2 Ihe E Mere 29:1-36

29  Hezekaya+ ghọrọ eze mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise, ọ chịkwara afọ iri abụọ na itoolu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Abaịja, ada Zekaraya.+  O wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova,+ dị ka ihe niile Devid nna nna ya mere si dị.+  Ọ bụ ya meghere ọnụ ụzọ nke ụlọ Jehova n’afọ mbụ nke ọchịchị ya, n’ọnwa nke mbụ, wee malite ịrụzi ha.+  O wee kpọọ ndị nchụàjà na ndị Livaị, mee ka ha zukọta na mbara èzí,+ n’ebe ọwụwa anyanwụ.  O wee sị ha: “Ụmụ Livaị, geenụ m ntị. Doonụ onwe unu nsọ,+ dookwanụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà nsọ, wepụkwanụ ihe na-adịghị ọcha n’ebe nsọ.+  N’ihi na nna anyị hà mere omume ekwesịghị ntụkwasị obi,+ meekwa ihe jọrọ njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke anyị.+ Ha wee hapụ ya+ ma wepụ ihu ha n’ebe ụlọikwuu Jehova dị,+ gbakụtakwa ya azụ.  Ha mechikwara ọnụ ụzọ+ nke ihe owuwu ụzọ mbata ma menyụọ oriọna dị iche iche.+ Ha esureghịkwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+ Ha achụghịkwara Chineke Izrel àjà nsure ọkụ n’ebe nsọ.+  Jehova wee weso+ Juda na Jeruselem iwe. O wee mee ka ha ghọọ ihe na-akpata ịma jijiji,+ ihe ijuanya+ na ihe a na-afụrụ mkpọrọhịhị,+ dị nnọọ ka unu ji anya unu na-ahụ.  Lee, e ji mma agha gbuo nna nna anyị hà,+ a dọkwaara ụmụ anyị ndị ikom na ụmụ anyị ndị inyom na ndị nwunye anyị n’agha n’ihi nke a.+ 10  Ọ dị m n’obi ka mụ na Jehova bụ́ Chineke Izrel gbaa ndụ,+ ka iwe dị ọkụ ọ na-eweso anyị dajụọ. 11  Ụmụ m, unu adala mbà,+ n’ihi na ọ bụ unu ka Jehova họọrọ ka unu na-eguzo n’ihu ya ijere ya ozi+ nakwa ka unu bụrụ ndị na-ejere ya ozi+ na ndị na-esure ihe nsure ọkụ.”+ 12  Ndị Livaị+ wee bilie, ya bụ, Mehat nwa Amesaị na Joel nwa Azaraya, ndị si n’agbụrụ Kohat;+ na Kish nwa Abdaị na Azaraya nwa Jehalelel, ndị si n’agbụrụ Meraraị;+ na Joa nwa Zima na Iden nwa Joa, ndị si n’agbụrụ Geshọn;+ 13  na Shimraị na Jeyuel, ndị si n’agbụrụ Elizefan;+ na Zekaraya na Matanaya, ndị si n’agbụrụ Esaf;+ 14  na Jehayel na Shimiaị, ndị si n’agbụrụ Himan;+ na Shemaya na Ọziel, ndị si n’agbụrụ Jedutọn.+ 15  Ha wee kpọkọta ụmụnne ha, dookwa onwe ha nsọ+ wee bịa dị ka eze nyere n’iwu, nke bụ́ ihe Jehova kwuru,+ iji mee ka ụlọ Jehova dị ọcha.+ 16  Ndị nchụàjà wee bata n’ụlọ Jehova ime ka ọ dị ọcha. Ha wee kporo ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ n’ụlọ nsọ Jehova kpopụta n’ogige ụlọ Jehova.+ Ndị Livaị wee kporo ha kpoga na ndagwurugwu Kidrọn+ nke dị ná mpụga mpụga. 17  Otú ahụ ka ha si malite ido ihe nsọ n’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, n’abalị asatọ n’ọnwa ahụ, ha rutere n’ihe owuwu ụzọ mbata+ nke ụlọ Jehova; ha wee jiri ụbọchị asatọ doo ụlọ Jehova nsọ, ha mechara n’abalị iri na isii n’ọnwa mbụ.+ 18  E mesịa, ha bịakwutere Hezekaya bụ́ eze wee sị ya: “Anyị emewo ka ụlọ Jehova dum dị ọcha, ebe ịchụàjà+ nke àjà nsure ọkụ na arịa ya niile,+ na tebụl+ nke achịcha a na-edo n’usoro na arịa ya niile.+ 19  Anyị akwadebewo arịa niile+ Eze Ehaz+ wepụrụ n’oge ọ na-achị n’ekwesịghị ntụkwasị obi,+ bụ́ ndị o wepụrụ ka a ghara iji ha na-eme ihe, anyị edowokwa ha nsọ;+ lee, ha dị n’ihu ebe ịchụàjà Jehova.” 20  Hezekaya+ bụ́ eze wee bilie n’isi ụtụtụ+ kpọkọta ndị isi+ obodo wee gbagoo n’ụlọ Jehova. 21  Ha wee kpụta oké ehi asaa na ebule asaa+ na ụmụ ebule asaa na mkpi asaa ka ha bụrụ àjà mmehie+ maka alaeze ahụ na ebe nsọ ahụ nakwa maka Juda. O wee gwa ụmụ Erọn bụ́ ndị nchụàjà+ ka ha chụọ ha n’àjà n’ebe ịchụàjà Jehova. 22  Ha wee gbuo+ oké ehi ndị ahụ. Ndị nchụàjà wee buru ọbara ha+ fesa+ n’elu ebe ịchụàjà ahụ; e mesịa, ha gburu ebule ndị ahụ+ wee fesa ọbara ha+ n’elu ebe ịchụàjà ahụ. Ha gbukwara ụmụ ebule ndị ahụ ma fesa ọbara ha n’elu ebe ịchụàjà. 23  Ha wee kpụta mkpi ndị ahụ+ a ga-eji chụọ àjà mmehie n’ihu eze nakwa n’ihu ọgbakọ ahụ ma bikwasị ha aka.+ 24  Ndị nchụàjà wee gbuo ha, wee were ọbara ha chụọ àjà mmehie n’elu ebe ịchụàjà, iji kpuchiere Izrel dum mmehie ha;+ n’ihi na ọ bụ maka Izrel dum+ ka eze kwuru ka a chụọ àjà nsure ọkụ ahụ na àjà mmehie ahụ.+ 25  Ka nke a na-eme, o mere ka ndị Livaị+ jiri ájà+ na ụbọ akwara+ na une+ guzoro n’ụlọ Jehova, dị ka Devid+ na Gad+ bụ́ onye ọhụụ eze nakwa Netan+ onye amụma nyere n’iwu, n’ihi na ọ bụ Jehova nyere iwu ahụ site n’ọnụ ndị amụma ya.+ 26  Ndị Livaị wee jiri ngwá egwú+ Devid guzoro, ndị nchụàjà jikwa opi+ guzoro. 27  Hezekaya wee kwuo ka a chụọ àjà nsure ọkụ n’elu ebe ịchụàjà; mgbe a malitere ịchụ àjà nsure ọkụ ahụ, a malitere ịbụ abụ+ Jehova, a malitekwara ịfụ opi ndị ahụ ka ha na abụ e ji ngwá egwú Devid eze Izrel na-abụ na-adakọ. 28  Ọgbakọ ahụ dum nọ na-akpọ isiala+ ka a nọ na-abụsi abụ ike+ ma na-afụsi opi ike—a nọ na-eme ihe a dum ruo mgbe a chụsịrị àjà nsure ọkụ ahụ. 29  Ozugbo ha chụsịrị àjà ahụ, eze na ndị niile ya na ha nọ hulatara kpọọ isiala.+ 30  Hezekaya bụ́ eze na ndị isi+ wee gwa ndị Livaị ka ha jiri abụ Devid+ na nke Esaf+ onye ọhụụ too Jehova. Ha wee malite iji ọṅụ+ na-enye otuto, ha wee hulata kpọọ isiala.+ 31  N’ikpeazụ, Hezekaya kwuru, sị: “Ugbu a, unu enwetawo+ ikike ijere Jehova ozi. Werenụ àjà nkịtị+ na àjà ekele+ bịa n’ụlọ Jehova.” Ọgbakọ ahụ wee malite iweta àjà nkịtị na àjà ekele, onye ọ bụla obi ya kpaliri wetakwara àjà nsure ọkụ.+ 32  Anụ àjà nsure ọkụ ọgbakọ ahụ wetara dị ehi iri asaa, otu narị ebule, narị ụmụ ebule abụọ, ha niile bụ anụ àjà nsure ọkụ a chụụrụ Jehova;+ 33  anụ àjà dị nsọ dịkwa narị ehi isii na puku atụrụ atọ. 34  Ma ndị nchụàjà+ dị nnọọ ole na ole, ha enweghịkwa ike ịgba anụ niile ahụ a ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ akpụkpọ.+ Ụmụnne ha+ bụ́ ndị Livaị wee na-enyere ha aka ruo mgbe a rụchara ọrụ ahụ,+ ruokwa mgbe ndị nchụàjà dosịrị onwe ha nsọ,+ n’ihi na obi ndị Livaị ziri ezi+ ido onwe ha nsọ karịa ndị nchụàjà. 35  Anụ àjà nsure ọkụ+ ahụ dịkwa nnọọ ukwuu, tinyere abụba+ anụ a ga-eji chụọ àjà udo+ na àjà ihe ọṅụṅụ+ a ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ ahụ. Ọ bụ otú a ka e si kwadebe maka ọrụ a ga na-arụ n’ụlọ Jehova.+ 36  Hezekaya na mmadụ niile wee ṅụrịa ọṅụ na ezi Chineke nyeere ndị ya aka,+ n’ihi na ihe a mere na mberede.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji