2 Ihe E Mere 7:1-22

7  Ozugbo Sọlọmọn kpechara ekpere,+ ọkụ si n’eluigwe daa+ wee rechapụ anụ àjà nsure ọkụ ahụ+ na àjà nkịtị, ebube Jehova+ wee jupụta n’ụlọ ahụ.  Ndị nchụàjà enweghịkwa ike ịbanye n’ụlọ Jehova+ n’ihi na ebube Jehova jupụtara n’ụlọ Jehova.  Ụmụ Izrel niile nọ na-ekiri ihe na-emenụ mgbe ọkụ ahụ dara, ebube Jehova wee dịkwasị n’ụlọ ahụ. Ha hulatara+ ala ozugbo kpudo ihu na pevment wee kpọọ isiala+ kelee Jehova, “n’ihi na ọ dị mma,+ n’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+  Eze na ndị niile ahụ nọ na-achụ àjà n’ihu Jehova.+  Eze Sọlọmọn wee chụọ ehi dị puku iri abụọ na puku abụọ na atụrụ dị otu narị puku na iri puku abụọ n’àjà.+ Eze na ndị niile ahụ wee rara ụlọ ezi Chineke nye.+  Ndị nchụàjà+ guzokwa n’ebe ha na-arụ ọrụ, ndị Livaị+ jikwa ngwá egwú+ e ji abụrụ Jehova abụ guzoro, bụ́ ngwá egwú eze Devid+ mere ka e jiri ha na-ekele Jehova, sị, “n’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi,” bụ́ nke ha na-ekwu n’oge Devid si n’aka ha na-enye otuto; ndị nchụàjà nọkwa na-afụsi opi ike+ n’ihu ha, ebe ụmụ Izrel dum guzo ọtọ.  Sọlọmọn wee doo etiti ogige nke dị n’ihu ụlọ Jehova nsọ,+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ chụrụ àjà nsure ọkụ,+ werekwa abụba anụ àjà udo chụọ àjà, n’ihi na ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa mee+ nke Sọlọmọn wuru abaghị àjà nsure ọkụ ahụ na àjà ọka*+ ahụ na abụba ahụ.+  Sọlọmọn wee mee ememme+ ahụ n’oge ahụ ruo ụbọchị asaa, ya na Izrel dum,+ bụ́ ọgbakọ dị nnọọ ukwuu,+ malite n’ebe e si abanye Hemat+ gbadaruo ndagwurugwu Ijipt.+  Ma ha nwere nzukọ ukwu+ n’ụbọchị nke asatọ, n’ihi na ha mere ememme ịrara ebe ịchụàjà ahụ nye ruo ụbọchị asaa, meekwa oriri maka ya ụbọchị asaa. 10  N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa nke asaa, ọ hapụrụ ndị ahụ, ha wee jiri obi ụtọ na ọṅụ+ laa n’ụlọ ha, n’ihi ịdị mma+ Jehova n’ebe Devid na Sọlọmọn nọ nakwa n’ebe Izrel bụ́ ndị ya nọ.+ 11  Sọlọmọn wee wuchaa ụlọ Jehova+ na ụlọ eze;+ ihe niile Sọlọmọn bu n’obi ime banyere ụlọ Jehova nakwa banyere obí ya, o mechara ha nke ọma. 12  Jehova wee pụta ìhè+ n’ihu Sọlọmọn n’abalị wee sị ya: “Anụwo m ekpere gị,+ ahọrọwokwa m+ ụlọ a ka ọ bụrụ ebe a ga na-achụ àjà.+ 13  Ọ bụrụ na mụ emechie eluigwe ka mmiri ghara izo,+ ọ bụrụ na mụ enye ụkpara iwu iripịa ihe dị n’ala a,+ ọ bụrụkwa na mụ emee ka ọrịa na-efe efe dakwasị ndị m,+ 14  ndị m+ bụ́ ndị a kpọkwasịrị aha m+ ewee weda onwe ha ala+ wee kpee ekpere+ ma chọọ ihu m,+ hapụkwa ụzọ ọjọọ ha,+ mụ onwe m ga-anọ n’eluigwe nụ+ wee gbaghara ha mmehie ha,+ m ga-agwọkwa ala ha.+ 15  Anya m+ ga-eghere oghe, ntị m+ ga-anụkwa ekpere e kpere n’ebe a. 16  Ugbu a, ahọrọwo m+ ụlọ a, dookwa ya nsọ ka aha m+ wee dịrị na ya ruo mgbe a na-akaghị aka,+ anya m na obi m ga-adịkwa na ya mgbe niile.+ 17  “Ọ bụrụ na i jee ije n’ihu m, dị nnọọ ka Devid+ nna gị jere, site n’ime ihe niile m nyere gị n’iwu+ ma debe ụkpụrụ m+ na mkpebi ikpe m,+ 18  m ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze gị guzosie ike,+ dị nnọọ ka mụ na Devid nna gị gbara ndụ,+ m wee sị, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe nwoke si n’ahụ́ gị nke na-achị Izrel.’+ 19  Ma ọ bụrụ na unu atụgharịa+ wee ghara idebe ụkpụrụ m+ na iwu m+ ndị m nyere unu, unu ewee gaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala,+ 20  m ga-efopụkwa ha n’ala m nke m nyere ha;+ m ga-ewepụkwa ụlọ a nke m doro nsọ+ maka aha m n’ihu m,+ m ga-emekwa ka ọ ghọọ ihe e ji atụ ilu+ na ihe ịkwa emo n’etiti ndị niile.+ 21  Ma ụlọ a nke ghọrọ mkpọmkpọ ebe,+ onye ọ bụla nke na-agafe ya ga-ekporopụ anya+ wee sị, ‘N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ala a na ụlọ a otú a?’+ 22  Ha ga-asịkwa, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova+ bụ́ Chineke ndị nna nna ha bụ́ onye kpọpụtara ha n’ala Ijipt,+ ha wee soro chi ọzọ dị iche iche+ wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha.+ Ọ bụ ya mere o ji mee ka ọdachi a dum dakwasị ha.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”
Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.