2 Ihe E Mere 5:1-14
5 N’ikpeazụ, ọrụ niile Sọlọmọn nwere ịrụ n’ụlọ Jehova gwụchara,+ Sọlọmọn wee malite iwebata ihe ndị Devid nna ya doro nsọ;+ o wee debe ọlaọcha na ọlaedo na arịa niile n’ebe ndebe akụ̀ nke ụlọ ezi Chineke.+
2 Ọ bụ mgbe ahụ ka Sọlọmọn kpọrọ ndị okenye Izrel+ na ndị isi niile nke ebo dị iche iche,+ na ndị isi ọnụmara dị iche iche+ nke ụmụ Izrel, ka ha zukọta na Jeruselem, iji si n’Obodo Devid,+ ya bụ, Zayọn,+ bugote igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova.+
3 Ndị Izrel niile wee gbakọọ n’ebe eze nọ n’oge ememme, ya bụ, nke a na-eme n’ọnwa nke asaa.+
4 Ndị okenye niile nke Izrel wee bịa, ndị Livaị wee buru Igbe ahụ.+
5 Ha wee bugote Igbe+ ahụ nakwa ụlọikwuu nzute+ na arịa+ niile dị nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ. Ọ bụ ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị bugotere ha.+
6 Eze Sọlọmọn na nzukọ ụmụ Izrel bụ́ ndị zara òkù ọ kpọrọ nọ n’ihu Igbe ahụ na-achụ atụrụ na ehi n’àjà.+ A pụghị ịgụta anụ ndị ahụ ọnụ ma ọ bụ ịmata ole ha dị n’ihi na ha dị ọtụtụ.
7 Ndị nchụàjà wee bubata igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’ebe ọ ga na-adị, n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime+ ụlọ ahụ, n’Ebe Kasị Nsọ,+ n’okpuru nku cherọb ndị ahụ.+
8 Ya mere, nku cherọb ndị ahụ gbasara agbasa n’ebe a dọbara Igbe ahụ, nke mere na cherọb ndị ahụ si n’elu+ kpuchie Igbe ahụ na okporo osisi ya.+
9 Ma okporo osisi ndị ahụ dị ogologo, nke mere na a na-anọ n’Ebe Nsọ, n’ihu ọnụ ụlọ dị n’ime ime, ahụ ọnụ ọnụ okporo osisi ndị ahụ anya, ma a naghị anọ n’èzí ahụ ha anya, ha dị n’ebe ahụ ruo taa.+
10 Ọ dịghị ihe dị n’Igbe ahụ ma e wezụga mbadamba nkume abụọ ahụ+ Mozis tinyere na ya na Horeb,+ mgbe Jehova na ụmụ Izrel gbara ndụ,+ ka ha si n’Ijipt na-apụta.+
11 O wee ruo na mgbe ndị nchụàjà si n’ebe nsọ ahụ pụta (n’ihi na ndị nchụàjà niile nọnụ doro onwe ha nsọ+—ọ dịghị mkpa ka ha nọrọ n’ìgwè ha dị iche iche);+
12 ndị Livaị+ bụ́ ndị na-abụ abụ, ndị nọ n’okpuru Esaf,+ Himan,+ Jedutọn+ na ụmụ ha na ụmụnne ha, ha niile, bụ́ ndị yi ákwà ọma, jirikwa ájà+ na ụbọ akwara+ na une,+ guzo n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụàjà ahụ. Ndị nchụàjà, bụ́ ndị dị otu narị mmadụ na iri abụọ, guzokwa na-afụ opi;+
13 o wee ruo na ozugbo ndị ahụ bụ́ ndị na-afụ opi na ndị ahụ na-abụ abụ ji otu olu+ na-agụ egwú iji too Jehova ma kelee ya, ozugbo ha jikwa opi na ájà na ngwá egwú+ na-abụ abụ wee na-eto+ Jehova, sị, “n’ihi na ọ dị mma,+ n’ihi na obiọma*+ ya na-adịru mgbe ebighị ebi,” ígwé ojii+ jupụtara n’ụlọ ahụ, ya bụ, n’ụlọ Jehova,+
14 ndị nchụàjà enweghịkwa ike iguzo jee ozi n’ihi ígwé ojii ahụ;+ n’ihi na ebube+ Jehova jupụtara n’ụlọ ezi Chineke.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”