2 Ihe E Mere 9:1-31
9 Eze nwaanyị Shiba+ wee nụ akụkọ banyere Sọlọmọn, o wee jiri ajụjụ ndị na-agbagwoju anya+ bịa Jeruselem ịnwale Sọlọmọn, ya na oké ìgwè mmadụ so ya, tinyere kamel+ ndị bu mmanụ bọlsọm+ na ọlaedo+ dị nnọọ ukwuu nakwa nkume ndị dị oké ọnụ ahịa.+ O wee bịakwute Sọlọmọn gwa ya ihe niile dị ya n’obi.+
2 Sọlọmọn wee zaa ya ihe niile+ ọ jụrụ ya, ọ dịghị ihe ọ bụla siiri Sọlọmọn ike ịza nwaanyị ahụ.+
3 Mgbe eze nwaanyị Shiba hụrụ amamihe Sọlọmọn+ na ụlọ o wuru,+
4 na ihe oriri na-adị na tebụl ya+ na otú ndị na-ejere ya ozi si anọdụ ala na otú ndị na-ejere ya ozi n’oge nri si eje ozi na ejiji ha+ na otú ndị na-ebunye ya ihe ọṅụṅụ si ejere ya ozi+ nakwa otú ha si eji ejiji, na àjà nsure ọkụ+ ọ na-achụ mgbe niile n’ụlọ Jehova,+ o riri ya ọnụ.
5 O wee sị eze: “Ihe m nọ n’ala m nụ banyere gị nakwa banyere amamihe gị bụ eziokwu.+
6 Ekwetaghị m+ ihe e kwuru ruo mgbe m bịara ka m jiri anya m hụ;+ ma, lee! a gwarughị m ọkara otú amamihe gị hà.+ Ị karịrị ihe m nụrụ.+
7 Obi ụtọ+ na-adịrị ndị gị, obi ụtọ na-adịkwara ndị a na-ejere gị ozi bụ́ ndị na-eguzo n’ihu gị mgbe niile na-ege ntị n’amamihe gị.+
8 Ka Jehova bụ́ Chineke gị bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye nwere mmasị+ n’ebe ị nọ site n’ime ka ị nọkwasị n’ocheeze ya+ ịbụrụ Jehova bụ́ Chineke gị eze;+ n’ihi na Chineke gị hụrụ Izrel n’anya,+ ime ka ọ dịruo mgbe a na-akaghị aka, nke mere o ji mee gị eze ha+ ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi+ ma na-eme ezi omume.”+
9 O wee nye eze ọlaedo+ dị otu narị talent na iri abụọ na mmanụ bọlsọm+ dị nnọọ ukwuu na nkume dị oké ọnụ ahịa;+ ọ dịghị mmanụ bọlsọm há ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere Eze Sọlọmọn.+
10 Ndị na-ejere Haịram+ ozi na ndị na-ejere Sọlọmọn ozi bụ́ ndị si Ofa bute ọlaedo+ butekwara osisi algọm+ na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa.+
11 Eze wee jiri osisi algọm ndị ahụ rụọ ebe e si arịgo n’ụlọ Jehova nakwa ebe e si arịgo+ n’ụlọ eze,+ jirikwa ha rụọ une+ na ụbọ akwara+ maka ndị na-abụ abụ,+ a hụtụbeghị ụdị ha n’ala Juda.
12 Eze Sọlọmọn nyekwara eze nwaanyị+ Shiba ihe niile masịrị ya bụ́ ihe ndị ọ rịọrọ ya, tinyere ihe ruru ọnụ ahịa ihe ndị o wetaara eze. O wee tụgharịa laa n’ala ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.+
13 Ọlaedo a na-ebutere Sọlọmọn n’otu afọ dị narị talent ọlaedo isii na iri isii na isii n’ịdị arọ,+
14 n’agụnyeghị ihe ndị na-agba ahịa+ na ndị ahịa na-ebubata. Ndị eze niile nke ndị Arab+ na ndị gọvanọ ala ahụ na-ewetakwara Sọlọmọn ọlaedo na ọlaọcha.
15 Eze Sọlọmọn wee jiri ọlaedo+ a gwara agwa rụọ narị nnukwu ọta abụọ (o ji narị shekel ọlaedo isii a gwara agwa machie nnukwu ọta nke ọ bụla),+
16 jirikwa ọlaedo a gwara agwa rụọ narị obere ọta atọ (o ji maịna ọlaedo atọ machie obere ọta nke ọ bụla).+ Eze wee debe ha n’Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+
17 Eze jikwa ọdụ́ rụọ otu nnukwu ocheeze ma were ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+
18 Ebe e si arịgo n’ocheeze ahụ nwere nzọụkwụ isii, ihe mgbakwasị ụkwụ e ji ọlaedo rụọ dịkwa n’ocheeze ahụ (e jikọtara ya na ocheeze ahụ), ebe a na-anọdụ ọdụ nwekwara ebe a na-atụkwasị aka n’akụkụ ya abụọ, ọdụm abụọ+ guzokwa n’akụkụ ebe ndị ahụ a na-atụkwasị aka.+
19 Ọdụm iri na abụọ+ guzokwa n’elu nzọụkwụ isii ahụ, n’akụkụ ya abụọ. Ọ dịghị alaeze ọzọ rụrụ nke dị ka ya.+
20 E ji ọlaedo+ mee arịa niile Eze Sọlọmọn ji aṅụ ihe ọṅụṅụ,+ e jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee arịa niile dị n’Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ Ọ dịghị ihe ọ bụla e ji ọlaọcha mee; a gụrụ ya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ+ ma ọlị n’ụbọchị Sọlọmọn.
21 N’ihi na ndị na-ejere Haịram+ ozi na-eji ụgbọ mmiri eze aga Tashish.+ Otu ugboro n’afọ atọ, ụgbọ mmiri Tashish na-ebu ọlaedo na ọlaọcha,+ ọdụ́+ na adaka na ekwuru, alọta.+
22 Ya mere, Eze Sọlọmọn nwere akụnụba+ na amamihe+ karịa ndị eze niile nọ n’ụwa.
23 Ndị eze niile nke ụwa na-achọkwa ịbịa+ n’ihu Sọlọmọn ka ha gee ntị n’amamihe ya,+ nke ezi Chineke tinyere n’obi ya.+
24 Kwa afọ,+ onye ọ bụla n’ime ha na-eweta onyinye,+ bụ́ ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee+ na uwe,+ ihe agha na mmanụ bọlsọm, ịnyịnya na ịnyịnya ibu.
25 Sọlọmọn wee nwee puku ụlọ ịnyịnya anọ+ na ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya+ na puku ịnyịnya agha iri na abụọ, o wee debe ha n’obodo dị iche iche a na-edebe ụgbọ ịnyịnya+ nakwa n’ebe dị eze nso na Jeruselem.
26 O wee na-achị ndị eze niile malite n’Osimiri ruo n’ala ndị Filistia, ruokwa n’ókè Ijipt.+
27 Eze mekwara ka ọlaọcha dịrị ọtụtụ ka nkume na Jeruselem; o mekwara ka osisi sida dịrị ọtụtụ+ ka osisi sịkamọ+ ndị dị na Shefila.+
28 E nwekwara ndị si Ijipt+ na ala ndị ọzọ na-ebutere Sọlọmọn ịnyịnya.+
29 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Sọlọmọn,+ ma ndị mbụ ma ndị ikpeazụ, ọ̀ bụ na e deghị ha n’okwu Netan+ onye amụma nakwa n’amụma Ahaịja+ onye Shaịlo+ nakwa n’ihe ndekọ ọhụụ nke Ido+ onye ọhụụ hụrụ banyere Jeroboam+ nwa Nibat?+
30 Sọlọmọn wee nọrọ na Jeruselem na-achị Izrel dum ruo afọ iri anọ.
31 N’ikpeazụ, Sọlọmọn sooro nna nna ya hà dinaa. Ha wee lie ya n’Obodo Devid nna ya;+ Rehoboam+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.+