2 Ihe E Mere 34:1-33

34  Josaya+ gbara afọ asatọ+ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri atọ na otu na Jeruselem.+  O wee mee ihe ziri ezi n’anya Jehova,+ jeekwa ije n’ụzọ Devid bụ́ nna nna ya jere;+ ọ hapụghị ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+  N’afọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ nwata,+ ọ malitere ịchọ+ Chineke Devid nna nna ya. N’afọ nke iri na abụọ, ọ malitekwara ikpochapụ+ ebe ndị dị elu+ na ogwe osisi dị nsọ+ na ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ na Juda na Jeruselem.  Ha kwatukwara ebe ịchụàjà+ Bel+ n’ihu ya; o gbutukwara ihe e ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ ndị dị n’elu ha; ọ kụjisịkwara ogwe osisi dị nsọ+ na ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ ma gwerie ha,+ ha aghọọ ntụ. O wee fesaa ya n’elu ili nke ndị na-achụburu ha àjà.+  Ọ kpọkwara ọkpụkpụ+ ndị nchụàjà ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ha.+ O wee mee ka Juda na Jeruselem dị ọcha.  N’obodo ndị dị na Manase+ na Ifrem+ na Simiọn ruo Naftalaị nakwa n’ebe niile a lara n’iyi,  ọ kwatukwara ebe ịchụàjà+ ha dị iche iche na ogwe osisi ha dị nsọ.+ Ọ kụrisịkwara ihe oyiyi a pịrị apị+ ma gwerie ha.+ O gbutukwara ihe niile e ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ ndị dị n’ala Izrel dum. E mesịa, ọ lọtara Jeruselem.  N’afọ nke iri na asatọ+ nke ọchịchị ya, mgbe o mesịrị ka ala ahụ na ụlọ ahụ dị ọcha, o ziri Shefan+ nwa Azalaya na Measaya onyeisi obodo na Joa nwa Joahaz onye na-edekọ ihe ka ha gaa rụzie+ ụlọ Jehova bụ́ Chineke ya.  Ha wee bịakwute Hilkaya+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà wee nye ya ego a na-eweta n’ụlọ Chineke, nke ndị Livaị bụ́ ndị nche ọnụ ụzọ+ nwetara n’aka ebo Manase+ na Ifrem+ nakwa n’aka ndị Izrel ndị ọzọ+ nakwa Juda na Benjamin dum na ndị bi na Jeruselem. 10  Ha wee nyefee ya ndị ahụ na-arụ ọrụ, bụ́ ndị a họpụtara ilekọta ụlọ Jehova.+ Ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova wee jiri ya rụzie ma dozie ụlọ ahụ. 11  Ha wee nye ya ndị omenkà na ndị na-ewu ụlọ+ ka ha jiri ya zụta nkume a wara awa+ na osisi a ga-eji jikọta ihe nakwa ka ha jiri osisi rụzie ụlọ niile ndị eze+ Juda hapụrụ ka ha bibie. 12  Ndị ikom ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi+ na-arụ ọrụ ahụ. A họpụtara Jehat na Obedaya bụ́ ndị Livaị, ndị si n’agbụrụ Meraraị,+ tinyere Zekaraya na Meshọlam, bụ́ ndị si n’agbụrụ Kohat,+ ka ha bụrụ ndị nlekọta ha. Ndị Livaị, ndị onye ọ bụla n’ime ha bụ ọkà n’ịkpọ ngwá egwú,+ 13  bụ ndị isi nke ndị na-ebu ibu,+ bụrụkwa ndị nlekọta+ nke ndị niile na-arụ ọrụ dị iche iche. E nwekwara ndị Livaị+ bụ́ ndị odeakwụkwọ+ na ndị isi na ndị nche ọnụ ụzọ ámá.+ 14  Ka ha nọ na-ewepụta ego+ a na-eweta n’ụlọ Jehova, Hilkaya+ onye nchụàjà hụrụ akwụkwọ+ iwu Jehova,+ nke o nyere site n’aka Mozis.+ 15  Hilkaya wee gwa Shefan+ bụ́ odeakwụkwọ, sị: “Ahụrụ m akwụkwọ iwu a n’ụlọ Jehova.” Hilkaya wee nye Shefan akwụkwọ ahụ. 16  Shefan wee wetara eze akwụkwọ ahụ, gwakwa eze, sị: “Ndị ohu gị na-arụ ọrụ niile a gwara ha ka ha rụọ. 17  Ha wee wụpụta ego e nwetara n’ụlọ Jehova wee nyefee ya ndị ikom ahụ a họpụtara nakwa ndị ahụ na-arụ ọrụ.”+ 18  Shefan bụ́ odeakwụkwọ wee gaa n’ihu ịkọrọ eze, sị: “E nwere akwụkwọ+ Hilkaya onye nchụàjà nyere m.”+ Shefan wee malite ịgụpụta ya n’ihu eze.+ 19  O wee ruo na ngwa ngwa eze nụrụ ihe e kwuru n’iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya ozugbo.+ 20  Eze wee nye Hilkaya+ na Ahaịkam+ nwa Shefan na Abdọn nwa Maịka na Shefan+ bụ́ odeakwụkwọ+ nakwa Asaya+ bụ́ onye na-ejere eze ozi iwu, sị: 21  “Gaanụ jụọ Jehova ase+ n’aha m+ nakwa n’aha ihe fọdụrụ n’Izrel nakwa na Juda banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ a+ a hụrụ, n’ihi na ọnụma Jehova+ nke ọ ga-awụkwasị anyị dị ukwuu n’ihi na nna nna anyị hà emeghị ihe Jehova kwuru, ha emeghị ihe niile e dere n’akwụkwọ a.”+ 22  Hilkaya na ndị ahụ eze kpọrọ aha wee gakwuru Họlda+ onye amụma nwaanyị,+ bụ́ nwunye Shalọm nwa Tikva nwa Hahas onye na-elekọta uwe,+ mgbe o bi na Jeruselem n’ógbè nke abụọ; ha wee gwa ya okwu a. 23  Nwaanyị ahụ wee sị ha: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwute m, sị: 24  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi+ dakwasị obodo a na ndị bi n’ime ya,+ bụ́ ọbụbụ ọnụ niile+ e dere n’akwụkwọ ahụ ha gụrụ n’ihu eze Juda,+ 25  n’ihi na ha ahapụwo m+ wee gaa na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ ka ha wee jiri ọrụ aka ha niile+ kpasuo m iwe,+ ka m wee wụkwasị obodo a ọnụma m,+ a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’”+ 26  Ma Eze Juda, bụ́ onye zitere unu ịjụ Jehova ase, unu ga-asị ya: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru,+ ‘Banyere okwu ahụ ị nụrụ,+ 27  ebe ọ bụ na obi gị+ dị nro, i wee weda onwe gị ala+ n’ihi Chineke mgbe ị nụrụ ihe o kwuru banyere obodo a na ndị bi n’ime ya, i wedakwara onwe gị ala n’ihu m+ ma dọwaa+ uwe gị, kwaa ákwá n’ihu m, mụ onwe m anụwo ya,+ ka Jehova kwuru. 28  Lee, m ga-eme ka e lie gị dị ka e liri nna nna gị hà, a ga-elikwa gị n’ili gị n’oge udo,+ anya gị agaghịkwa ahụ ọdachi+ dum m ga-eme ka ọ dakwasị obodo a na ndị bi n’ime ya.’”’”+ Ha wee gwa eze ihe ha jetara. 29  Eze wee zie ozi kpọkọta ndị okenye niile nke Juda nakwa Jeruselem.+ 30  Eze na ndị ikom niile nke Juda na ndị bi na Jeruselem na ndị nchụàjà+ na ndị Livaị nakwa mmadụ niile, ndị nta na ndị ukwu, wee gbagoro n’ụlọ Jehova;+ o wee malite ịgụ+ ná ntị ha ihe niile e dere n’akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ nke a hụrụ n’ụlọ Jehova.+ 31  Eze wee guzoro ebe ahụ o guzo+ ṅụọ iyi+ n’ihu Jehova na ha ga na-eso Jehova, na ha ga-ejikwa obi ha dum+ na mkpụrụ obi ha dum+ na-edebe ihe o nyere n’iwu+ na ihe àmà+ ya na ụkpụrụ+ ya, na ha ga na-edebekwa+ ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ e dere n’akwụkwọ a.+ 32  O mekwara ka ndị niile nọ na Jeruselem nakwa na Benjamin kwado ihe o kwuru. Ndị bi na Jeruselem wee mee dị ka ọgbụgba ndụ ha na Chineke, bụ́ Chineke nna nna ha, si dị.+ 33  E mesịa, Josaya wepụrụ ihe arụ+ niile dị n’ala niile nke ụmụ Izrel.+ O mekwara ka ndị niile nọ n’Izrel malite ije ozi, ya bụ, ijere Jehova bụ́ Chineke ha ozi. N’ụbọchị ya niile, ha akwụsịghị iso Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji