2 Ihe E Mere 31:1-21

31  Ozugbo ha mechara ihe a dum, ndị Izrel niile+ nọ n’ebe ahụ gara n’obodo ndị dị na Juda.+ Ha wee kụrisịa ogidi nsọ dị iche iche,+ gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ+ ma kwatuo ebe ndị dị elu+ na ebe ịchụàjà+ ndị dị na Juda+ na Benjamin dum nakwa n’Ifrem+ na Manase+ ruo mgbe ha mechara. E mesịa, ụmụ Izrel niile laghachiri n’obodo ha, onye nke ọ bụla n’ihe nketa ya.  Hezekaya wee kee ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè,+ keekwa ndị Livaị+ n’ìgwè n’ìgwè, ìgwè nke ọ bụla dị ka ọrụ ọ na-arụrụ ndị nchụàjà+ si dị nakwa dị ka ọrụ ọ na-arụrụ ndị Livaị+ n’ihe metụtara àjà nsure ọkụ+ na àjà udo+ si dị, ka ha wee na-eje ozi,+ na-enyekwa ekele+ na otuto+ n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ nsọ Jehova.  E nwekwara ihe ndị eze si n’akụ̀ ya+ nye maka àjà nsure ọkụ,+ maka ịchụ àjà nsure ọkụ a na-achụ n’ụtụtụ+ nakwa ná mgbede, nakwa àjà nsure ọkụ a na-achụ n’ụbọchị izu ike,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ nakwa n’oge ememme,+ dị ka ihe e dere n’iwu Jehova si dị.+  Ọ gwakwara ndị mmadụ, bụ́ ndị bi na Jeruselem, ka ha na-eweta òkè dịịrị ndị nchụàjà+ na ndị Livaị,+ ka ha wee na-edebezu+ iwu Jehova.+  Ozugbo a kpọsara okwu ahụ, ụmụ Izrel+ wetakwuru ọka,*+ mmanya ọhụrụ+ na mmanụ+ na mmanụ aṅụ,+ bụ́ ndị si ná mkpụrụ mbụ ha, tinyere mkpụrụ niile si n’ubi.+ Ha wetakwara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile n’ụba.+  Ọbụna ụmụ Izrel na ụmụ Juda ndị bi n’obodo ndị dị na Juda+ wetara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ehi na atụrụ nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị dị nsọ,+ bụ́ ihe ndị e doro nsọ nye Jehova bụ́ Chineke ha. Ha wetara ha wee tụọ ha n’ikpo n’ikpo.  N’ọnwa nke atọ,+ ha malitere ịtụ ha n’ikpo n’ikpo site n’ịtụ ikpo nke kasị nta, ha tụkọtachara ya n’ọnwa nke asaa.+  Mgbe Hezekaya na ndị isi+ bịara hụ ikpo ndị ahụ, ha gọziri+ Jehova na ndị ya bụ́ Izrel.+  Ka oge na-aga, Hezekaya jụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị banyere ikpo ndị ahụ.+ 10  Azaraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà, onye si n’ụlọ Zedọk,+ sịrị ya, ee, ọ sịrị: “Kemgbe a malitere iweta onyinye+ n’ụlọ Jehova, a na-eri nri na-eriju afọ,+ na-erifọkwa ihe buru ibu;+ n’ihi na Jehova agọziwo ndị ya,+ nnukwu ihe a bụkwa ihe fọrọ afọ.” 11  Hezekaya wee kwuo ka e dozie ụlọ iri ihe+ ndị dị n’ụlọ Jehova. Ha wee dozie ha. 12  Ha wee jiri ikwesị ntụkwasị obi+ na-eweta onyinye+ na otu ụzọ n’ụzọ iri+ na ihe ndị dị nsọ; ọ bụ Konanaya bụ́ onye Livaị na-ahụ maka ha dị ka onye ndú. Shimiaị nwanne ya bụ onye nke abụọ. 13  Jehayel na Azazaya na Nehat na Asahel na Jerimọt na Jozabad na Iliel na Ismakaya na Mehat na Benaya bụ ndị nlekọta, ndị ha na Konanaya na Shimiaị nwanne ya na-arụkọ ọrụ, dị ka ihe Hezekaya bụ́ eze nyere n’iwu si dị. Ọ bụkwa Azaraya+ bụ onye ndú n’ụlọ ezi Chineke. 14  Kore nwa Imna, onye Livaị, bụ onye nche ọnụ ụzọ ámá+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ nke na-ahụ maka onyinye afọ ofufo+ ndị e nyere ezi Chineke, ikesa onyinye e nyere Jehova+ na ihe ndị kasị nsọ.+ 15  Ndị nọ n’okpuru ya bụ Iden na Minayamin na Jeshụa na Shemaya, Amaraya na Shekanaya, bụ́ ndị nọ n’obodo dị iche iche nke ndị nchụàjà. Ha na-arụ ọrụ nke ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na-arụ,+ bụ́ ikesara ụmụnne ha ihe n’ìgwè ha dị iche iche,+ ma onye ukwu ma onye nta;+ 16  n’agụnyeghị ụmụ nwoke ndị e debara aha ha n’akwụkwọ usoro ọmụmụ,+ malite ná ndị gbara afọ atọ gbagowe,+ bụ́ ndị niile na-abịa n’ụlọ Jehova kwa ụbọchị, maka ịrụ ọrụ dịịrị ha dị ka ìgwè ha dị iche iche si dị. 17  Ọ bụ ndị a bụ ndị nchụàjà e debara aha ha n’akwụkwọ usoro ọmụmụ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị+ nakwa ndị Livaị e debara aha ha n’akwụkwọ,+ malite ná ndị gbara afọ iri abụọ+ gbagowe, dị ka ọrụ ìgwè ha na-arụ si dị;+ 18  e debakwara aha ụmụntakịrị ha niile, ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’akwụkwọ usoro ọmụmụ, ya bụ, ọgbakọ ahụ dum, n’ihi na ha doro onwe ha nsọ+ maka ọrụ dị nsọ ha na-arụ, bụ́ nke ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na-arụ;+ 19  nakwa ụmụ Erọn,+ bụ́ ndị nchụàjà, ndị bi n’ala+ ịta ahịhịa nke obodo ha dị iche iche. N’obodo niile, e nwere ndị ikom a kpọrọ aha, ka ha na-enye nwoke ọ bụla n’etiti ndị nchụàjà òkè ya, na-enyekwa ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ usoro ọmụmụ n’etiti ndị Livaị òkè ha. 20  Hezekaya wee mee otú a na Juda dum, o wee na-eme ihe dị mma+ na ihe ziri ezi+ na ihe kwesịrị ntụkwasị obi+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke ya. 21  O ji obi ya dum+ rụọ ọrụ niile ọ malitere ịrụ n’ihe metụtara ozi a na-eje+ n’ụlọ ezi Chineke nakwa n’ihe metụtara iwu ahụ+ na ntụziaka, iji chọọ+ Chineke ya, ihe gakwaara ya nke ọma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.