Abụ Ọma 105:1-45
105 Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha ya,+Meenụ ka a mara ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche.+
2 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ olu ụtọ,+Chebaranụ ọrụ ya niile dị ebube echiche.+
3 Jirinụ aha nsọ ya na-anya isi.+Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+
4 Chọọnụ Jehova na ike ya.+Na-achọnụ ihu ya mgbe niile.+
5 Chetanụ ọrụ dị ebube ndị ọ rụrụ,+Bụ́ ọrụ ebube ya nakwa mkpebi ikpe ndị o ji ọnụ ya kwupụta,+
6 Unu mkpụrụ Ebreham bụ́ ohu ya,+Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+
7 Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+Mkpebi ikpe ya dị n’ụwa dum.+
8 O chetawo ọgbụgba ndụ ya ọbụna ruo mgbe a na-akaghị aka,+O chetawokwa ihe o nyere n’iwu, ruo otu puku ọgbọ,+
9 Bụ́ ọgbụgba ndụ ya na Ebreham,+Nakwa iyi ọ ṅụụrụ Aịzik,+
10 Bụ́ nke o mere ka ọ dịgide dị ka ụkpụrụ nye Jekọb,Ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịru mgbe a na-akaghị aka nye Izrel,+
11 Sị: “Ọ bụ gị ka m ga-enye ala Kenan+Ka ọ bụrụ òkè e kenyere unu dị ka ihe nketa.”+
12 Nke a bụ mgbe ha dị ole na ole,+Ee, ha dị nnọọ ole na ole, bụrụkwa ndị mbịarambịa na ya.+
13 Ha wee na-aga site ná mba ruo ná mba,+Site n’otu alaeze gakwuru ndị obodo ọzọ.+
14 O kweghị ka mmadụ ọ bụla rigbuo ha,+Kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha,+
15 Sị: “Unu akpala ndị m tere mmanụ aka,+Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.”+
16 O wee kwuo ka ụnwụ daa n’ala ahụ;+Ọ gbajiri mkpara niile e ji ekonye achịcha.+
17 O zipụrụ otu nwoke ka o buru ha ụzọ gawa,Ya bụ, Josef, onye e rere ka ọ bụrụ ohu.+
18 Ha tụrụ ya ịgà n’ụkwụ,+Keekwa mkpụrụ obi ya agbụ ígwè;+
19 Ruo mgbe okwu Chineke mezuru,+Okwu Jehova nụchara ya.+
20 Eze ziri ozi ka a tọhapụ ya,+Onye na-achị ndị dị iche iche ziri ozi ka a tọhapụ ya.
21 O mere ya nna ukwu nke ezinụlọ ya,+Na onye na-achị ihe niile o nwere,+
22 Ka o kee ndị o mere ndị isi agbụ, bụ́ ndị ọ masịrị mkpụrụ obi ya ike agbụ,+Ka ọ kụziekwara ọbụna ndị agadi ya amamihe.+
23 Izrel wee bata n’Ijipt,+Jekọb wee biri dị ka ọbịa n’ala Ham.+
24 O wee mee ka ndị ya mụọ ọmụmụ nke ukwuu,+O wee mee ka ha dị ike karịa ndị iro ha.+
25 O kwere ka obi ha gbanwee, ha wee kpọ ndị ya asị,+Ka ha jiri aghụghọ meso ndị ohu ya ihe.+
26 O zigara Mozis bụ́ ohu ya,+Zigakwa Erọn bụ́ onye ọ họọrọ.+
27 Ha mere ka ha hụ ihe ịrịba ama ya,+Rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’ala Ham.+
28 O zipụrụ ọchịchịrị wee mee ka ebe niile gbaa ọchịchịrị;+Ha enupụghịkwa isi n’okwu ya.+
29 O mere ka mmiri ha ghọọ ọbara,+O wee gbuo azụ̀ ha.+
30 Ala ha jupụtara na mbàrá,+N’ime ime ụlọ nke ndị eze ha.
31 O kwuru ka odudu bata,+Kwuokwa ka anwụnta bata n’ókèala ha niile.+
32 Kama mmiri ozuzo, o mere ka akụ́ mmiri ígwé+Na ọkụ na-ere ere zoo n’ala ha.+
33 O wee tie osisi vaịn ha na osisi fig ha ihe otiti,Gbajisịakwa osisi ndị dị n’ókèala ha.+
34 O kwuru ka igurube bata,+Nakwa ụmụ igurube a na-apụghị ịgụta ọnụ.+
35 Ha wee richapụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ha;+Ha richapụkwara mkpụrụ niile nke ala ha.
36 O wee gbuo ihe ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala ha,+Mmalite nke ike ịmụ ọmụmụ ha.+
37 O wee mee ka ha jiri ọlaọcha na ọlaedo pụta;+Ọ dịghịkwa onye ụkwụ mara jijiji n’ebo ya niile.
38 Ijipt ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha pụrụ,N’ihi na ụjọ ha ejidewo ha.+
39 Ọ gbasapụrụ ígwé ojii ka o kpuchie ha,+Nyekwa ha ọkụ ka ọ na-enye ha ìhè n’abalị.+
40 Ha rịọrọ ya, o wee wetara ha nnụnụ kwel,+O jikwa achịcha nke si n’eluigwe nyejuo ha afọ.+
41 O meghere oké nkume, mmiri wee malite ịgbapụta;+Mmiri a ghọrọ osimiri wee sọfere ógbè mmiri na-adịghị.+
42 N’ihi na o chetara okwu ya dị nsọ nke ọ gwara Ebreham bụ́ ohu ya.+
43 O wee mee ka ndị ya jiri ọṅụ pụta,+Meekwa ka ndị ọ họọrọ tiri mkpu ọṅụ pụta.+
44 O wee nye ha ala ndị mba ọzọ,+Ha wee na-ewere ihe mba dị iche iche rụsiri ọrụ ike nweta,+
45 Ka ha wee debe ụkpụrụ ya,+Debekwa iwu ya.+Toonụ Jaa!+