Abụ Ọma 1:1-6
1 Obi ụtọ na-adịrị+ onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume,+Onye na-adịghịkwa eso ụzọ ndị mmehie,+Onye na-adịghịkwa anọ n’etiti ndị na-akwa emo.+
2 Kama iwu Jehova na-atọ ya ụtọ,+Ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị.+
3 Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,+Nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya,+Akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ,+Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.+
4 Ndị ajọ omume adịghị otú ahụ,Kama ha dị ka igbogbo ọka nke ifufe na-efesasị.+
5 Ọ bụ ya mere na ndị ajọ omume agaghị eguzo n’ikpe,+Ndị mmehie agaghịkwa eguzo ná nzukọ ndị ezi omume.+
6 N’ihi na Jehova maara ụzọ ndị ezi omume,+Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.+