2 Timoti 3:1-17

3  Ma mara nke a, na n’oge ikpeazụ,+ a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.+  N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,+ ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe,+  ndị na-enweghị obi mmadụ,+ ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla,+ ndị nkwutọ,+ ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike,+ ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya,+  ndị na-arara mmadụ nye,+ ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu,+ ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya,+  ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke+ ma na-agọnahụ ike ya;+ zere ndị dị otú a.+  N’ihi na ụfọdụ ndị n’ime ha na-eji aghụghọ egbeba n’ezinụlọ dị iche iche+ ma na-adọrọ ndị inyom na-adịghị ike n’agha, bụ́ ndị mmehie na-anyịgbu, ndị ọchịchọ dị iche iche na-edu,+  ndị na-amụ ihe mgbe niile ma ha enweghị ike inweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu ma ọlị.+  Ọ bụ otú ahụ Janis na Jambris+ si guzogide Mozis ka ndị a sikwa na-eguzogide eziokwu.+ Ha bụ ndị uche ha rụrụ arụ kpamkpam,+ ndị a jụrụ ajụ n’ihe banyere okwukwe Ndị Kraịst.+  Ka o sina dị, ha agaghị enwe ọganihu ọzọ, n’ihi na ara nke na-agba ha ga-apụta ìhè nke ọma n’ihu mmadụ niile, dị nnọọ ka ara nke na-agba ndị ikom abụọ ahụ pụtara ìhè.+ 10  Ma ị gbasochiwo ozizi m anya, ya na ụzọ ndụ m,+ nzube m, okwukwe m, ogologo ntachi obi m, ịhụnanya m, ntachi obi m, 11  mkpagbu m, ahụhụ m, ụdị ihe ndị mere m n’Antiọk,+ n’Aịkoniọm,+ na Listra,+ ụdị mkpagbu ndị m diri; ma Onyenwe anyị napụtara m na ha niile.+ 12  N’eziokwu, a ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.+ 13  Ma ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ, na-eduhie ndị mmadụ ma bụrụ ndị a na-eduhie.+ 14  Otú ọ dị, gị onwe gị, nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere,+ ebe ị maara ndị i si n’aka ha mụta ha,+ 15  ebe ị makwaara na ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ+ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta+ site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.+ 16  Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,+ ọ bara uru iji ya zie ihe,+ iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị,+ iji ya mee ka ihe guzozie,+ na iji ya nye ọzụzụ+ n’ezi omume, 17  ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu,+ bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji