2 Pita 2:1-22
2 Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.
2 Ọtụtụ ndị ga-agbaso+ omume ha rụrụ arụ,+ a ga na-ekwujọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ n’ihi ndị a.+
3 Ha ga-eji okwu nrafu+ rigbuo unu n’ihi anyaukwu ha. Ma, ikpe nke si n’oge ochie+ ga-abịakwasị ha n’egbughị oge, mbibi ha adịghịkwa ero ụra.+
4 N’ezie, Chineke ahapụghị inye ndị mmụọ ozi+ ahụ mehiere emehie ahụhụ, kama, site n’ịtụba ha n’ime Tatarọs,+ ọ tụbara ha n’olulu nke oké ọchịchịrị ka e debe ha maka ikpe.+
5 Ọ hapụghịkwa inye ụwa oge ochie ahụhụ,+ kama o chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume,+ ya na mmadụ asaa ndị ọzọ,+ mgbe o ji iju mmiri+ bibie ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.
6 Sitekwa n’ime ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, ọ mara ha ikpe,+ mee ka ha ghọọrọ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ.+
7 Ma, ọ napụtara onye ezi omume bụ́ Lọt,+ onye nwere oké mwute n’ihi mmikpu nke ndị na-eleda iwu anya mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ.+
8 Ma mgbe onye ezi omume ahụ bi n’etiti ha, a na-emekpa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ́ kwa ụbọchị n’ihi ihe ọ na-ahụ na ihe ọ na-anụ, n’ihi mmebi iwu ha.
9 N’ihi ihe ndị a, Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa,+ ma ọ ga-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee bipụ ha,+
10 ma, karịsịa, ndị na-agbaso anụ ahụ́ wee na-enwe ọchịchọ imerụ ya,+ na ndị na-elelị ndị isi.+
Ndị na-enweghị egwu, ndị na-ekwesi olu ike, ha adịghị atụ ndị dị ebube egwu kama ha na-ekwujọ ha,+
11 ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi dị ike, nweekwa ume karị, ha adịghị eji okwu ọjọọ ebo ha ebubo,+ ha adịghị eme otú ahụ n’ihi ùgwù ha na-akwanyere Jehova.+
12 Ma, a ga-ebibi ndị a dị ka anụmanụ ndị na-adịghị eche echiche, bụ́ ndị a na-amụ ka e jide ha gbuo, n’ihe ndị ahụ ha na-amaghị ma na-ekwujọ,+ n’ụzọ mbibi nke ha na-eso,
13 ha na-eme onwe ha ihe ọjọọ+ dị ka ụgwọ ọrụ maka ime ihe ọjọọ.+
Ha na-ewere ibi ndụ okomoko n’oge ehihie dị ka ihe ụtọ.+ Ha bụ ntụpọ na mmerụ, jiri oké obi ụtọ na-emikpu onwe ha n’ozizi nduhie ha mgbe unu na ha na-erikọ oriri.+
14 Ha nwere anya jupụtara n’ịkwa iko,+ ha enweghị ike isepụ aka ná mmehie,+ ha na-aratakwa mkpụrụ obi ndị na-akwụsighị ike. Ha nwere obi a zụrụ azụ n’anyaukwu.+ Ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.+
15 Ebe ha hapụrụ ụzọ kwụ ọtọ, e duhiewo ha. Ha esowo ụzọ Belam,+ nwa Biọ, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ime ihe ọjọọ n’anya,+
16 ma nata ịdọ aka ná ntị maka mmebi o mebiri ihe ziri ezi.+ Ịnyịnya ibu nke na-adịghị ekwu okwu ji olu mmadụ kwuo okwu,+ wee gbochie omume onye ara nke onye amụma ahụ chọrọ ime.+
17 Ndị a bụ isi iyi nke mmiri na-adịghị,+ na alụlụụ nke oké ifufe mmiri na-ebugharị, e debeworo ha oké ọchịchịrị.+
18 N’ihi na ha na-ekwu oké okwu ndị na-abaghị uru, ha na-ejikwa ọchịchọ anụ ahụ́+ na àgwà rụrụ arụ na-arata+ ndị ka si n’etiti ndị na-eme omume njehie pụta.+
19 Ọ bụ ezie na ha na-ekwe ha nkwa nnwere onwe,+ ha onwe ha bụ ndị ohu nke ire ure.+ N’ihi na onye ọ bụla nke onye ọzọ meriri bụ ohu onye ahụ.+
20 N’ezie, ọ bụrụ na mgbe ha gbapụsịrị ná mmerụ nke ụwa+ site n’ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst, ha etinye aka ọzọ n’ihe ndị a, bụrụkwa ndị e meriri,+ ọnọdụ ha n’ikpeazụ adịwo njọ karịa ka ọ dị na mbụ.+
21 N’ihi na ọ gaara akara ha mma na ha amaghị ụzọ nke ezi omume n’ụzọ ziri ezi+ karịa na mgbe ha matasịrị ya n’ụzọ ziri ezi, ha ahapụ iwu ahụ dị nsọ nke e nyere ha.+
22 Ilu ahụ a tụrụ nke bụ́ eziokwu emezuwo n’ebe ha nọ: “Nkịta+ alaghachiwo n’agbọ ọ gbọrọ, nne ézì nke a sara ahụ́ alaghachiwokwa gaa na-adagharị n’apịtị.”+