2 Ihe E Mere 28:1-27

28  Ehaz+ gbara afọ iri abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri na isii na Jeruselem,+ o meghịkwa ihe ziri ezi n’anya Jehova dị ka Devid nna nna ya mere.+  Kama o jere ije n’ụzọ ndị eze Izrel jere.+ O mere ọbụna ihe oyiyi dị iche iche a wụrụ awụ+ nke Bel.+  Ya onwe ya surekwara ihe nsure ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ sureekwa ụmụ ya ndị ikom+ n’ọkụ, dị ka ihe arụ+ nke mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel mere si dị.+  Ọ na-achụkwa àjà+ ma na-esure ihe nsure ọkụ mgbe niile n’ebe ndị dị elu+ nakwa n’ugwu nta dị iche iche+ nakwa n’okpuru ụdị osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+  Jehova bụ́ Chineke ya wee nyefee ya n’aka+ eze Siria.+ Ha wee merie ya ma dọrọ ọtụtụ n’ime ndị ya n’agha ma kpụta ha Damaskọs.+ O nyefekwara ya n’aka eze Izrel,+ o wee sụọ ya akwụ.  Pika+ nwa Remalaya+ wee gbuo otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ, ndị bụcha ndị dike, n’otu ụbọchị na Juda, n’ihi na ha hapụrụ Jehova+ bụ́ Chineke ndị nna nna ha.  Zikraị, onye Ifrem bụ́ dike,+ gbukwara Measaya nwa eze na Azraịkam bụ́ onye ndú ezinụlọ ya na Elkena bụ́ onye na-esote eze.  Ụmụ Izrel dọkwaara narị puku abụọ n’ime ụmụnne ha n’agha, ndị inyom, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom; ha bukọọrọ ihe nkwata dị nnọọ ukwuu n’aka ha. E mesịa, ha butere ihe nkwata ndị ahụ na Sameria.+  E nwere onye amụma Jehova nọ n’ebe ahụ nke aha ya bụ Oded. O wee gakwuru ndị agha ahụ na-alọta Sameria wee sị ha: “Lee! Ọ bụ n’ihi oké iwe+ nke Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-eweso Juda mere o ji nyefee ha n’aka unu, unu wee jiri ọnụma+ nke ruru n’eluigwe+ gbuo ụfọdụ n’ime ha. 10  Ugbu a, unu na-achọ iji ụmụ Juda na Jeruselem mere ndị ikom na-eje ozi+ na ndị inyom na-eje ozi. Ka o sina dị, ọ̀ bụ na e nweghị mmehie ndị unu onwe unu mere megide Jehova bụ́ Chineke unu? 11  Geenụ m ntị ma kpọghachi ndị ahụ unu si n’etiti ụmụnne unu dọrọ n’agha,+ n’ihi na Jehova na-eweso unu iwe dị ọkụ.”+ 12  Ụfọdụ n’ime ndị isi+ nke ụmụ Ifrem,+ bụ́ Azaraya nwa Jehohenan, Berekaya nwa Meshilemọt na Jehizkaya nwa Shalọm na Amesa nwa Hadlaị, wee guzogide ndị ahụ si agha na-alọta, 13  ha wee sị ha: “Unu agaghị akpọbata ndị a unu dọtara n’agha n’ebe a, n’ihi na nke a ga-eme ka anyị bụrụ ndị ikpe mara n’ihu Jehova. Unu na-achọ ịtụkwasị ihe ná mmehie anyị nakwa n’ikpe ọmụma anyị, n’ihi na ikpe ọmụma anyị dị ukwuu,+ ọ na-ewesokwa Izrel iwe dị ọkụ.”+ 14  Ndị agha ahụ+ wee hapụ ndị ahụ ha dọtara n’agha+ na ihe ha kwatara n’ihu ndị isi+ ahụ nakwa n’ihu ọgbakọ ahụ dum. 15  Ndị a kpọrọ aha+ wee bilie kpọrọ ndị ahụ a dọtara n’agha, ha sikwa n’ihe ndị ahụ a kwatara akwata chịnye ndị gba ọtọ n’ime ha uwe ka ha yiri. Ha wee chịnye ha uwe ka ha yiri,+ chịnyekwa ha akpụkpọ ụkwụ, nye ha ihe oriri,+ nyekwa ha ihe ọṅụṅụ,+ teekwa ha mmanụ. Ha jikwa ịnyịnya ibu buru+ ndị ike gwụrụ ịga ije wee bute ha Jeriko,+ bụ́ obodo nkwụ,+ n’ebe ụmụnne ha nọ. E mesịa, ha laghachiri Sameria.+ 16  N’oge ahụ, Eze Ehaz+ zigaara ndị eze Asiria+ ozi ka ha nyere ya aka. 17  Ndị Idọm+ bịakwara ọzọ wee merie Juda ma dọrọ ndị mmadụ n’agha. 18  Ma ndị Filistia+ wakporo obodo ndị dị na Shefila+ na Negeb+ nke Juda wee weghara Bet-shimesh+ na Aịjalọn+ na Gedirọt na Soko na obodo nta ya niile, na Timna+ na obodo nta ya niile, na Gimzo na obodo nta ya niile; ha wee biri n’ebe ahụ. 19  N’ihi na Jehova wedara Juda n’ala+ n’ihi Ehaz eze Izrel, n’ihi na ọ hapụrụ ndị mmadụ ka ha na-eme otú masịrị ha na Juda.+ O mesoro nnọọ Jehova omume ekwesịghị ntụkwasị obi. 20  N’ikpeazụ, Tilgat-pilniza+ eze Asiria bịara buso ya agha wee mekpaa ya ahụ́,+ o meghịkwa ka ọ dị ike. 21  N’ihi na Ehaz kwakọọrọ ihe niile dị n’ụlọ Jehova+ nakwa n’ụlọ eze+ nakwa n’ụlọ ndị isi,+ buru ha bunye eze Asiria dị ka onyinye;+ ma nke ahụ enyereghị ya aka. 22  Otú ọ dị, mgbe ọ na-emekpa ya ahụ́, Eze Ehaz+ gara n’ihu imeso Jehova omume ekwesịghị ntụkwasị obi. 23  O wee malite ịchụrụ chi dị iche iche+ nke Damaskọs,+ bụ́ ndị na-awakpo ya, àjà, o wee sị: “Ebe ọ bụ na chi ndị eze Siria na-enyere ha aka,+ m ga-achụrụ ha àjà, ka ha wee nyere m aka.”+ Ha wee ghọọrọ ya na Izrel dum ihe ịsụ ngọngọ.+ 24  Ehaz chịkọtakwara arịa+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke, gbukasịakwa arịa ndị dị n’ụlọ ezi Chineke+ ma mechie ọnụ ụzọ+ ụlọ Jehova, wee meere onwe ya ebe ịchụàjà n’akụkụ ngalaba ụzọ ọ bụla na Jeruselem.+ 25  O mekwara ebe ndị dị elu+ maka isurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ n’obodo niile, ee, n’obodo niile dị na Juda. O wee kpasuo Jehova bụ́ Chineke nna nna ya hà iwe.+ 26  Ma ihe ndị ọzọ metụtara ya+ na ụzọ ya niile, ndị mbụ na ndị ikpeazụ, lee, e dere ha n’Akwụkwọ+ Ndị Eze Juda na Izrel. 27  N’ikpeazụ, Ehaz sooro nna nna ya hà dinaa, ha wee lie ya n’obodo, na Jeruselem, n’ihi na ha ebubataghị ya n’ebe a na-eli ndị eze Izrel.+ Hezekaya nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji