2 Ihe E Mere 2:1-18

2  Sọlọmọn wee nye iwu ka e wuoro aha+ Jehova ụlọ,+ wuokwara ya onwe ya obí eze.+  Sọlọmọn wee nye puku mmadụ iri asaa ọrụ ka ha bụrụ ndị na-ebu ibu, nyekwa puku mmadụ iri asatọ ọrụ ka ha bụrụ ndị na-awa nkume n’ugwu,+ nyekwa puku mmadụ atọ na narị isii ọrụ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ha.+  Sọlọmọn zikwara Haịram+ eze Taya, sị: “Dị nnọọ ka i meere Devid+ nna m, wee na-ebunye ya osisi sida o ji wuoro onwe ya ụlọ obibi,—  lee, m ga-ewuru+ aha+ Jehova bụ́ Chineke m ụlọ ka m wee doo ya nsọ+ nye ya, ka m wee na-esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ n’ihu ya, na-edebe achịcha a na-edebe n’usoro mgbe niile,+ na-achụkwa àjà nsure ọkụ n’ụtụtụ nakwa ná mgbede,+ n’ụbọchị izu ike+ nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ nakwa n’oge ememme+ a na-emere Jehova bụ́ Chineke anyị. Izrel ga na-eme nke a ruo mgbe a na-akaghị aka.+  Ụlọ m ga-ewu ga-adị ukwuu,+ n’ihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi niile ọzọ.+  Ònye nwere ike iwuru ya ụlọ?+ N’ihi na eluigwe nakwa eluigwe nke eluigwe apụghị ịba ya,+ ònye ka m bụ+ iwuru ya ụlọ ma ọ́ bụghị naanị iwu ebe a ga na-esure ihe nsure ọkụ n’ihu ya?+  Ya mere, zitere m nwoke nwere nkà, onye makwaara otú e si atụ́ ihe, onye ga-eji ọlaedo na ọlaọcha na ọla kọpa+ na ígwè na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na nke na-acha anụnụ anụnụ rụọ ọrụ, ka ya na ndị nwere nkà mụ na ha bi na Juda na Jeruselem, bụ́ ndị Devid nna m họpụtara, rụọ ọrụ.+  Si na Lebanọn+ butere m osisi sida+ na osisi junipa+ nakwa osisi algọm,+ n’ihi na m maara nke ọma na igbutu osisi Lebanọn+ doro ndị na-ejere gị ozi anya, (lee, ndị na-ejere m ozi ga-esonyere ndị na-ejere gị ozi,)  ka ha wee kwadebere m ọtụtụ osisi, n’ihi na ụlọ m ga-ewu ga-abụ nnọọ nnukwu ụlọ. 10  Lee! m ga-enye ndị na-ebu osisi, bụ́ ndị na-egbutu osisi, ọka wit dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ iri abụọ+ na ọka bali dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ iri abụọ na mmanya+ dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat iri abụọ nakwa mmanụ dị puku ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat iri abụọ, ka ha bụrụ ihe oriri nke ndị na-ejere gị ozi.” 11  Haịram eze Taya+ wee dee akwụkwọ ozi zigara Sọlọmọn, sị: “Ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ ndị ya n’anya+ mere o ji mee gị eze ha.”+ 12  Haịram kwukwara, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye kere eluigwe na ala,+ bụrụ onye a gọziri agọzi,+ n’ihi na o nyewo Devid bụ́ eze nwa maara ihe, onye nwere ezi uche na nghọta,+ bụ́ onye ga-ewuru Jehova ụlọ, wuokwara onwe ya obí eze.+ 13  M ga-ezitere gị nwoke nwere nkà, onye nwere nghọta dị ukwuu, bụ́ Haịram-ebaị,+ 14  nwa otu nwaanyị nke bụ́ otu n’ime ụmụ Dan, ma nna ya bụ onye Taya, ọ maara otú e si eji ọlaedo na ọlaọcha, ọla kọpa,+ ígwè, nkume+ na osisi arụ ọrụ nakwa otú e si eji ajị anụ e sijiri odo odo,+ eri na-acha anụnụ anụnụ+ na ákwà ọma+ na eri na-acha uhie uhie,+ arụ ọrụ, ọ makwaara ụdị ihe ọ bụla a na-atụ atụ́+ nakwa ụzọ e si arụpụta ụdị ihe ọ bụla+ a pụrụ inye ya na ndị nkà gị nakwa ndị nkà onyenwe m Devid bụ́ nna gị ka ha rụọ. 15  Ugbu a, ka onyenwe m butere ndị na-ejere ya ozi ọka wit na ọka bali, mmanụ na mmanya o kwere ná nkwa.+ 16  Ma anyị onwe anyị ga-esi na Lebanọn gbute osisi+ niile ị chọrọ,+ anyị ga-ebutere gị ha site n’ike ha n’ùkwù n’ùkwù mee ka ha see n’elu oké osimiri+ rute Jọpa,+ gị onwe gị ga-ebugozi ha Jeruselem.” 17  Sọlọmọn wee gụọ ndị ikom niile bụ́ ndị mbịarambịa bi n’ala Izrel+ ọnụ, dị ka Devid nna ya gụrụ ha;+ ha dị otu narị puku mmadụ na iri puku ise na atọ na narị mmadụ isii. 18  O wee mee puku mmadụ iri asaa n’ime ha ndị na-ebu ibu,+ mee puku iri asatọ ndị na-awa nkume+ n’ugwu, meekwa puku mmadụ atọ na narị isii ndị nlekọta ka ha na-ahụ na ndị mmadụ na-arụ ọrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji