2 Ihe E Mere 26:1-23
26 Ndị Juda niile+ wee kpọrọ Ọzaya,+ bụ́ onye dị afọ iri na isii, mee+ ya eze n’ọnọdụ nna ya bụ́ Amazaya.+
2 Ọ bụ ya wughachiri Ilọt+ ma mee ka Juda nwetaghachi ya mgbe eze sowooro nna nna ya hà dinaa.+
3 Ọzaya+ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri ise na abụọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jekọlaya+ onye Jeruselem.
4 O wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova+ dị ka ihe niile Amazaya nna ya mere si dị.+
5 Ọ nọkwa na-achọ+ Chineke n’ụbọchị Zekaraya, bụ́ onye kụziiri ya ịtụ egwu Chineke;+ n’ụbọchị ndị ahụ ọ chọrọ Jehova, ezi Chineke mere ka ọ baa ọgaranya.+
6 O wee gaa buso ndị Filistia+ agha ma tipuo mgbidi Gat+ na mgbidi Jabne na mgbidi Ashdọd.+ E mesịa, o wuru obodo dị iche iche n’ókèala Ashdọd nakwa n’etiti ndị Filistia.
7 Ezi Chineke wee na-enyere ya aka+ n’ibuso ndị Filistia na ndị Arebia+ bi na Gọbel na Meyunim+ agha.
8 Ndị Amọn+ wee malite ịtụrụ Ọzaya ụtụ.+ Ka oge na-aga, ude ya+ ruru Ijipt, n’ihi na ọ kpara ike dị nnọọ ukwuu.
9 Ọzaya wukwara ụlọ nche+ na Jeruselem n’akụkụ Ọnụ Ụzọ Ámá Nkuku+ nakwa n’akụkụ Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu+ nakwa n’akụkụ Nkuku Mgbidi, meekwa ka ha sie ike.
10 O wee wuo ụlọ nche+ n’ala ịkpa, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri (n’ihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ), o mekwara otú ahụ na Shefila+ nakwa n’ala dị larịị. O nwere ndị ọrụ ubi na ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn n’ugwu nakwa na Kamel, n’ihi na o nwere mmasị n’ọrụ ubi.
11 Ọzaya nwekwara ndị agha, ndị na-aga agha n’ìgwè n’ìgwè,+ dị ka ọnụ ọgụgụ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ si dị,+ ndị Jeayel bụ́ odeakwụkwọ+ na Measaya bụ́ onyeisi nke nọ n’okpuru+ Hananaya, bụ́ otu n’ime ndị eze mere ndị isi,+ debara aha ha n’akwụkwọ.
12 Ọnụ ọgụgụ nke ndị isi ọnụmara niile,+ ndị bụ́ dimkpa+ na dike,+ dị puku mmadụ abụọ na narị isii.
13 Ndị agha nọ n’okpuru ha dị narị puku mmadụ atọ, puku asaa na narị ise, bụ́ ndị na-ebu agha dị ka ndị agha dị ike iji nyere eze aka ibuso ndị iro ya agha.+
14 Ọzaya wee na-akwadebere ha, ya bụ, ìgwè ndị agha ya dum, ọta+ na ube+ na okpu agha+ na uwe agha+ na ụta+ na nkume èbè.+
15 N’ime Jeruselem, ọ rụrụ ngwá agha, nke ndị ọkà mepụtara, ka ha wee dịrị n’ụlọ nche dị iche iche+ nakwa n’elu nkuku dị iche iche, maka iji na-agbapụ akụ́ na nnukwu nkume. Ude ya+ wee ruo n’ebe dị oké anya, n’ihi na e nyeere ya aka nke ukwuu ruo mgbe o siri ike.
16 Otú ọ dị, ozugbo o siri ike, obi ya wee dị mpako+ nke na ọ kpataara onwe ya mbibi,+ o wee meso Jehova bụ́ Chineke ya omume ekwesịghị ntụkwasị obi wee bata n’ụlọ nsọ Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+
17 Ozugbo, Azaraya onye nchụàjà na ndị nchụàjà Jehova, bụ́ ndị dike iri asatọ, sochiri ya azụ.
18 Ha wee gbalịa igbochi Ọzaya bụ́ eze,+ sị ya: “Ọzaya, ọ bụghị ọrụ gị+ isurere Jehova ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, kama ọ bụ ọrụ ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Erọn,+ ndị e doro nsọ, isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Si n’ebe nsọ a pụọ; n’ihi na imewo omume ekwesịghị ntụkwasị obi, ị gaghị enweta ùgwù+ ọ bụla site n’aka Jehova Chineke.”
19 Ma Ọzaya were oké iwe+ ka o ji ihe e ji etinye ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ n’aka nke ọ ga-eji suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Ka ọ nọ na-eweso ndị nchụàjà ahụ oké iwe, ekpenta+ pụtara+ ya n’egedege ihu n’ụlọ Jehova n’akụkụ ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, n’ihu ndị nchụàjà.
20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụàjà na ndị nchụàjà niile ahụ tụgharịrị lee ya anya, lee, e tiri ya ekpenta n’egedege ihu!+ Ha wee kpọrọ ya pụọ n’ebe ahụ ọsọ ọsọ, ya onwe ya mekwara ngwa ngwa ka ọ pụọ, n’ihi na Jehova etiwo ya ihe otiti.+
21 Ọzaya+ bụ́ eze wee bụrụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọ nwụrụ. O wee biri n’ụlọ, e gbochiri ya ịrụ ọrụ, n’ihi na ọ bụ onye ekpenta;+ n’ihi na a machiri ya ịbata n’ụlọ Jehova, ebe Jotam nwa ya bụ onyeisi ụlọ eze, na-ekpe ndị ala ya ikpe.
22 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Ọzaya,+ ndị mbụ na ndị ikpeazụ, Aịzaya+ nwa Emọz+ onye amụma dere ha n’akwụkwọ.
23 N’ikpeazụ, Ọzaya sooro nna nna ya hà dinaa; ha wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà, kama ọ bụ n’ala ndị eze ka e liri ya,+ n’ihi na ha sịrị: “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.