Abụ Ọma 100:1-5

Abụ olu ụtọ e ji enye ekele.+ 100  Tikuonụ Jehova mkpu mmeri, unu ndị niile bi n’ụwa.+   Jirinụ ọṅụ jeere Jehova ozi.+Jirinụ mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.+   Maranụ na Jehova bụ Chineke.+Ọ bụ ya kere anyị, ọ bụghị anyị kere onwe anyị.+Anyị bụ ndị ya, bụrụkwa atụrụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya.+   Jirinụ ekele bata n’ọnụ ụzọ ámá ya,+Jirikwanụ otuto bata n’ogige ya.+Keleenụ ya, gọzienụ aha ya.+   N’ihi na Jehova dị mma;+Obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi,+Ikwesị ntụkwasị obi ya na-adịkwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”