2 Ihe E Mere 35:1-27
35 Josaya+ wee meere Jehova ememme ngabiga+ na Jeruselem, ha wee gbuo anụ ememme ngabiga+ n’abalị iri na anọ+ n’ọnwa mbụ.+
2 O wee mee ka ndị nchụàjà gaa rụwa ọrụ ha,+ ọ gbakwara ha ume+ ka ha na-eje ozi n’ụlọ Jehova.+
3 O wee gwa ndị Livaị, bụ́ ndị na-ezi Izrel dum ihe,+ ndị dị nsọ bụ́ ndị dịịrị Jehova, sị: “Debenụ Igbe ahụ dị nsọ+ n’ụlọ ahụ+ Sọlọmọn nwa Devid eze Izrel wuru; unu agakwaghị na-ebu ya n’ubu unu.+ Jewerenụ+ Jehova bụ́ Chineke unu na ndị ya bụ́ Izrel ozi.
4 Kwadebekwanụ dị ka ụlọ nna nna unu hà si dị,+ n’ìgwè unu dị iche iche,+ dị ka ihe Devid eze Izrel dere si dị+ nakwa dị ka ihe Sọlọmọn nwa ya dere si dị.+
5 Guzorokwanụ+ n’ebe nsọ n’ìgwè n’ìgwè dị ka ụlọ nna nna unu hà si dị maka ụmụnne unu, bụ́ ụmụ Izrel, nakwa maka ọnụmara dị iche iche+ nke ndị Livaị.+
6 Gbuokwanụ anụ ememme ngabiga+ ma doo onwe unu nsọ,+ kwadebekwanụ maka ụmụnne unu ka unu wee mee dị ka ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Mozis si dị.”+
7 Josaya wee nye ụmụ Izrel ụmụ ebule na ụmụ mkpi dị puku iri atọ, ka ha niile bụrụ anụ ememme ngabiga maka ndị niile bịaranụ. O nyekwara ha puku ehi atọ.+ Ha niile si n’akụ̀ eze.+
8 Ndị o mere ndị isi+ nyere ụmụ Izrel onyinye afọ ofufo,+ nyekwa ndị nchụàjà na ndị Livaị. Hilkaya+ na Zekaraya na Jehayel, bụ́ ndị ndú n’ụlọ ezi Chineke, nyere ndị nchụàjà ụmụ ewu na ụmụ atụrụ dị puku abụọ na narị isii, tinyere narị ehi atọ, ka ha bụrụ anụ ememme ngabiga.
9 Konanaya na Shemaya na Netanel bụ́ ụmụnne ya na Hashabaya na Jeayel na Jozabad, bụ́ ndị isi ndị Livaị, nyere ndị Livaị ụmụ ewu na ụmụ atụrụ dị puku ise, tinyere narị ehi ise, ka ha bụrụ anụ ememme ngabiga.
10 A kwadebere maka ozi ahụ,+ ndị nchụàjà guzokwa+ n’ebe ha kwesịrị iguzo,+ ndị Livaị guzokwa n’ìgwè ha dị iche iche,+ dị ka eze nyere n’iwu.+
11 Ha wee gbuo anụ ememme ngabiga ahụ,+ ndị nchụàjà+ wee fesa+ ọbara ya, bụ́ nke ha bunyere ha, n’elu ebe ịchụàjà, ka ndị Livaị nọ na-agba ha akpụkpọ.+
12 Ha kwadebekwara anụ àjà nsure ọkụ ahụ iji buru ha bunye ìgwè dị iche iche+ dị ka ọnụmara ha si dị,+ bụ́ ụmụ Izrel, ka ha wee chee ha n’ihu+ Jehova dị ka ihe e dere n’akwụkwọ Mozis si dị;+ otú ahụ ka ha mekwara ehi ndị ahụ.
13 Ha wee sie+ anụ àjà ememme ngabiga+ ahụ n’ọkụ dị ka a na-eme; ha jikwa ite e ji esi nri na ite ikè ha dị okirikiri nakwa ite na-enweghị afọ sie ihe ndị e mere ka ha dị nsọ.+ E mesịa, ha buteere ya ụmụ Izrel niile ọsọ ọsọ.+
14 Mgbe nke a gasịrị, ha kwadebeere onwe ha anụ àjà ngabiga, kwadebekwara ndị nchụàjà,+ n’ihi na ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn, nọ na-achụ anụ àjà nsure ọkụ+ nakwa abụba+ ha n’àjà ruo abalị. Ndị Livaị kwadebekwaara+ onwe ha, kwadebekwara ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn.
15 Ndị ọbụ abụ,+ bụ́ ụmụ Esaf,+ nọ n’ọrụ ha dị ka Devid+ na Esaf+ na Himan+ na Jedutọn+ bụ́ onye ọhụụ+ eze nyere n’iwu; ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ nọkwa n’ọnụ ụzọ ámá dị iche iche.+ Ọ dịghị mkpa ka ha hapụ ọrụ ha, n’ihi na ụmụnne ha, bụ́ ndị Livaị, kwadebeere+ ha anụ àjà ngabiga.
16 N’ụbọchị ahụ, a kwadebere ọrụ niile metụtara ozi Jehova iji mee ememme ngabiga+ ahụ nakwa iji chụọ àjà nsure ọkụ n’ebe ịchụàjà Jehova, dị ka Eze Josaya nyere n’iwu.+
17 Ụmụ Izrel bịaranụ wee mee ememme ngabiga+ n’oge ahụ, meekwa ememme achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+
18 E metụbeghị ememme ngabiga yiri ya n’Izrel kemgbe ụbọchị Samuel onye amụma,+ ọ dịbeghịkwa eze ọ bụla+ n’ime ndị eze Izrel mere ememme ngabiga yiri nke ahụ Josaya na ndị nchụàjà na ndị Livaị nakwa Juda na Izrel dum bịaranụ, tinyere ndị bi na Jeruselem, mere.
19 Ọ bụ n’afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya ka e mere ememme ngabiga a.+
20 Mgbe ihe a dum gasịrị, mgbe Josaya dozichara ụlọ ahụ, Niko+ bụ́ eze Ijipt+ bịara ibuso Kakemish+ nke dị n’ikpere osimiri Yufretis agha. Josaya+ wee gaa ibuso ya agha.+
21 O wee zigara ya ndị ozi, sị: “Eze Juda, gịnị jikọrọ mụ na gị? Ọ bụghị gị ka m bịara ibuso agha taa, kama ọ bụ ụlọ ọzọ ka m bịara ịlụso ọgụ, n’ihi na Chineke gwara m ka m menye ya ụjọ. Laghachi maka ndụ gị n’ihi Chineke, bụ́ onye nọnyeere m, ka ọ ghara ịla gị n’iyi.”+
22 Ma Josaya esighị n’ebe ọ nọ pụọ,+ kama o jigharịrị ejiji iji buso ya agha,+ o geghịkwa ntị n’ihe Niko+ kwuru, bụ́ nke si n’ọnụ Chineke. O wee bịa ibuso ya agha na ndagwurugwu Megido.+
23 Ndị na-agba ụta+ wee gbata Eze Josaya akụ́, eze wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Kutuonụ m, n’ihi na a gbarụwo m ahụ́.”+
24 Ndị na-ejere ya ozi wee si n’ụgbọ ịnyịnya ahụ kutuo ya ma jiri ụgbọ ịnyịnya agha ya nke abụọ bute ya na Jeruselem.+ O wee nwụọ,+ e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà;+ Juda na Jeruselem dum wee ruoro Josaya uju.+
25 Jeremaya+ wee malite ịbụrụ Josaya abụ iru uju;+ ndị ikom niile na-abụ abụ na ndị inyom+ niile na-abụ abụ wee jiri Josaya na-abụ abụ iru uju ruo taa; ha mekwara ka ọ bụrụ ihe a ga na-eme n’Izrel, lee, e dere ya n’akwụkwọ abụ iru uju.+
26 Ma ihe ndị ọzọ metụtara+ Josaya na obiọma* ya,+ dị ka ihe e dere n’iwu+ Jehova si dị,
27 na ihe ndị o mere, ndị mbụ na ndị ikpeazụ,+ lee, e dere ha n’Akwụkwọ+ Ndị Eze Izrel na Juda.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”