2 Ihe E Mere 4:1-22
4 O wee jiri ọla kọpa rụọ ebe ịchụàjà+ nke dị kubit iri abụọ n’ogologo, dịrịkwa kubit iri abụọ n’obosara nakwa kubit iri n’ịdị elu.+
2 O wee rụọ oké osimiri a wụrụ awụ+ nke dị kubit iri malite n’otu akụkụ ọnụ ya ruo n’akụkụ ọnụ ya nke ọzọ. Ọ dị okirikiri, dịrịkwa kubit ise n’ịdị elu, ọ na-ewe eriri dị kubit iri atọ iji tụọ ya gburugburu.+
3 E nwere ihe ịchọ mma ndị yiri afụfa ọhịa+ n’okpuru ya gburugburu, iri dị n’otu kubit nke ọ bụla, gbaa oké osimiri ahụ gburugburu.+ Ihe ịchọ mma ahụ, bụ́ ndị yiri afụfa ọhịa, dị n’ahịrị abụọ, a wụkọtara ha na oké osimiri ahụ.
4 A dọkwasịrị ya n’elu oké ehi iri na abụọ,+ atọ chere ihu n’ebe ugwu, atọ echee ihu n’ebe ọdịda anyanwụ, atọ echee ihu na ndịda, atọ echeekwa ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ; oké osimiri ahụ dọkwa n’elu ha, ha niile dụnyere úkwù n’ime.+
5 Igbidi ya hà ka uhiè ọbụ aka; a rụrụ ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko, dị ka okooko lili.+ Ọ bụ ihe e ji awụnye mmiri nke pụrụ ịba+ puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat+ atọ.
6 Ọ rụkwara efere iri, ọ dọsara ise n’aka nri, dọsa ise n’aka ekpe,+ ka e were ha na-asa ihe.+ Ọ bụ ihe ndị metụtara àjà nsure ọkụ+ ka a na-asa na ha. Ma oké osimiri ahụ bụ ka ndị nchụàjà jiri ya na-asa ahụ́.+
7 O wee jiri ọlaedo rụọ ihe ndọba oriọna.+ Ha dị iri ma yie ibe ha.+ O wee dọba ha n’ụlọ nsọ, ise n’aka nri, ise n’aka ekpe.+
8 Ọ rụkwara tebụl iri ma dọba ha n’ụlọ nsọ ahụ, ise n’aka nri, ise n’aka ekpe,+ ọ rụkwara otu narị ọkwá ọlaedo.
9 O wee rụọ ogige+ maka ndị nchụàjà,+ rụọkwa nnukwu ogige+ nakwa ibo ụzọ maka nnukwu ogige ahụ, wee jiri ọla kọpa machie ibo ụzọ ha.
10 Ọ dọsara oké osimiri ahụ n’akụkụ aka nri, n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ebe ndịda ya.+
11 N’ikpeazụ, Haịram rụrụ ite+ na shọvel+ na ọkwá dị iche iche.+
Haịram wee rụchaa ọrụ ọ nọ na-arụrụ Eze Sọlọmọn n’ụlọ ezi Chineke.
12 Ogidi+ abụọ ahụ na ihe ndị ahụ dị okirikiri a kpụkwasịrị n’elu+ ogidi abụọ ahụ na ihe abụọ ahụ a kpara akpa+ iji kpuchie ihe abụọ ahụ dị okirikiri a kpụkwasịrị n’elu ogidi ndị ahụ
13 na narị mkpụrụ pọmigranet+ anọ ahụ maka ihe abụọ ahụ a kpara akpa, ahịrị abụọ nke mkpụrụ pọmigranet maka nke ọ bụla n’ime ihe ahụ a kpara akpa iji kpuchie ihe abụọ ahụ dị okirikiri a kpụkwasịrị n’elu ogidi+ ndị ahụ,
14 tinyere ihe iri ahụ e ji ebu ihe+ na efere iri+ ahụ dị n’elu ihe ndị ahụ e ji ebu ihe;
15 oké osimiri+ ahụ na oké ehi iri na abụọ+ ahụ dị n’okpuru ya,
16 tinyere ite na shọvel+ na ndụdụ+ nakwa arịa+ ha niile, ka Haịram-ebiv+ ji ọla kọpa na-egbuke egbuke rụọrọ Eze Sọlọmọn maka ụlọ Jehova.
17 Ọ bụ n’Ógbè Jọdan, n’ala ụrọ nke dị n’agbata Sọkọt na Zereda,+ ka eze nọ kpụọ ha.
18 Sọlọmọn mere arịa a niile ka ha dị nnọọ ọtụtụ, n’ihi na a mataghị ịdị arọ nke ọla kọpa ahụ.+
19 Sọlọmọn wee rụọ arịa+ niile dị n’ụlọ ezi Chineke na ebe ịchụàjà e ji ọlaedo mee+ na tebụl+ ndị achịcha a na-eche n’ihu Chineke na-adị n’elu ha,
20 na ihe ndọba oriọna+ na oriọna+ ha ndị e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee, iji na-amụnye ha ọkụ n’ihu ọnụ ụlọ dị n’ime ime,+ dị ka ụkpụrụ e nyere si dị;
21 tinyere okooko ya na oriọna ya na ihe ndị e ji asọnyụ ọkụ,+ bụ́ ndị e ji ọlaedo mee, (ọ bụ ọlaedo a na-agwaghị agwa,)
22 na ihe ndị e ji emenyụ ọkụ na ọkwá na iko na ihe ịgụ ọkụ, bụ́ ndị e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee,+ na ọnụ ụzọ ụlọ ahụ,+ ibo ụzọ ime ya maka Ebe Kasị Nsọ na ibo ụzọ+ ụlọ nsọ ahụ, bụ́ ndị e ji ọlaedo rụọ.