Abụ Ọma 104:1-35
104 Mkpụrụ obi m, gọzie Jehova.+Jehova Chineke m, ị dị nnọọ ukwuu.+I yiriwo ebube na ịma mma dị ka uwe,+
2 I jikwa ìhè kpuchie onwe gị dị ka ákwà,+I setịkwara eluigwe dị ka ákwà ụlọikwuu,+
3 Onye wukwasịrị ọnụ ụlọ ya nke dị n’elu n’ogidi e gwunyere na mmiri,+Onye ji ígwé ojii mere ụgbọ ịnyịnya,+Onye na-eje ije n’elu nku ifufe,+
4 Onye mere ka ndị mmụọ ozi ya bụrụ mmụọ,+Meekwa ka ndị na-ejere ya ozi bụrụ ọkụ na-erepịa ihe.+
5 Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike;+Ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+
6 I ji ogbu mmiri kpuchie ya dị ka ákwà.+Mmiri tochiri ugwu niile.+
7 Ị bara mba, o wee gbalaga;+Ọ nụrụ ụda égbè eluigwe gị, o wee jiri ụjọ gbaa ọsọ—
8 Gbaga n’ebe ị tọọrọ ya ntọala.Ugwu wee nulite,+Ndagwurugwu* wee gbadaa.
9 Ị kpaara ya ókè, bụ́ ebe ọ na-agaghị agabiga,+Ka o wee ghara itochi ụwa ọzọ.+
10 Ị na-eme ka isi iyi niile na-asọba na ndagwurugwu dị iche iche;+Ha na-asọ n’agbata ugwu.
11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ha na-aṅụ mgbe niile;+Ịnyịnya ọhịa+ na-aṅụ ya mgbe niile ka akpịrị kwụsị ịkpọ ha nkụ.
12 Anụ ufe nke eluigwe na-akpa akwụ́ ha n’elu ha;+Ha na-anọ n’alaka osisi nke akwụkwọ jupụtara na-ebe ubé.+
13 Ị na-esi n’ọnụ ụlọ gị dị elu agba ugwu mmiri.+Ihe ị rụpụtara na-eme ka afọ ju ụwa.+
14 Ị na-eme ka ahịhịa ndụ puoro anụmanụ,+Meekwa ka ihe ọkụkụ puo bụ́ nke ga-abara ụmụ mmadụ uru,+Ka e wee si n’ala nweta ihe oriri,+
15 Na mmanya nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ,+Iji mee ka ihu mmadụ na-egbu maramara n’ihi mmanụ,+Nakwa nri nke na-enye obi mmadụ ume.+
16 Afọ na-eju osisi Jehova kụrụ,Bụ́ osisi sida nke Lebanọn ndị ọ kụrụ,+
17 Ebe nnụnụ na-akpa akwụ́.+Ọ bụ osisi junipa bụ ụlọ ụgbala.+
18 Ugwu ndị dị elu+ bụ ebe ewu ọhịa na-anọ;+Nkume dị elu bụ ebe ewi nkume na-agbaba.+
19 O mere ọnwa ka e jiri ya na-amata oge a kara aka;+Anyanwụ maara nke ọma ebe ọ na-ada.+
20 Ị na-eme ka ọchịchịrị gbaa, ka o wee bụrụ abalị;+Ọ bụ mgbe ahụ ka anụ ọhịa niile bi n’oké ọhịa na-akpagharị.
21 Ụmụ ọdụm tojuru etoju na-ebigbọ ka ha nweta anụ oriri,+Ka ha chọtakwa ihe oriri ha n’aka Chineke.+
22 Anyanwụ malite ịcha+—ha na-alaghachi,Ha na-aga makpuru n’ebe ha na-ezo.
23 Mmadụ na-apụ gawa ọrụ ya,+Gaa rụwa ọrụ ya ruo anyasị.+
24 Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ!+I ji amamihe rụọ ha niile.+Ụwa jupụtara n’ihe ị rụrụ.+
25 Oké osimiri nke buru ibu ma saa mbara,+Ihe na-agagharị agagharị, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, nọ n’ime ya,+Bụ́ ihe e kere eke dị ndụ, ma ndị nta ma ndị ukwu.+
26 Ụgbọ mmiri na-aga na ya;+I kere Levayatan+ ka ọ na-egwuri egwu n’ime ya.+
27 Ha niile nwere nchekwube n’ebe ị nọ+Ka i nye ha ihe oriri ha n’oge ya.+
28 Ihe i nyere ha ka ha na-ewere.+Ị saghee aka gị—ihe ọma na-eju ha afọ.+
29 Ọ bụrụ na i wepụ ihu gị, ha na-ama jijiji.+Ọ bụrụ na i wepụ mmụọ ha, ha na-ekubi ume,+Ha na-alaghachikwa n’ájá ha si pụta.+
30 Ọ bụrụ na i zipụ mmụọ gị, a na-eke ha;+Ị na-emekwa ka ihu ala dị ọhụrụ.
31 Ebube Jehova ga-adịru mgbe ebighị ebi.+Jehova ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ọrụ ya.+
32 O lee ụwa anya, ụwa amaa jijiji;+O metụ ugwu aka, ha akwụọ anwụrụ.+
33 M ga-abụku Chineke m abụ n’oge niile m dị ndụ;+M ga-abụku Jehova abụ olu ụtọ n’oge ndụ m niile.+
34 Ka ihe m na-atụgharị n’uche banyere ya na-atọ ya ụtọ.+Mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.+
35 A ga-ekpochapụ ndị mmehie n’ụwa;+Ndị ajọ omume agaghị adịkwa.+Mkpụrụ obi m, gọzie Jehova. Toonụ Jaa!+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”