2 Ihe E Mere 25:1-28
25 Amazaya+ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze, ọ chịkwara afọ iri abụọ na itoolu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jehoadan+ onye Jeruselem.
2 O wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova,+ ọ bụ naanị na o jighị obi zuru ezu+ na-eme ya.
3 O wee ruo na ozugbo alaeze ya siri ike n’aka ya, n’egbughị oge, o gburu+ ndị na-ejere ya ozi+ bụ́ ndị gburu eze bụ́ nna ya.+
4 Ma o gbughị ụmụ ha, kama o mere dị ka ihe e dere n’iwu si dị, n’akwụkwọ Mozis,+ bụ́ nke Jehova nyere n’iwu, sị: “Ndị bụ́ nna agaghị anwụ n’ihi ụmụ ha,+ ụmụ agaghịkwa anwụ n’ihi nna ha;+ kama onye nke ọ bụla ga-anwụ n’ihi mmehie nke ya.”+
5 Amazaya wee kpọkọta ndị Juda wee mee ka ha guzoro dị ka ụlọ ndị nna nna ha si dị,+ n’okpuru ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha+ nakwa n’okpuru ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha+ maka Juda na Benjamin dum; o wee deba aha ha n’akwụkwọ malite ná ndị gbara afọ iri abụọ+ gbagowe, o wee hụ na ha dị narị puku ndị ikom atọ a họrọ ahọ, bụ́ ndị na-aga agha, ndị na-ebu ube+ na ọta ukwu.+
6 O jikwa otu narị talent ọlaọcha goo otu narị puku ndị dimkpa bụ́ dike n’Izrel.
7 Otu nwoke bụ́ onye nke ezi Chineke+ wee bịakwute ya, sị: “Eze, ka ndị agha Izrel ghara iso gị gaa, n’ihi na Jehova anọnyereghị Izrel,+ ya bụ, ụmụ Ifrem niile.
8 Kama gawa naanị gị, mee ihe, nwee obi ike n’agha a.+ Ezi Chineke pụrụ ime ka ị daa n’ihu onye iro; n’ihi na Chineke nwere ike inyere mmadụ aka+ na ime ka ọ daa.”+
9 Amazaya+ wee gwa onye nke ezi Chineke, sị: “Oleekwanụ ihe a ga-eme otu narị talent m nyere ndị agha Izrel?”+ Onye nke ezi Chineke wee sị: “Jehova nwere ike inye gị ihe karịrị ya.”+
10 Amazaya wee kpọpụta ha, ya bụ, ndị agha ahụ si Ifrem bịa, ka ha laa n’obodo ha. Otú ọ dị, ha wesoro Juda iwe dị ọkụ wee jiri oké iwe+ laghachi n’obodo ha.
11 Amazaya wee nwee obi ike ma duru ndị ya gaa na Ndagwurugwu Nnu;+ o wee gbuo ụmụ Sia,+ puku mmadụ iri n’ime ha.+
12 Ụmụ Juda nwụdere puku mmadụ iri ná ndụ. Ha wee kpọrọ ha gaa n’elu nkume dị elu, wee si n’elu nkume ahụ dị elu na-atụda ha; ha niile n’otu n’otu wee kụrisịa.+
13 Ma ndị agha ahụ Amazaya gwara ka ha lawa ka ha ghara iso ya gaa agha+ malitere ịwakpo obodo ndị dị na Juda, malite na Sameria+ ruo Bet-horọn,+ wee gbuo puku mmadụ atọ n’ebe ndị ahụ, bukọrọkwa ihe dị ukwuu.
14 Ma o ruru na mgbe Amazaya si n’igbu ụmụ Idọm na-alọta, o wetara chi dị iche iche+ nke ụmụ Sia ma guzobe ha ka ha bụrụ chi ya.+ O wee malite ịkpọrọ ha isiala,+ ọ malitekwara isurere ha ihe nsure ọkụ.+
15 Jehova wee weso Amazaya iwe dị ọkụ. O wee zipụ onye amụma ya ka ọ gakwuru ya wee sị ya: “Gịnị mere i ji chọwa+ chi dị iche iche+ na-anapụtaghị ndị ya n’aka gị?”+
16 O wee ruo na mgbe ọ gwara ya okwu a na eze sịrị ya ozugbo: “Ànyị mere gị onye ndụmọdụ eze?+ Mechie ọnụ maka ndụ gị.+ Ị̀ chọrọ ka e gbuo gị?” Onye amụma ahụ wee mechie ọnụ, kama ọ sịrị: “Amaara m na Chineke ekpebiwo ịla gị n’iyi,+ n’ihi ihe a i mere,+ i geghịkwa ntị na ndụmọdụ m.”+
17 Mgbe ahụ, Amazaya eze Juda natara ndụmọdụ wee zigara Jehoash nwa Jehoahaz bụ́ nwa Jihu eze Izrel ozi,+ sị: “Bịa! Ka mụ na gị lụọ agha.”+
18 Jehoash eze Izrel wee zigara Amazaya eze Juda ozi, sị:+ “Ahịhịa ogwu nke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi,+ sị, ‘Kpọnye nwa m nwoke ada gị ka ọ bụrụ nwunye ya.’+ Otú ọ dị, anụ ọhịa+ nke nọ na Lebanọn gafeere ma zọda ahịhịa ogwu ahụ.
19 Ị sịwo n’obi gị, ‘Lee, emeriwo m Idọm.’+ Obi gị+ afụliwo gị elu ka e nyewe gị otuto.+ Nọrọ n’ụlọ gị.+ Gịnị mere ị ga-eji lụọ ọgụ mgbe ị nọ n’ọnọdụ ọjọọ,+ o wee bụrụ na ị ga-ada, gị na Juda?”+
20 Ma Amazaya egeghị ntị; n’ihi na o si n’aka ezi Chineke+ ka o wee nyefee ha n’aka ya, n’ihi na ha chọrọ chi dị iche iche nke Idọm.+
21 Jehoash eze Izrel wee gbagoo,+ ya na Amazaya eze Juda wee lụọ agha+ na Bet-shimesh+ nke Juda.
22 Izrel wee merie Juda,+ ha wee gbalaga, onye nke ọ bụla n’ụlọikwuu ya.+
23 Ọ bụ Amazaya eze Juda bụ́ nwa Jehoash nwa Jehoahaz ka Jehoash eze Izrel jidere+ na Bet-shimesh. E mesịa, ọ kpụtara ya na Jeruselem+ wee kwatuo mgbidi Jeruselem, malite n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem+ ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Nkuku,+ bụ́ ebe dị narị kubit anọ.
24 O wee bukọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na arịa niile dị n’ụlọ ezi Chineke, bụ́ ndị dị n’aka Obed-idọm+ nakwa akụ̀ ndị dị n’ụlọ eze,+ kpọrọkwa ndị e jidere n’agha wee laghachi Sameria.+
25 Amazaya+ nwa Jehoash eze Juda wee dịrị ndụ ruo afọ iri na ise+ mgbe Jehoash nwa Jehoahaz eze Izrel nwụsịrị.+
26 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Amazaya, ndị mbụ na ndị ikpeazụ,+ lee! ọ̀ bu na e deghị ha n’Akwụkwọ+ Ndị Eze Juda na Izrel?+
27 Malite n’oge Amazaya kwụsịrị iso Jehova, ha gbaara ya izu+ na Jeruselem. Ka oge na-aga, ọ gbagara Lekish;+ ma ha zipụrụ ndị mmadụ ka ha chụrụ ya gaa Lekish. Ha wee gbuo ya n’ebe ahụ.+
28 Ha wee jiri ịnyịnya+ buru ya wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’obodo Juda.+