Aịzaya 1:1-31
1 Ọhụụ+ Aịzaya+ nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jeruselem n’ụbọchị Ọzaya,+ Jotam,+ Ehaz+ na Hezekaya,+ bụ́ ndị eze Juda:+
2 Eluigwe, nụrụ,+ ụwa, ṅaakwa ntị, n’ihi na Jehova ekwuwo, sị: “Azụlitewo m ụmụ, lekọtakwa ha,+ ma ha enupụworo m isi.+
3 Ehi maara onye zụtara ya, ịnyịnya ibu makwaara ihe onye nwe ya ji etinyere ya nri; Izrel amaghị m,+ ndị m adịghị eji nghọta eme ihe.”+
4 Ahụhụ ga-adịrị mba nke na-eme mmehie,+ ndị njehie na-anyịgbu, mkpụrụ nke na-eme ihe ọjọọ,+ ụmụ na-eweta mbibi!+ Ha ahapụwo Jehova,+ ha elelịwokwa Onye Nsọ Izrel,+ ha alaghachiwo azụ.+
5 Olee ebe fọrọ a ga-etikwu unu ihe,+ ebe ọ bụ na unu ka na-enupụ isi?+ Isi dum na-arịa ọrịa, obi dum dakwara mbà.+
6 Malite n’ọbụ ụkwụ ruo n’isi, ọ dịghị ebe fọrọnụ.+ Ọnyá na nchihịa ahụ́ na ọnyá ọhụrụ, a pịghị ha apị, e kechighị ha ekechi, e teghịkwa ha mmanụ iji mee ka ha dị nro.+
7 Ala unu bụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ a gbawo obodo unu niile ọkụ;+ ndị ala ọzọ+ eripịawo+ ala unu n’anya unu, ọ tọgbọrọ n’efu dị ka obodo ndị ala ọzọ kwaturu.+
8 A hapụwo ada bụ́ Zayọn+ ka ọ nọrọ dị ka ụlọ ndò nke dị n’ubi vaịn, dị ka ụlọ nche nke dị n’ubi kukumba, dị ka obodo a nọchibidoro anọchibido.+
9 E wezụga na Jehova nke ụsụụ ndị agha mere ka mmadụ ole na ole ndị lanahụrụ alanahụ fọdụrụ anyị,+ anyị gaara adị nnọọ ka Sọdọm, anyị gaara eyi Gọmọra.+
10 Nụrụnụ okwu Jehova,+ unu ndị ọchịchị dị ike+ nke Sọdọm.+ Ṅaanụ ntị n’iwu Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.
11 “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?” ka Jehova kwuru. “Àjà ebule+ a na-esurecha n’ọkụ+ nakwa abụba nke anụ mara abụba+ agbụla m; ọbara+ nwa oké ehi na nke nwa ebule na nke mkpi+ adịghịkwa atọ m ụtọ.+
12 Mgbe unu na-abata ịhụ ihu m,+ ọ̀ bụ onye chọrọ nke a n’aka unu, ịzọtọ ogige m?+
13 Kwụsịnụ iwebata àjà ọka* na-abaghị uru.+ Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ unu bụ ihe arụ n’anya m.+ Ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ na ụbọchị izu ike unu,+ ịkpọ òkù ka e nwee mgbakọ,+ apụghị m ịnabata ime anwansi+ nakwa nzukọ ukwu.
14 Mkpụrụ obi m kpọrọ ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ unu na oge ememme unu asị.+ Ha aghọworo m ibu arọ;+ ike ibu ha agwụwo m.+
15 Mgbe unu gbasara ọbụ aka unu,+ m na-ewepụ anya m n’ebe unu nọ.+ Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere,+ adịghị m ege ntị;+ aka unu jupụtara n’ọbara.+
16 Saanụ ahụ́;+ meenụ onwe unu ka unu dị ọcha;+ wepụnụ omume ọjọọ unu n’ihu m;+ kwụsịnụ ime ihe ọjọọ.+
17 Mụtanụ ime ihe ọma;+ chọọnụ ikpe ziri ezi;+ gbazienụ onye mmegbu;+ kpeenụ nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi;+ kpechitenụ ọnụ nwaanyị di ya nwụrụ.”+
18 “Bịanụ ka anyị kpezie,” ka Jehova kwuru.+ “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha;+ ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara dị ka ákwà uhie, ọ ga-adị ka ajị ọcha.
19 Ọ bụrụ na unu ekwe gee ntị, unu ga-eri ihe ọma dị n’ala a.+
20 Ma ọ bụrụ na unu ajụ+ wee nupụ isi, a ga-eji mma agha ripịa unu; n’ihi na ọnụ Jehova ekwuwo ya.”+
21 Lee nnọọ ka obodo nke kwesịrị ntụkwasị obi+ si ghọọ nwaanyị akwụna!+ Ikpe ziri ezi jupụtaburu n’ime ya;+ ezi omume bibu n’ime ya,+ ma ugbu a, ọ bụ ndị na-egbu ọchụ bi na ya.+
22 Ọlaọcha gị aghọọla ifurifu ọla.+ E jiriwo mmiri gwagbuo mmanya ọka wit gị.+
23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+
24 Ya mere, ihe ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, Dike nke Izrel,+ kwuru bụ: “Lee! M ga-enwere onwe m pụọ n’aka ndị na-emegide m, m ga-abọkwara onwe m ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro m.+
25 M ga-atụgharị aka m megide gị, m ga-agbazepụ ifurifu ọla gị dị ka à ga-asị na e tinyere ya ncha, m ga-ewepụkwa unyi gị niile.+
26 M ga-emekwa ka i nwee ndị ikpe dị ka i nwere na mbụ, meekwa ka i nwee ndị ndụmọdụ dị ka i nwere ná mmalite.+ E mesịa, a ga na-akpọ gị Obodo Ezi Omume, Obodo Kwesịrị Ntụkwasị Obi.+
27 A ga-eji ikpe ziri ezi gbapụta Zayọn,+ jirikwa ezi omume+ gbapụta ndị ya na-alọta alọta.
28 A ga-etipịa ndị na-enupụ isi na ndị mmehie n’otu mgbe,+ ndị na-ahapụ Jehova ga-alakwa n’iyi.+
29 N’ihi na ihere oké osisi ndị gụsiri unu agụụ ike ga-eme ha,+ unu ga-enwekwa mmechuihu n’ihi ubi ndị unu họọrọ.+
30 N’ihi na unu ga-adị ka osisi ukwu nke akwụkwọ ya na-akpọnwụ,+ dịkwa ka ubi mmiri na-adịghị.
31 Onye nwere ume ga-aghọ eriri,+ ihe ọ rụpụtara ga-aghọkwa icheku ọkụ; ha abụọ ga na-ere ọkụ otu mgbe, n’enweghị onye ga-emenyụ ya.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.