2 Ihe E Mere 32:1-33
32 Mgbe Hezekaya mesịrị ihe ndị a, meekwa omume ikwesị ntụkwasị obi a,+ Senakerib+ eze Asiria+ bịara wakpo Juda, maakwa ụlọikwuu iji buso obodo ndị e wusiri ike agha,+ o bukwa n’obi ime ka ha bụrụ nke ya site n’imeri ha.
2 Mgbe Hezekaya hụrụ na Senakerib abịawo wee kpebisie ike+ ibuso Jeruselem agha,
3 ya na ndị o mere ndị isi+ na ndị dike ya kpebiri ikpochi iyi ha ndị dị ná mpụga obodo ahụ;+ ha wee nyere ya aka.
4 Ya mere, a kpọkọtara ọtụtụ ndị, ha wee sụchie isi mmiri niile, kpochiekwa iyi+ na-asọfe n’etiti ala ahụ, wee sị: “Gịnị mere ndị eze Asiria ga-eji bịa wee hụ mmiri buru ibu?”
5 O nwekwara obi ike wee wuzie mgbidi dum a kwaturu akwatu+ ma wuo ụlọ nche+ n’elu ya. O wukwara mgbidi ọzọ n’ihu nke ochie,+ rụziekwa Milo*+ nke dị n’Obodo Devid. Ọ rụkwara ọtụtụ ube+ na ọta.+
6 O wee họpụta ndị ọchịagha+ ga-achị ndị ya wee kpọkọta ha n’ámá obodo+ nke dị n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, o wee gwa ha okwu ruru ha n’obi,+ sị:
7 “Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Unu atụla egwu,+ unu atụkwala ụjọ+ n’ihi eze Asiria+ nakwa n’ihi ìgwè mmadụ so ya;+ n’ihi na ndị nọnyeere anyị karịrị ndị nọnyeere ya.
8 Ogwe aka nke nọnyeere ya bụ anụ ahụ́,+ ma, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyeere anyị inyere anyị aka+ na iburu anyị agha.”+ Ha wee malite inwe obi ike n’ihi ihe Hezekaya eze Juda kwuru.+
9 Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Senakerib+ eze Asiria zigara ndị na-ejere ya ozi Jeruselem, mgbe ya onwe ya na ndị agha ya niile+ nọ na Lekish,+ ka ha gwa Hezekaya eze Juda na ndị Judia niile bi na Jeruselem, sị:
10 “Nke a bụ ihe Senakerib eze Asiria kwuru,+ ‘Ọ̀ bụ gịnị ka unu tụkwasịrị obi mere unu ji nọrọ jụụ na Jeruselem+ bụ́ ebe a nọchibidoro unu anọchibido?
11 Ọ̀ bụ na Hezekaya+ adịghị arafu+ unu ka o wee mee ka ụnwụ na akpịrị ịkpọ nkụ gbuo unu, na-asị: “Jehova bụ́ Chineke anyị ga-anapụta anyị n’aka eze Asiria”?+
12 Ọ́ bụghị Hezekaya wepụrụ ebe ndị dị elu ya+ na ebe ịchụàjà ya+ wee gwa Juda na Jeruselem, sị: “N’ihu otu ebe ịchụàjà+ ka unu ga na-akpọ isiala,+ ọ bụkwa n’elu ya ka unu ga na-esure ihe nsure ọkụ”?+
13 Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe mụ onwe m na nna nna m hà mere ndị niile bi n’ala dị iche iche?+ Chi dị iche iche+ nke mba ndị dị n’ala ndị ahụ hà napụtaliri ala ha n’aka m?
14 Ole nke n’ime chi niile nke mba ndị a nna nna m hà bibiri napụtaliri ndị ya n’aka m, mere Chineke unu ga-eji nwee ike ịnapụta unu n’aka m?+
15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu+ ma ọ bụ si otú a rafuo unu,+ unu atụkwasịkwala ya obi, n’ihi na ọ dịghị chi mba ọ bụla ma ọ bụ chi alaeze ọ bụla nwere ike ịnapụta ndị ya n’aka m nakwa n’aka nna nna m hà, ma ya fọdụzie Chineke unu ịnapụta unu n’aka m!’”+
16 Ndị na-ejere ya ozi kwukwara okwu ọjọọ banyere Jehova bụ́ ezi Chineke+ na Hezekaya ohu ya.
17 O dekwara akwụkwọ ozi+ iji kọchaa Jehova bụ́ Chineke Izrel+ na iji kparịa ya, sị: “Dị ka chi dị iche iche+ nke mba ndị dị n’ala ndị ahụ na-anapụtaghị ndị ha n’aka m,+ otú ahụ ka Chineke Hezekaya na-agaghị anapụta ndị ya n’aka m.”
18 Ha+ wee jiri oké olu+ na-agwa ndị Jeruselem nọ ná mgbidi okwu n’asụsụ ndị Juu+ iji menye ha egwu+ na iji kowe ha obi n’elu, ka ha wee weghara obodo ahụ.
19 Ha wee na-ekwu okwu ọjọọ+ banyere Chineke nke Jeruselem+ n’otu ụzọ ahụ ha si ekwu okwu ọjọọ banyere chi dị iche iche nke ndị bi n’ụwa, ndị bụ́ aka ọrụ mmadụ.+
20 Ma Hezekaya+ bụ́ eze na Aịzaya+ nwa Emọz,+ bụ́ onye amụma,+ nọ na-ekpe ekpere n’ihi ihe a,+ na-akpọku Chineke nke bi n’eluigwe maka enyemaka.+
21 Jehova wee ziga otu mmụọ ozi+ wee kpochapụ ndị dimkpa bụ́ dike+ na ndị ndú na ndị isi niile n’ebe eze Asiria mara ụlọikwuu,+ nke mere na o ji ihere laghachi n’ala ya. E mesịa, ọ banyere n’ụlọ chi ya, ụfọdụ n’ime ụmụ ya wee were mma agha gbuo ya n’ebe ahụ.+
22 Jehova wee si otú a zọpụta Hezekaya na ndị bi na Jeruselem n’aka Senakerib eze Asiria+ nakwa n’aka ndị niile ọzọ, nyekwa ha ezumike gburugburu.+
23 Ọtụtụ ndị nọ na-ewetara Jehova onyinye+ na Jeruselem, na-ewetakwara Hezekaya eze Juda ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.+ O wee dị elu+ n’anya mba niile mgbe nke ahụ gasịrị.
24 N’oge ahụ, Hezekaya dara ọrịa ruo n’ọnụ ọnwụ.+ O wee malite ikpeku Jehova ekpere,+ bụ́ onye gwara ya okwu+ ma nye ya ihe àmà.+
25 Ma Hezekaya emeghị ihe dị ka ihe ọma e meere ya si dị,+ n’ihi na obi ya dị mpako.+ E wee weso ya iwe,+ wesokwa Juda na Jeruselem.
26 Otú ọ dị, Hezekaya wedara onwe ya ala+ wee kwụsị ịdị mpako n’obi, ya na ndị bi na Jeruselem. Iwe Jehova abịakwasịghịkwa ha n’ụbọchị Hezekaya.+
27 Hezekaya wee nwee akụnụba na ebube nke ukwuu;+ o wukwaara onwe ya ụlọ nkwakọba ihe maka ịkwakọba ọlaọcha na ọlaedo+ na nkume dị oké ọnụ ahịa+ na mmanụ bọlsọm+ na ọta+ na ihe niile a na-achọsi ike;+
28 wuokwa ebe ichekwa+ ọka* na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ ha wetara n’ubi. O wukwara ụlọ anụ+ maka ụdị anụmanụ niile nakwa ụlọ ìgwè ewu na atụrụ.
29 O wukwaara onwe ya obodo dị iche iche, nwetakwa ìgwè ewu na atụrụ+ nakwa ìgwè ehi+ dị ukwuu; n’ihi na Chineke nyere ya ọtụtụ ihe onwunwe.+
30 Ọ bụ Hezekaya sụchiri+ ebe mmiri Gaịhọn+ si erudata,+ nke dị n’ebe mgbago, ma mee ka ọ sọrọ gaa n’ebe ọdịda anyanwụ n’Obodo Devid.+ Hezekaya wee na-enwe ihe ịga nke ọma n’ihe ọ bụla ọ na-eme.+
31 O wee ruo na mgbe ndị isi Babịlọn+ zitere ndị bụ́ ọnụ na-ekwuru ha ka ha jụọ ya+ banyere ihe àmà+ ahụ mere n’ala ya, ezi Chineke hapụrụ ya+ iji lee ya ule,+ iji mara ihe niile dị ya n’obi.+
32 Ma ihe ndị ọzọ metụtara+ Hezekaya na obiọma* ya,+ lee, e dere ha n’ọhụụ Aịzaya onye amụma, bụ́ nwa Emọz,+ n’Akwụkwọ+ Ndị Eze Juda na Izrel.
33 N’ikpeazụ, Hezekaya sooro nna nna ya hà+ dinaa, ha wee lie ya n’ebe e si agbago n’ebe a na-eli ụmụ Devid;+ Juda niile na ndị bi na Jeruselem kwanyeere ya ùgwù mgbe ọ nwụrụ.+ Manase+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mkputamkpu ala.”
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”