ ghara ịnọ n’ahụhụ,+Meekwa ka o nwee ezinụlọ dị ọtụtụ dị ka ìgwè atụrụ.+ 42  Ndị ziri ezi na-ahụ ihe ndị a wee ṅụrịa ọṅụ;+Ma a ga-emechi ndị ajọ omume niile ọnụ.+ 43  Ònye maara ihe? Ọ ga-ahụ ihe ndị a,+Chebakwara obiọma Jehova echiche.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”