Abụ Ọma 10:1-18
ל [Lamed]
10 Jehova, gịnị mere i ji guzoro n’ebe dị anya?+Gịnị mere i ji zoo onwe gị n’oge m nọ n’ahụhụ?+
2 Onye ajọ omume na-eji mpako achụ onye nọ n’ahụhụ ajọ ọsọ;+Ndị ajọ omume na-ejikwa ihe ha chepụtara anwụde ndị nọ n’ahụhụ.+
3 N’ihi na onye ajọ omume etowo onwe ya n’ihi ọchịchọ onwe onye nke mkpụrụ obi ya,+Onye na-erite uru na-ezighị ezi+ agọziwokwa onwe ya;נ [Nun]O lelịwo Jehova.+
4 Onye ajọ omume adịghị eme nchọpụta n’ihi mpako ya;+Echiche ya niile bụ: “Chineke adịghị.”+
5 Ihe na-agaziri ya mgbe niile.+Ọ pụghị ịghọta mkpebi ikpe gị;+Ọ na-eleda ndị niile na-ebuso ya iro anya.+
6 O kwuwo n’obi ya, sị: “A gaghị eme ka m maa jijiji;+Ọdachi agaghị adakwasị m site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.”+
פ [Pee]
7 Ọnụ ya jupụtara n’ịṅụ iyi na aghụghọ na mmegbu.+Nsogbu na ihe ọjọọ dị n’okpuru ire ya.+
8 Ọ na-anọ n’akụkụ obodo nta dị iche iche chechie ndị mmadụ;Ọ ga-esi n’ebe zoro ezo gbuo onye aka ya dị ọcha.+
ע [Ayin]Ọ na-ele anya inweta onye ga-enwe ihe ndabara ọjọọ.+
9 Ọ na-ezo n’ebe zoro ezo dị ka ọdụm nke nọ n’ọgba ya.+Ọ na-ezo+ iji dọkpụrụ onye nọ n’ahụhụ.Mgbe ọ dọọrọ ụgbụ ya, ọ na-adọkpụrụ onye nọ n’ahụhụ.+
10 A na-echi ya ọnụ n’ala, o wee daa,Ìgwè ndị nọ ná mwute ga-adaba n’aka ya siri ike.+
11 Ọ sịwo n’obi ya:+ “Chineke echefuola.+O wepụwo ihu ya.+Ọ dịghị mgbe ọ ga-ahụ ya.”+
ק [Kof]
12 Jehova, biko, bilie.+ Chineke, welie aka gị.+Echefula ndị nọ n’ahụhụ.+
13 Gịnị mere onye ajọ omume ji lelịa Chineke?+Ọ sịwo n’obi ya: “Ị gaghị eme ka a zaa ajụjụ.”+
ר [Resh]
14 N’ihi na gị onwe gị ahụwo nsogbu na iru uju.Ị nọ na-ele anya, ka i wee lebara ihe ndị a anya.+Ọ bụ gị ka onye ihe ọjọọ dabaara,+ bụ́ nwa na-enweghị nna, na-enyefe onwe ya.Gị onwe gị bụ onye na-enyere ya aka.+
ש [Shin]
15 Gbajie ogwe aka nke onye ajọ omume na onye ọjọọ.+Chọọ ajọ omume ya ruo mgbe ọ na-adịkwaghị nke ị ga-ahụ.+
16 Jehova bụ Eze ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+Mba dị iche iche alawo n’iyi n’elu ala ya.+
ת [Tọọ]
17 Jehova, biko, nụrụ arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ gị.+Dozie obi ha.+Jiri ntị gị nụrụ,+
18 Ka i wee kpee nwa na-enweghị nna na onye e gburu mmụọ ya ikpe,+Ka mmadụ efu nke nọ n’ụwa wee ghara ime ka a maa jijiji ọzọ.+