2 Ihe E Mere 22:1-12
22 Ndị bi na Jeruselem wee mee Ehazaya+ bụ́ ọdụdụ nwa ya eze n’ọnọdụ ya, (n’ihi na ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ha na ndị Arab+ so bịa n’ebe ha mara ụlọikwuu gburu ndị niile tọrọ ya,)+ Ehazaya nwa Jehoram wee malite ịchị dị ka eze Juda.
2 Ehazaya gbara afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị,+ ọ chịkwara otu afọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Atalaya+ nwa nwa Ọmraị.+
3 Ya onwe ya kwa jere ije n’ụzọ ụlọ Ehab jere,+ n’ihi na nne ya+ ghọrọ onye ndụmọdụ ya n’ime ihe ọjọọ.
4 O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dị ka ụlọ Ehab mere, n’ihi na ha onwe ha ghọrọ ndị ndụmọdụ+ ya mgbe nna ya nwụsịrị, bụ́ nke wetaara ya mbibi.
5 Ọ bụkwa ndụmọdụ ha ka ọ gbasoro,+ wee soro Jehoram+ nwa Ehab eze Izrel gaa buso Hazel+ eze Siria agha na Remọt-gilied,+ bụ́ ebe ndị ọgba ụta nọ gbaa Jehoram akụ́.+
6 O wee lọta Jezril+ ka a gwọọ ya ahụ́ ahụ e merụrụ ya na Rema+ mgbe o busoro Hazel eze Siria agha.
Ma Azaraya+ nwa Jehoram+ eze Juda gbadara Jezril ịga hụ Jehoram+ nwa Ehab, n’ihi na ọ na-arịa ọrịa.+
7 Ma, ọ bụ Chineke mere+ ka Ehazaya daa+ n’ihi ọbịbịa ọ bịara ịhụ Jehoram; mgbe ọ bịara, o so Jehoram gaa izute+ Jihu+ nwa nwa Nimshaị,+ bụ́ onye Jehova tere mmanụ+ ka o bipụ ụlọ Ehab.+
8 O wee ruo na ozugbo Jihu malitere imezu ihe e kpere n’ikpe megide ụlọ Ehab,+ ọ hụrụ ndị bụ́ ndị isi na Juda na ụmụ ụmụnne Ehazaya,+ bụ́ ndị na-ejere Ehazaya ozi, wee gbuo ha.+
9 O wee chọwa Ehazaya. Ha wee mesịa nwụde ya+ ka o zoro na Sameria,+ ha wee kpụtara ya Jihu. Ha wee gbuo ya, lie ya,+ n’ihi na ha sịrị: “Ọ bụ nwa nwa Jehọshafat,+ bụ́ onye ji obi ya dum chọọ Jehova.”+ Ọ dịghị onye si n’ụlọ Ehazaya nke nwere ike ịchị alaeze ahụ.
10 Ma Atalaya+ nne Ehazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla. O wee bilie gbuo ụmụ eze niile bụ́ ndị si n’ụlọ Juda.+
11 Otú ọ dị, Jehoshabịat+ bụ́ ada eze si n’etiti ụmụ ndị ikom eze bụ́ ndị a chọrọ igbu kupụ Jehoash+ nwa Ehazaya na nzuzo wee debe ya na nwaanyị na-enye ya ara n’ọnụ ụlọ ndina nke dị n’ime. Jehoshabịat bụ́ ada Eze Jehoram,+ nwunye Jehoyada+ onye nchụàjà, (n’ihi na ya onwe ya bụ nwanne Ehazaya,) zoro ya n’ihi Atalaya, Atalaya egbughịkwa ya.+
12 O wee soro ha nọrọ n’ụlọ ezi Chineke, bụ́ ebe e zoro ya ruo afọ isii,+ ka Atalaya nọ na-achị ala ahụ+ dị ka eze nwaanyị.+