2 Ihe E Mere 19:1-11

19  Jehọshafat eze Juda wee laa n’ụlọ ya dị na Jeruselem n’udo.+  Jihu+ nwa Hanenaị+ onye ọhụụ+ wee gakwuru Eze Jehọshafat wee sị ya: “Ọ̀ bụ ndị ajọ omume ka e kwesịrị inyere aka,+ ọ̀ bụkwa ndị kpọrọ Jehova asị+ ka i kwesịrị ịhụ n’anya?+ N’ihi nke a, Jehova na-eweso gị iwe.+  Ka o sina dị, e nwere ihe ndị dị mma+ a hụrụ n’ime gị, n’ihi na i wepụsịwo ogwe osisi dị nsọ n’ala a,+ i doziwokwa obi gị ịchọ ezi Chineke.”+  Jehọshafat wee biri na Jeruselem; o wee maliteghachi ịgakwuru ndị mmadụ malite na Bia-shiba+ ruo n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu,+ ka o wee mee ka ha laghachikwuru Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha.+  O wee debe ndị ikpe n’ala ahụ dum, n’obodo niile e wusiri ike dị na Juda, n’obodo n’obodo.+  O wee gwa ndị ikpe ahụ, sị: “Lezienụ anya n’ihe unu na-eme,+ n’ihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Jehova;+ ọ nọnyekwaara unu n’ikpe ikpe.+  Na-atụnụ+ egwu Jehova.+ Kpacharanụ anya n’ihe unu na-eme,+ n’ihi na ajọ omume+ ma ọ bụ ile mmadụ anya n’ihu+ ma ọ bụ iri ngarị+ adịghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ.”  N’ime Jeruselem, Jehọshafat debere ụfọdụ n’ime ndị Livaị+ na ndị nchụàjà+ nakwa ụfọdụ n’ime ndị isi nke ọnụmara dị iche iche+ nke Izrel maka ikpe ikpe+ n’aha Jehova nakwa ịhụ maka okwu ikpe+ nke ndị bi na Jeruselem.  O nyekwara ha iwu, sị: “Otú a ka unu ga-eji ịtụ egwu+ Jehova, ikwesị ntụkwasị obi na obi zuru ezu na-eme. 10  Ma okwu ikpe ọ bụla nke ụmụnne unu ndị bi n’obodo ha dị iche iche wetaara unu, bụ́ ndị metụtara ịwụfu ọbara+ nakwa ndị metụtara iwu+ na ntụziaka+ na ụkpụrụ+ na ihe e kpere n’ikpe,+ unu ga-adọ ha aka ná ntị ka ha ghara imejọ Jehova, ka a ghara iweso unu na ụmụnne unu iwe.+ Otú a ka unu ga na-eme, ka unu ghara iwetara onwe unu ikpe ọmụma. 11  Lee, Amaraya onyeisi nchụàjà bụ onyeisi unu n’okwu niile metụtara Jehova;+ tinyere Zebadaya nwa Ishmel bụ́ onye ndú nke ụlọ Juda n’okwu niile metụtara eze; unu nwekwara ndị Livaị bụ́ ndị unu ga-eji mere ndị nlekọta. Dịnụ ike ma meenụ ihe, ka Jehova+ gọziekwa ihe ọma unu na-eme.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji