Aịzaya 46:1-13
46 Bel+ ehulatawo,+ Nibo huuru ehuru; arụsị ha+ aghọọla ibu anụ ọhịa na anụ ụlọ ga na-ebu. Ibu ha, bụ́ ngwongwo ha, aghọọla ibu arọ nke anụmanụ ike gwụrụ ga na-ebu.
2 Ha ga-ehuru ehuru; ha niile ga-ehulata; ha enweghị ike ịnapụta+ ibu ndị a, kama a ga-adọrọ mkpụrụ obi ha n’agha.+
3 “Geenụ m ntị, gị ụlọ Jekọb na unu niile ndị fọdụrụ n’ụlọ Izrel,+ ndị m buru malite mgbe unu nọ n’afọ, ndị m buru malite mgbe unu nọ n’akpa nwa.+
4 Ruo mgbe mmadụ mere agadi, abụ m otu Onye ahụ;+ ruokwa mgbe mmadụ nwere isi awọ́, mụ onwe m ga na-ebu ya.+ Mụ onwe m ga-eme ihe,+ ka mụ onwe m wee na-eku ya, na-ebu ya, meekwara ya ụzọ mgbapụ.+
5 “Ònye ka unu ga-eji m tụnyere+ ma ọ bụ mee ka mụ na ya hara ma ọ bụ sị na m dị ka ya ka mụ na ya wee yie?+
6 E nwere ndị na-awụfusị ọlaedo dị n’akpa, ndị na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ọlaọcha. Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, o wee jiri ya kpụọ chi.+ Ha na-adara ya n’ala, ee, ha na-akpọrọ ya isiala.+
7 Ha na-ebu ya n’ubu ha,+ ha na-eburu ya debe ka o guzoro n’ebe ọ ga-adị. Ọ naghị esi n’ebe o guzo apụ.+ Mmadụ na-etikukwa ya, ma ọ dịghị aza; ọ naghịkwa azọpụta onye ahụ n’ahụhụ ya.+
8 “Chetanụ ihe a, ka unu wee nwee obi ike. Tinyenụ ya n’obi,+ unu ndị na-emebi iwu.+
9 Chetanụ ihe mbụ ndị mere n’oge dị anya gara aga,+ na abụ m Chineke,+ ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ,+ ọ dịghịkwa onye dị ka m;+
10 Onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ,+ onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.+ Onye na-asị, ‘Ihe m kpebiri ga-adịgide,+ ọ bụkwa ihe niile dị m ụtọ ka m ga-eme’;+
11 Onye ga-akpọ nnụnụ na-eri anụ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa,+ kpọọkwa onye ga-emezu ihe m kpebiri ka o si n’ala dị anya bịa.+ Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo.+ Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.+
12 “Geenụ m ntị, unu ndị obi ha kpọchiri akpọchi,+ unu ndị nọ ezi omume n’ebe dị anya.+
13 Ewetawo m ezi omume m nso.+ Ọ dịghị n’ebe dị anya,+ nzọpụta m agaghịkwa abịa mgbe oge gafeworo.+ M ga-eme ka e nwee nzọpụta na Zayọn, meekwa ka Izrel nweta ịma mma m.”+