2 Ihe E Mere 27:1-9
27 Jotam+ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri na isii na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jerusha,+ ada Zedọk.
2 O wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova,+ dị ka ihe niile Ọzaya nna ya mere si dị.+ Ọ bụ naanị na ọ wabaghị n’ụlọ nsọ Jehova.+ Otú ọ dị, ndị ala ahụ ka nọ na-eme omume na-eweta mbibi.+
3 Ọ bụ ya wuru ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago+ n’ụlọ Jehova, o wukwara ọtụtụ ihe owuwu ná mgbidi Ofel.+
4 O wukwara obodo dị iche iche+ n’ógbè Juda bụ́ ugwu ugwu, o wukwara ebe ndị siri ike+ na ụlọ nche+ dị iche iche n’oké ọhịa.+
5 Ọ bụkwa ya busoro eze ụmụ Amọn agha,+ e mesịa, o meriri ha, ụmụ Amọn wee nye ya otu narị talent ọlaọcha na ọka wit+ dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ iri+ na ọka bali dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ iri,+ n’afọ ahụ. Ọ bụ ihe a ka ụmụ Amọn kwụrụ ya, ọ bụkwa ya ka ha kwụrụ n’afọ nke abụọ nakwa na nke atọ.+
6 Jotam wee na-eme onwe ya ka ọ dị ike, n’ihi na ọ kwadebere ụzọ ya n’ihu Jehova bụ́ Chineke ya.+
7 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Jotam+ na agha niile o buru na ụzọ ya, lee, e dere ha n’Akwụkwọ+ Ndị Eze Izrel na Juda.
8 Ọ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri na isii na Jeruselem.+
9 N’ikpeazụ, Jotam sooro nna nna ya hà dinaa,+ ha wee lie ya n’Obodo Devid.+ Ehaz+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.