Abụ Ọma 106:1-48
106 Toonụ Jaa!+Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma;+N’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
2 Ònye pụrụ ịkọ oké ọrụ dị iche iche Jehova na-arụ,+Ma ọ bụ mee ka a nụ otuto ya dum?+
3 Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ihe ziri ezi,+Ndị na-eme ezi omume mgbe niile.+
4 Jehova, biko, cheta m meere m amara ị na-emere ndị gị.+Lekọta m, zọpụtakwa m,+
5 Ka m wee hụ ịdị mma gị n’ebe ndị ị họọrọ nọ,+Ka m wee soro mba gị ṅụrịa ọṅụ,+Ka m wee jiri ihe nketa gị nyaa isi.+
6 Anyị emehiewo dị nnọọ ka nna nna anyị hà mehiere;+Anyị emewo ihe ọjọọ; anyị emewo ajọ omume.+
7 Mgbe nna nna anyị hà nọ n’Ijipt,Ha aghọtaghị ọrụ gị ndị dị ebube ma ọlị.+Ha echetaghị oké obiọma gị dị ukwuu,+Kama ha nupụrụ isi n’oké osimiri, n’akụkụ Oké Osimiri Uhie.+
8 O wee zọpụta ha n’ihi aha ya,+Ka o wee mee ka a mara ịdị ike ya.+
9 O wee baara Oké Osimiri Uhie mba, o wee takọọ;+O wee mee ka ha jiri ụkwụ si n’etiti ogbu mmiri ahụ gafere dị ka à ga-asị na ọ bụ ala ịkpa;+
10 O wee zọpụta ha n’aka onye kpọrọ ha asị,+Gbapụtakwa ha n’aka onye iro.+
11 Mmiri wee kpuchie ndị na-emegide ha;+Ọ dịghị otu n’ime ha fọdụrụ.+
12 Ha wee nwee okwukwe n’okwu ya;+Ha malitere iji abụ na-eto ya.+
13 Ha chefuru ọrụ ya ngwa ngwa;+Ha echereghị ndụmọdụ ya.+
14 Kama ha nwere akpịrị ogologo n’ala ịkpa,+Wee lee Chineke ule n’ọzara.+
15 O wee nye ha ihe ha rịọrọ+Wee mee ka mkpụrụ obi ha malite ịrịa ọrịa nke na-ata mmadụ ahụ́.+
16 Ha wee malite inwere Mozis anyaụfụ n’ebe ha mara ụlọikwuu,+Ha nwekwaara Erọn bụ́ onye nsọ Jehova anyaụfụ.+
17 Ala wee meghee loda Detan,+Wee kpuchie ndị òtù Abaịram.+
18 Ọkụ wee na-ere n’etiti nzukọ ha;+Ọkụ wee repịa ndị ajọ omume.+
19 Ha kpụkwara nwa ehi na Horeb,+Kpọkwaara ihe oyiyi a wụrụ awụ isiala,+
20 Ha wee jiri ihe yiri oké ehi,+Bụ́ anụ na-ata ahịhịa, gbanwere ebube m.+
21 Ha chefuru Chineke bụ́ Onye Nzọpụta ha,+Onye mere oké ihe dị iche iche n’Ijipt,+
22 Bụ́ ọrụ dị ebube ndị a rụrụ n’ala Ham,+Meekwa ihe ndị dị egwu n’Oké Osimiri Uhie.+
23 Ọ gaara enye iwu ka a laa ha n’iyi,+Ma a sị na ọ bụghị Mozis bụ́ onye ọ họọrọ,Onye guzoro n’ihu ya n’agbata ha na ya,+Iji mee ka ọnụma ya dajụọ ka o wee ghara ibibi ha.+
24 Ha wee leda ala ahụ mara mma anya;+Ha enweghị okwukwe n’okwu ya.+
25 Ha wee na-atamu ntamu n’ụlọikwuu ha;+Ha egeghị ntị n’olu Jehova.+
26 O wee welie aka ya ṅụọ iyi banyere ha,+Na ya ga-eme ka ha nwụọ n’ala ịkpa,+
27 Nakwa na ya ga-eme ka ụmụ ha nwụọ n’etiti mba dị iche iche,+Nakwa na ya ga-achụsasị ha n’ala dị iche iche.+
28 Ha wee malite ịrapara n’ahụ́ Bel nke Piọ,+Na-erikwa àjà a na-achụrụ ihe ndị na-adịghị ndụ.+
29 Ka ha nọ na-akpasu Chineke iwe site n’omume ha,+Ihe otiti bịakwasịrị ha.+
30 Mgbe Finihas biliri mee ihe,+Ihe otiti ahụ kwụsịrị.
31 E wee gụọrọ ya ihe ahụ o mere dị ka ezi omume,Site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ruo mgbe ebighị ebi.+
32 Ha kpasukwara ya iwe na mmiri Meriba,+Nke mere Mozis ji baa ná nsogbu n’ihi ha.+
33 N’ihi na ha mere ihe wutere ya na mmụọ,O wee jiri egbugbere ọnụ ya kwuo okwu n’echeghị echiche.+
34 Ha alaghị ndị dị iche iche n’iyi,+Dị ka Jehova gwara ha.+
35 Ha na ndị mba ọzọ wee na-emekọ ihe,+Ha wee mụta ihe ha na-eme.+
36 Ha nọkwa na-efe arụsị ha,+Arụsị ndị ahụ ewee ghọọrọ ha ọnyà.+
37 Ha jikwa ụmụ ha ndị ikom+Na ụmụ ha ndị inyom na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà.+
38 Ha wee na-awụfu ọbara na-emeghị ihe ọjọọ,+Bụ́ ọbara ụmụ ha ndị ikom na ọbara ụmụ ha ndị inyom,Ndị ha chụụrụ arụsị dị iche iche nke Kenan n’àjà;+E wee jiri ịwụfu ọbara merụọ ala ahụ.+
39 Ọrụ ha wee mee ka ha ghọọ ndị na-adịghị ọcha,+Ha nọkwa na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ site n’ihe ha na-eme.+
40 Jehova wee weso ndị ya iwe dị ọkụ,+O wee kpọ ihe nketa ya asị.+
41 O wee nyefee ha ugboro ugboro n’aka ndị mba ọzọ,+Ka ndị kpọrọ ha asị chịa ha,+
42 Ka ndị iro ha megbuokwa ha,Ka ha nọrọkwa n’okpuru ndị iro ha.+
43 Ọ napụtara ha ọtụtụ ugboro,+Ma ha onwe ha nupụrụ isi n’ihi isi ike ha,+E wedara ha n’ala n’ihi njehie ha.+
44 Ọ na-ahụkwa ahụhụ ha na-ata+Mgbe ọ nụrụ ákwá ha na-ebesara ya.+
45 N’ihi ha, ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya,+Ọ na-agbanwe obi ya dị ka oké obiọma ya si dị ukwuu.+
46 Ọ na-emekwa ka ha bụrụ ndị e kwesịrị imere ebereN’anya ndị niile dọọrọ ha n’agha.+
47 Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị,+Sikwa ná mba dị iche iche chịkọta anyị,+Ka anyị wee nye aha nsọ gị ekele,+Jirikwa ọṅụ too gị.+
48 Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi+Malite na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi;Mmadụ niile ga-asịkwa Amen.+Toonụ Jaa!+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”