2 Ihe E Mere 21:1-20
21 N’ikpeazụ, Jehọshafat sooro nna nna ya hà+ dinaa, e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà+ n’Obodo Devid; Jehoram+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.
2 O nwekwara ụmụnne ndị ikom, ndị Jehọshafat mụrụ, bụ́ Azaraya na Jehayel na Zekaraya na Azaraya na Maịkel na Shefataya, ndị a niile bụ ụmụ Jehọshafat eze Izrel.
3 Nna ha wee nye ha ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị ka onyinye,+ tinyere obodo ndị e wusiri ike ndị dị na Juda;+ ma o nyere Jehoram alaeze ya,+ n’ihi na ọ bụ ya bụ ọkpara.+
4 Mgbe Jehoram chịwara alaeze nna ya, o mere ka ọchịchị ya sie ike, o wee jiri mma agha gbuo ụmụnne ya niile,+ o gbukwara ụfọdụ n’ime ndị isi e nwere n’Izrel.
5 Jehoram gbara afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ asatọ+ na Jeruselem.
6 O wee na-eje ije n’ụzọ ndị eze Izrel jere,+ dị nnọọ ka ndị ụlọ Ehab mere; n’ihi na ọ lụrụ nwa Ehab,+ o wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+
7 Ma Jehova achọghị ịla ụlọ Devid n’iyi,+ n’ihi ọgbụgba ndụ+ ya na Devid gbara, dị nnọọ ka o kwuru na ya ga-enye ya+ na ụmụ ya oriọna ga na-enwu mgbe niile.+
8 N’ụbọchị ya ka Idọm+ nupụụrụ Juda+ isi wee meere onwe ha eze.+
9 Ya mere, Jehoram na ndị o mere ndị isi, tinyere ụgbọ ịnyịnya ya niile, wee gaa ebe ahụ. O wee bilie n’abalị gbuo ndị Idọm gbara ya na ndị isi ụgbọ ịnyịnya ya gburugburu.
10 Ma Idọm nọgidere na-enupụrụ Juda isi ruo taa. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka Libna+ malitere inupụrụ ya isi, n’ihi na ọ hapụrụ Jehova bụ́ Chineke nke nna nna ya hà.+
11 O wukwara ebe ndị dị elu+ n’ugwu Juda, ka o wee mee ka ndị bi na Jeruselem na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ+ nakwa ka o wee dufuo Juda.+
12 E mesịa, o nwetara akwụkwọ ozi+ nke si n’aka Ịlaịja+ onye amụma, bụ́ nke sịrị: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Devid nna nna gị kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ị dịghị eje ije n’ụzọ Jehọshafat+ nna gị ma ọ bụ n’ụzọ Esa+ eze Juda jere,
13 kama ị na-eje ije n’ụzọ ndị eze Izrel+ jere wee mee ka Juda na ndị bi na Jeruselem na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ+ n’otu ụzọ ahụ ụlọ Ehab si mee ka a na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ i gbukwara ọbụna ụmụnne gị, bụ́ ndị ezinụlọ nna gị, ndị ka gị onwe gị mma;+
14 lee! Jehova ga-eti ndị gị+ na ụmụ gị+ na ndị nwunye gị na akụ̀ gị niile ajọ ihe otiti.+
15 Ị ga-arịa ọtụtụ ọrịa,+ ọrịa ọjọọ ga-arịakwa gị n’eriri afọ, ruo mgbe eriri afọ gị ga na-awụpụta kwa ụbọchị n’ihi ọrịa ahụ.’”+
16 Jehova wee kpalie mmụọ+ ndị Filistia+ na ndị Arab+ bụ́ ndị bi n’akụkụ ndị Itiopia+ imegide Jehoram.
17 Ha wee gbagote na Juda wee waba n’ime ya ma kwakọrọ akụ̀ niile dị n’ụlọ eze,+ dọrọkwa ụmụ ya ndị ikom na ndị nwunye ya n’agha,+ ọ dịghị nwa nwoke ọ bụla a hapụụrụ ya ma e wezụga Jehoahaz,+ bụ́ ọdụdụ nwa ya.
18 Mgbe nke a gasịrị, Jehova mere ka ọrịa nke na-enweghị ọgwụgwọ rịawa ya n’eriri afọ.+
19 O wee ruo n’ụbọchị ndị sochirinụ, ya bụ, mgbe afọ abụọ zuru ezu gwụchara, na eriri afọ ya+ wụpụtara mgbe ọ na-arịa ọrịa ahụ, o wee nwụọ n’ọrịa ọjọọ ya; ndị ya esureghị ihe nsure ọkụ maka ya dị ka e sureere+ nna nna ya hà.
20 Ọ dị afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ asatọ na Jeruselem. N’ikpeazụ, ọ nwụrụ n’enweghị onye nwere mmasị n’ebe ọ nọ.+ Ha wee lie ya n’Obodo Devid,+ ma ọ bụghị n’ebe a na-eli ndị eze.+