Abụ Ọma 103:1-22

Abụ ọma Devid. 103  Mkpụrụ obi m, gọzie Jehova,+Ihe niile nke dị n’ime m, gọzienụ aha nsọ ya.+   Mkpụrụ obi m, gọzie Jehova,Echefukwala ihe niile o mere,+   Onye na-agbaghara gị njehie gị dum,+Onye na-agwọ gị ọrịa gị niile,+   Onye napụtara ndụ gị n’olulu,+Onye kpuwere gị obiọma* na ebere dị ka okpueze,+   Onye na-eme ka oge ndụ gị niile jupụta n’ihe ọma;+Oge ntorobịa gị na-adịkwa ọhụrụ dị ka nke ugo.+   Jehova na-arụ ọrụ ezi omume,+Na-ekpechitekwara ndị niile a na-erigbu erigbu ikpe.+   O mere ka Mozis mara ụzọ ya,+Meekwa ka ụmụ Izrel mara ihe ọ na-eme.+   Jehova dị ebere, na-emekwa amara,+Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, o nwere obiọma dị ukwuu.+   Ọ gaghị na-ahụta mmejọ mgbe niile,+Ọ gaghịkwa anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.+ 10  Ọ dịghị emeso anyị dị ka mmehie anyị si dị;+Ọ dịghịkwa enye anyị ntaramahụhụ dị ka njehie anyị si dị.+ 11  N’ihi na dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa,+Otú ahụ ka obiọma o nwere n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ si dị elu.+ 12  Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ,+Otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.+ 13  Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere+Dị ka nna si emere ụmụ ya ebere.+ 14  N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị,+Ọ na-echeta na anyị bụ ájá.+ 15  Ma ụbọchị ndụ nke mmadụ efu yiri nke ahịhịa ndụ;+Ọ na-awa okooko dị ka okooko osisi dị n’ọhịa.+ 16  N’ihi na ifufe efu fesa ya, ya akpọnwụọ;+Ebe ọ dị agakwaghị amata ya.+ 17  Ma obiọma Jehova na-adị site na mgbe ebighị ebi ọbụna ruo mgbe ebighị ebi+N’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ,+Ezi omume ya na-adịkwara ụmụ ụmụ ha,+ 18  N’ebe ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ya nọ,+Nakwa n’ebe ndị na-echeta iwu ya iji debe ya nọ.+ 19  Jehova emewo ka ocheeze ya guzosie ike n’eluigwe;+Alaeze ya na-achịkwa ihe niile.+ 20  Gọzienụ Jehova, unu ndị mmụọ ozi+ ya, ndị dị ike nke ukwuu, ndị na-eme ihe o kwuru,+Site n’irube isi n’iwu ya.+ 21  Gọzienụ Jehova, unu ụsụụ ndị agha ya niile,+Unu ndị ozi ya, ndị na-eme uche ya.+ 22  Gọzienụ Jehova, unu ọrụ ya niile,+N’ebe niile ọ na-achị.+Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”