Abụ Ọma 102:1-28
Ekpere onye nọ n’ahụhụ na-ekpe ma ike gwụ ya, o wee wụpụ nchegbu ya dị ka mmiri n’ihu Jehova.+
102 Jehova, biko, nụrụ ekpere m;+N ụ r ụ k w a ákwá enyemaka m na-akwa.+
2 Ewepụla ihu gị n’ebe m nọ n’ụbọchị m nọ n’oké ihe isi ike.+Tọọrọ m ntị n’ala;+N’ụbọchị m kpọkuru gị, mee ngwa za m.+
3 N’ihi na ụbọchị ndụ m agwụwo dị ka anwụrụ ọkụ si ekusasị,+Ọkpụkpụ m dịkwa ọkụ dị nnọọ ka ekwú ọkụ.+
4 Obi m akpọnwụwo dị ka ahịhịa anwụ chagburu,+N’ihi na echefuwo m iri nri m.+
5 N’ihi ụda nke ịsụ ude m,+Abụzi m ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+
6 Eyiri m okwolo nke nọ n’ala ịkpa.+Adịzi m ka obere ikwiikwii nke nọ n’ebe tọgbọrọ n’efu.
7 Atawo m ahụ́,Adịzi m ka nnụnụ nke naanị ya nọ n’elu ụlọ.+
8 Ndị iro m akọchawo m ogologo ụbọchị dum.+Ndị na-eme m akaje ejiriwo aha m na-akpọ iyi.+
9 N’ihi na arachawo m ntụ dị ka à ga-asị na ọ bụ nri;+Anya mmiri m na-abanye n’ihe m na-aṅụ,+
10 N’ihi amamikpe gị na iwe gị;+N’ihi na i buliwo m elu wee tụfuo m.+
11 Ụbọchị m dị ka onyinyo mgbede,+Mụ onwe m akpọnwụwokwa dị ka ahịhịa efu.+
12 Jehova, gị onwe gị na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,+Ihe ncheta gị ga-adịkwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
13 Gị onwe gị ga-ebili meere Zayọn ebere,+N’ihi na ọ bụ oge imere ya amara,N’ihi na oge a kara aka eruwo.+
14 N’ihi na ihe banyere nkume ya na-eme ndị ohu gị obi ụtọ,+Ha nwekwara mmasị n’ájá ya.+
15 Mba dị iche iche ga-atụkwa egwu aha Jehova,+Ndị eze niile nke ụwa ga-atụkwa egwu ebube gị.+
16 N’ihi na Jehova ga-ewu Zayọn;+Ọ ga-apụta n’ebube ya.+
17 Ọ ga-eche ntị nụrụ ekpere nke ndị a napụrụ ihe niile,+Ọ gaghịkwa eleghara ekpere ha anya.+
18 E dere ihe a maka ọgbọ na-abịa abịa;+Ndị a ga-eke n’ọdịnihu ga-etokwa Jaa.+
19 N’ihi na o siwo n’ebe nsọ ya dị elu ledata anya,+Jehova esiwo n’eluigwe lee anya n’ụwa,+
20 Iji nụrụ ịsụ ude onye mkpọrọ,+Iji tọhapụ ndị a mara ikpe ọnwụ;+
21 Ka e wee kọsaa aha Jehova n’ime Zayọn,+Kọsaakwa otuto ya n’ime Jeruselem,+
22 Mgbe ndị dị iche iche gbakọtara,+Mgbe alaeze dị iche iche gbakọtakwara ijere Jehova ozi.+
23 O mere ka ike gwụ m n’etiti ụzọ,+O mere ka ụbọchị ndụ m dị mkpụmkpụ.+
24 M wee sị: “Chineke m,Biko, ewepụla ndụ m mgbe m ka bụ okorobịa;+Ị na-adị ndụ ruo ọgbọ niile.+
25 Ị tọrọ ntọala ụwa ogologo oge gara aga,+Eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.+
26 Ha onwe ha ga-ala n’iyi, ma gị onwe gị ga na-adị ndụ;+Ha niile ga-akakwa nká dị ka uwe.+Ị ga-agbanwe ha dị ka ákwà, oge ha ga-agwụkwa.+
27 Ma ị ka bụ onye ị bụ, afọ ndụ gị agaghịkwa agwụ agwụ.+
28 Ụmụ ndị ohu gị ga na-ebi n’ebe ha bi;+Ụmụ ha ga-anọsikwa ike n’ihu gị.”+