2 Ihe E Mere 8:1-18
8 O wee ruo mgbe afọ iri abụọ gwụchara,+ bụ́ nke Sọlọmọn ji wuo ụlọ Jehova+ na obí nke ya,+
2 na Sọlọmọn wughachiri obodo ndị Haịram+ nyere Sọlọmọn ma mee ka ụmụ Izrel biri na ha.
3 Sọlọmọn gakwara Hemat-zoba wee merie ya.
4 O wee wughachi Tadmọ nke dị n’ala ịkpa, wughachikwa obodo niile a na-akwakọba ihe,+ bụ́ ndị o wuru na Hemat.+
5 O wee gaa n’ihu iwu Bet-horọn Mgbago+ na Bet-horọn Ndịda,+ bụ́ obodo e wusiri ike, ndị nwere mgbidi,+ ibo ụzọ na ihe e ji atụchi ha,+
6 o wukwara Belat+ na obodo niile a na-akwakọba ihe bụ́ ndị ghọrọ nke Sọlọmọn nakwa obodo niile a na-edebe ụgbọ ịnyịnya+ na obodo ndị bụ́ maka ndị na-agba ịnyịnya+ nakwa ihe ọ bụla dị Sọlọmọn+ mma nke masịrị ya iwu na Jeruselem nakwa na Lebanọn+ nakwa n’ala dum ọ na-achị.
7 Ma ndị niile fọdụrụ ná ndị Het+ nakwa ná ndị Amọraịt+ nakwa ná ndị Perizaịt+ nakwa ná ndị Haịvaịt+ nakwa ná ndị Jibọs,+ bụ́ ndị na-abụghị ndị Izrel,+
8 ọ bụ n’ụmụ ha ndị nọchiri ha n’ala ahụ mgbe ha nwụsịrị, bụ́ ndị ụmụ Izrel na-ekpochapụghị,+ ka Sọlọmọn si enweta+ ndị ikom ọ na-amanye ịrụ ọrụ ruo taa.+
9 Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel Sọlọmọn ji mere ohu maka ịrụrụ ya ọrụ;+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha+ na ndị isi na-esote ndị isi agha ya na ndị isi nke ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya ya+ na ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya.+
10 Ọ bụ ndị a bụ ndị isi+ nke ndị na-anọchite anya Eze Sọlọmọn, narị mmadụ abụọ na iri ise, bụ́ ndị isi ọrụ.+
11 Sọlọmọn si n’Obodo Devid+ kpọpụta ada Fero+ wee kpọga ya n’ụlọ o wuuru ya,+ n’ihi na ọ sịrị: “Ọ bụ ezie na ọ bụ nwunye m, o kwesịghị ibi n’ụlọ Devid eze Izrel, n’ihi na ebe niile igbe Jehova batara bụ ebe dị nsọ.”+
12 Ọ bụ mgbe ahụ ka Sọlọmọn chụụrụ Jehova àjà nsure ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà+ Jehova nke o wuru n’ihu ihe owuwu ụzọ mbata,+
13 ọbụna dị ka a na-achụ kwa ụbọchị,+ dị ka ihe Mozis nyere n’iwu si dị maka ụbọchị izu ike+ nakwa maka ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ nakwa maka ememme a kara aka+ ndị a na-eme ugboro atọ n’afọ,+ bụ́ ememme achịcha na-ekoghị eko+ na ememme izu+ na ememme ụlọ ndò.+
14 O kekwara ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè+ wee nye ha ọrụ dị ka ụkpụrụ Devid nna ya+ tụrụ si dị, nyekwa ndị Livaị+ ọrụ, ka ha na-enye otuto+ ma na-eje ozi+ n’ihu ndị nchụàjà dị ka a na-eme kwa ụbọchị,+ o kekwara ndị nche ọnụ ụzọ ámá n’ìgwè n’ìgwè maka ịnọ n’ọnụ ụzọ ámá dị iche iche,+ n’ihi na nke ahụ bụ ihe Devid onye nke ezi Chineke nyere n’iwu.
15 Ha ahapụghịkwa iwu eze nyere ndị nchụàjà na ndị Livaị banyere ihe ọ bụla nakwa banyere ebe a na-akwakọba ihe.+
16 A rụchara ọrụ dum Sọlọmọn nwere ịrụ+ malite n’ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọ Jehova ruo mgbe a rụchara ya.+ E wee wuchaa ụlọ Jehova.+
17 Ọ bụ mgbe ahụ ka Sọlọmọn gara Iziọn-giba+ nakwa Ilọt+ nke dị n’ụsọ oké osimiri, n’ala Idọm.+
18 Mgbe mgbe, Haịram+ na-esi n’aka ndị na-ejere ya ozi na-ezigara ya ụgbọ mmiri na ndị na-eje ozi, bụ́ ndị oké osimiri doro anya,+ ha na ndị na-ejere Sọlọmọn ozi na-eso aga Ofa+ na-ebute narị talent+ ọlaedo+ anọ na iri ise, na-ebulatara Eze Sọlọmọn.+