2 Ihe E Mere 6:1-42
6 Ọ bụ mgbe ahụ ka Sọlọmọn kwuru,+ sị: “Jehova kwuru na ya gaje ibi n’ígwé ojii;+
2 mụ onwe m ewuworo gị ụlọ nke bụ́ ebe obibi dị elu+ na ebe guzosiri ike ka i biri na ya ruo mgbe a na-akaghị aka.”+
3 Eze wee tụgharịa chee ha ihu malite ịgọzi+ ọgbakọ Izrel dum, ka ọgbakọ Izrel dum guzo ọtọ.+
4 O wee gaa n’ihu ịsị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye ji aka ya mezuo+ ihe o ji ọnụ ya gwa Devid nna m,+ sị,
5 ‘Malite n’ụbọchị m si n’ala Ijipt kpọpụta ndị m, ọ dịghị obodo m họọrọ n’ime ebo niile nke Izrel iwu ụlọ ka aha m dịrị na ya,+ ọ dịghịkwa onye m họọrọ ka ọ bụrụ onye ndú nke ndị m Izrel.+
6 Ma m ga-ahọrọ Jeruselem+ ka aha m dịrị na ya, m ga-ahọrọkwa Devid ka ọ bụrụ onyeisi nke ndị m bụ́ Izrel.’+
7 O wee dịrị Devid nna m n’obi iwuru aha Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ.+
8 Ma Jehova gwara Devid nna m, sị, ‘Ebe ọ bụ na ọ dị gị n’obi iwuru aha m ụlọ, i mere nke ọma, n’ihi na ọ dị gị n’obi.+
9 Ọ bụ naanị na ọ bụghị gị ga-ewu ụlọ ahụ,+ kama ọ bụ nwa gị nke ga-esi n’úkwù gị pụta ga-ewuru aha m ụlọ.’+
10 Jehova wee mezuo ihe o kwuru+ na m ga-anọchi Devid nna m,+ nọkwasịkwa n’ocheeze+ Izrel, dị nnọọ ka Jehova kwuru,+ nakwa na m ga-ewuru aha Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ,+
11 nakwa na ọ bụ ebe m ga-adọba Igbe+ e tinyere ọgbụgba ndụ nke Jehova na ụmụ Izrel gbara.”+
12 O wee guzoro n’ihu ebe ịchụàjà Jehova, n’ihu ọgbakọ Izrel dum.+ O wee gbasapụ ọbụ aka ya.+
13 (N’ihi na Sọlọmọn ji ọla kọpa rụọ ikpo okwu+ ma dọba ya n’etiti nnukwu ogige ahụ.+ Ọ dị kubit ise n’ogologo, dịrị kubit ise n’obosara, dịrịkwa kubit atọ n’ịdị elu; o wee guzoro n’elu ya.) O wee gbuo ikpere n’ala+ n’ihu ọgbakọ Izrel dum ma gbasapụ ọbụ aka ya chee n’eluigwe.+
14 O wee gaa n’ihu ịsị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ ọ dịghị Chi dị ka gị+ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, gị onye na-edebere ndị ohu gị bụ́ ndị ji obi ha dum na-eje ije n’ihu gị+ ọgbụgba ndụ gị,+ gị onye na-egosikwa ha obiọma;*
15 gị onye mezuwooro ohu gị Devid bụ́ nna m ihe i kwere ya ná nkwa.+ I ji ọnụ gị kwe nkwa, i wee jiri aka gị mezuo ya taa.+
16 Ugbu a kwa, Jehova bụ́ Chineke Izrel, mezuoro ohu gị Devid bụ́ nna m ihe i kwere ya ná nkwa, sị, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe nwoke si n’ahụ́ gị nke ga-anọkwasị n’ocheeze Izrel,+ ma ọ bụrụhaala na ụmụ gị+ elezie ụzọ ha anya site n’ije ije n’iwu m,+ dị nnọọ ka i jere n’ihu m.’+
17 Ma ugbu a, Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ ka nkwa+ i kwere ohu gị Devid mezuo.+
18 “Ma Chineke ọ̀ ga-eso ụmụ mmadụ biri n’elu ala n’ezie?+ Lee! Eluigwe, ee, eluigwe nke eluigwe apụghị ịba gị,+ ma ya fọdụzie ụlọ a m wuru!+
19 Jehova bụ́ Chineke m, chee ihu n’ekpere ohu+ gị na-ekpe nakwa n’arịrịọ ọ na-arịọ ka i meere ya amara,+ site n’ige ntị n’ákwá ohu gị na-ebesara gị+ na ekpere ọ na-ekpe n’ihu gị,+
20 ka anya gị dịrị+ n’ebe ụlọ a dị ehihie na abalị, n’ebe i kwuru na ị ga-eme ka aha gị dịrị,+ site n’ige ntị n’ekpere ohu gị chere ihu n’ebe a na-ekpe.+
21 Gee ntị n’arịrịọ ohu+ gị nakwa na nke ndị gị Izrel mgbe ha chere ihu n’ebe a kpee ekpere,+ ka gị onwe gị nọrọ n’ebe obibi gị, bụ́ eluigwe,+ nụrụ; nụrụ ya ma gbaghara.+
22 “Ọ bụrụ na mmadụ emehie mmadụ ibe ya,+ onye ahụ e mehiere ewee mee+ ka ọ ṅụọ iyi ka iyi ọ ṅụrụ ree n’ahụ́ ya, o wee buru iyi ahụ e mere ka ọ ṅụọ bịa n’ihu ebe ịchụàjà gị dị n’ụlọ a,+
23 mgbe ahụ, gị onwe gị nọrọ n’eluigwe nụrụ,+ meekwa ihe+ ma kpee ndị ohu gị ikpe iji kwụọ onye ajọ omume ụgwọ ọrụ ya site n’ime ka o buru ihe o metara+ nakwa site n’ịkpọ onye ezi omume onye ezi omume+ site n’ịkwụ ya ụgwọ dị ka ezi omume ya si dị.+
24 “Ọ bụrụ na ndị iro emerie ndị gị bụ́ Izrel+ n’ihi na ha na-emehie gị,+ ha ewee lọghachikwute gị+ n’ezie ma nọrọ n’ihu gị, n’ụlọ a, too aha gị+ ma kpee ekpere,+ rịọkwa gị arịrịọ ka i meere ha amara,+
25 mgbe ahụ, gị onwe gị nọrọ n’eluigwe nụrụ,+ gbagharakwa+ mmehie ndị gị bụ́ Izrel ma kpọghachite ha+ n’ala i nyere ha na ndị nna nna ha.+
26 “Mgbe e mechiri eluigwe, mmiri ewee ghara izo,+ n’ihi na ha nọ na-emehie+ gị, ha wee chee ihu n’ebe a kpee ekpere+ ma too aha gị, sikwa ná mmehie ha chigharịa, n’ihi na ị nọ na-emekpa ha ahụ́,+
27 mgbe ahụ, gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe nụrụ, gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ya bụ, mmehie nke ndị gị bụ́ Izrel, n’ihi na ị na-ezi+ ha ụzọ dị mma+ nke ha kwesịrị ije ije na ya; mee ka mmiri zoo+ n’ala gị nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.+
28 “Ọ bụrụ na ụnwụ+ adaa n’ala a, ọ bụrụ na e nwee ọrịa na-efe efe,+ ọ bụrụ na ihe ọkụkụ akpọnwụọ,+ e nweekwa ịma ebu,+ igurube+ na ọchịcha;+ ọ bụrụ na ndị iro+ ha anọchibido ha n’ọnụ ụzọ ámá+ nke ala ha—ụdị ihe otiti ọ bụla, ụdị ọrịa ọ bụla+—
29 ekpere ọ bụla+ onye ọ bụla ma ọ bụ ndị gị niile bụ́ Izrel ga-ekpe+ ma ọ bụ arịrịọ ọ bụla ha ga-arịọ ka i meere ha amara,+ n’ihi na onye ọ bụla n’ime ha maara ihe na-egbu ya mgbu+ na ihe na-afụ ya ụfụ; mgbe ọ gbasapụrụ ọbụ aka ya chee n’ebe ụlọ a dị,+
30 mgbe ahụ, gị onwe gị nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị,+ nụrụ, gbagharakwa+ wee kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya niile si dị,+ n’ihi na ị maara obi ya+ (n’ihi na ọ bụ naanị gị maara obi ụmụ mmadụ nke ọma);+
31 ka ha wee tụọ egwu+ gị site n’ije ije n’ụzọ gị n’ụbọchị niile ha dị ndụ n’elu ala nke i nyere nna nna anyị hà.+
32 “Tinyere onye mba ọzọ, onye na-esoghị ná ndị gị Izrel,+ onye sikwa n’ala dị anya bịa n’ihi aha gị dị ukwuu+ nakwa n’ihi aka gị dị ike+ nakwa n’ihi ogwe aka gị ị gbatịrị agbatị,+ o wee bịa chee ihu n’ụlọ a kpee ekpere,+
33 mgbe ahụ, gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike,+ nụrụ, meekwa ihe niile mere onye mba ọzọ ahụ ji na-akpọku gị;+ ka ndị niile nke ụwa wee mara aha gị+ wee tụọ egwu+ gị dị ka ndị gị Izrel na-eme, ka ha wee marakwa na a kpọkwasịwo aha gị n’ụlọ a m wuru.+
34 “Ọ bụrụ na ndị gị agaa ibuso ndị iro ha agha+ n’ebe i zigara+ ha, ha ewee chee ihu n’obodo a ị họọrọ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị+ wee kpekuo gị ekpere,+
35 nọrọ n’eluigwe nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha ga-arịọ ka i meere ha amara,+ meekwara ha ihe e kpere n’ikpe.+
36 “Ọ bụrụ na ha emehie gị+ (n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị eme mmehie),+ i wee weso ha oké iwe ma nyefee ha n’aka ndị iro, ndị meriri ha ewee dọrọ ha n’agha laa n’ala dị anya ma ọ bụ n’ebe dị nso;+
37 anya ewee doo ha n’ala ebe a dọọrọ ha n’agha laa, ha ewee lọghachi ma rịọ gị arịrịọ ka i meere ha amara n’ala ndị dọọrọ ha n’agha,+ sị, ‘Anyị emehiewo,+ anyị ejehiewo,+ anyị emewokwa ajọ omume’;+
38 ha ewee nọrọ n’ala ebe ndị dọọrọ ha n’agha ji ha eji+ wee jiri obi ha dum+ na mkpụrụ obi ha dum lọghachikwute gị, ha ewee chee ihu n’ala ha bụ́ nke i nyere ndị nna nna ha, nakwa n’obodo ị họọrọ,+ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị,+ kpekuo gị ekpere;
39 nọrọkwa n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike,+ nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha na-arịọ ka i meere ha amara,+ meekwara ha ihe e kpere n’ikpe+ ma gbaghara+ ndị gị bụ́ ndị mehiere gị.
40 “Biko, Chineke m, ka anya gị+ ghere oghe, ka ntị gị+ nụkwa ekpere a na-ekpe maka ebe a.
41 Jehova Chineke, bilie+ banye n’izu ike gị,+ gị na Igbe nke ike gị.+ Jehova Chineke, ka e yiwe ndị nchụàjà gị nzọpụta dị ka uwe, ka ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe ọma.+
42 Jehova Chineke, ajụla ige onye i tere mmanụ ntị.+ Cheta obiọma i gosiri Devid ohu gị.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”