2 Ihe E Mere 18:1-34

18  Jehọshafat wee nwee akụnụba na ùgwù nke ukwuu;+ ma ya na Ehab+ gọrọ ọgọ.+  Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ọ gakwuuru Ehab na Sameria;+ Ehab wee chụọ ọtụtụ atụrụ+ na ehi n’àjà n’ihi ya nakwa n’ihi ndị ya na ha so. O wee malite ịrata+ ya ka o soro ya gaa buso Remọt-gilied agha.+  Ehab eze Izrel wee sị Jehọshafat eze Juda: “Ị̀ ga-eso m gaa Remọt-gilied?”+ O wee sị ya: “Mụ na gị bụ otu, ndị m na ndị gị bụkwa otu, anyị ga-eso gị buo agha.”+  Otú ọ dị, Jehọshafat sịrị eze Izrel: “Biko, burugodị ụzọ jụta+ ihe Jehova ga-ekwu.”  Eze Izrel wee kpọkọta ndị amụma,+ narị ndị ikom anọ, wee sị ha: “Ọ̀ bụ anyị gaa buso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ mụ agala?”+ Ha wee na-asị: “Gawa, ezi Chineke ga-enyefekwa ya n’aka eze.”  Ma Jehọshafat sịrị: “Ọ̀ bụ na e nweghị onye ọzọ bụ́ onye amụma Jehova n’ebe a?+ Ka anyị jụọkwa ase site n’ọnụ ya.”+  Eze Izrel wee sị Jehọshafat:+ “A ka nwere otu nwoke+ a ga-esi n’ọnụ ya jụọ Jehova ase, ma akpọrọ m ya asị,+ n’ihi na ọ dịghị eburu m amụma ihe ọma kama ọ bụ amụma ihe ọjọọ+ ka ọ na-eburu m ụbọchị ya niile. Ọ bụ Mịkaya nwa Imla.”+ Otú ọ dị, Jehọshafat sịrị: “Eze, ekwula otú ahụ.”+  Eze Izrel wee kpọọ otu onye na-eje ozi n’obí eze+ wee sị ya: “Kpọta Mịkaya nwa Imla ọsọ ọsọ.”+  Eze Izrel na Jehọshafat eze Juda nọ, onye nke ọ bụla n’ocheeze ya, yirikwa uwe ndị eze,+ ha nọkwa ọdụ n’ebe nzọcha mkpụrụ nke dị n’ọnụ ụzọ ámá Sameria; ndị amụma niile ahụ nọ na-eme dị ka ndị amụma n’ihu ha.+ 10  Zedekaya nwa Keneana meere onwe ya mpi+ ígwè wee sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru,+ ‘Ị ga-eji mpi ndị a na-asọ ndị Siria ruo mgbe i kpochapụrụ ha.’”+ 11  Ndị amụma niile ọzọ nọkwa na-ebu otu ihe ahụ n’amụma, na-asị: “Gbagoo Remọt-gilied nwee ihe ịga nke ọma,+ Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.”+ 12  Onye ozi ahụ nke gara ịkpọ Mịkaya gwara ya, sị: “Lee! Okwu ndị amụma na-agwa eze dịcha mma; biko, ka okwu gị dịrị ka nke otu n’ime ha,+ kwuo ihe dị mma.”+ 13  Ma Mịkaya sịrị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ ihe Chineke m ga-ekwu, ọ bụ ya ka m ga-ekwu.”+ 14  O wee bịakwute eze, eze wee sị ya: “Mịkaya, ọ̀ bụ anyị gaa Remọt-gilied buo agha, ka ọ̀ bụ mụ agala?” Ozugbo ahụ, ọ sịrị: “Gbagoo nwee ihe ịga nke ọma; a ga-enyefe ha n’aka unu.”+ 15  Eze wee sị ya: “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi+ na ị gaghị agwa m ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị naanị eziokwu n’aha Jehova?”+ 16  O wee sị: “N’ezie, m na-ahụ ka a chụsasịrị ndị Izrel niile n’ugwu, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ Jehova wee sị: ‘Ọ dịghị ndị nwe ndị a.+ Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’”+ 17  Eze Izrel wee sị Jehọshafat: “Ọ̀ bụ na mụ agwaghị gị, sị, ‘Ọ gaghị ebu amụma ọma banyere m, kama ọ bụ amụma ọjọọ’?”+ 18  O wee gaa n’ihu ịsị: “Ya mere, nụrụnụ okwu Jehova:+ M na-ahụ ka Jehova nọ ọdụ n’ocheeze ya+ nakwa ka ụsụụ ndị agha+ niile nke eluigwe guzo n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.+ 19  Jehova wee sị, ‘Ònye ga-arafu Ehab eze Izrel ka o wee gaa nwụọ na Remọt-gilied?’ Ha wee na-ekwu okwu, onye nke a kwuo nke a, onye nke a ekwuo nke a.+ 20  N’ikpeazụ, otu mmụọ+ pụtara wee guzo n’ihu Jehova, sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ Jehova wee sị ya, ‘Olee otú ị ga-esi rafuo ya?’+ 21  O wee sị, ‘M ga-aga ghọọ mmụọ nrafu n’ọnụ ndị amụma ya niile.’+ O wee sị, ‘Ị ga-arafu ya, ị ga-emerikwa.+ Gaa mee otú ahụ.’+ 22  Lee, Jehova etinyewo mmụọ nrafu n’ọnụ ndị amụma gị ndị a;+ ma Jehova ekwuwo na ọdachi ga-adakwasị gị.”+ 23  Zedekaya+ nwa Keneana+ wee bịaruo nso maa Mịkaya+ ụra,+ sị: “Olee nnọọ otú mmụọ Jehova si hapụ m gaa gwawa gị okwu?”+ 24  Mịkaya wee sị: “Lee! Ị ga-ahụ otú o si mee n’ụbọchị ahụ+ mgbe ị ga-abanye n’ọnụ ụlọ gị dị n’ime ime zoo.”+ 25  Eze Izrel wee sị: “Kpọrọnụ Mịkaya kpọghachiri Emọn bụ́ onyeisi obodo nakwa Joash nwa eze.+ 26  Unu ga-asịkwa, ‘Nke a bụ ihe eze kwuru: “Tụbanụ onye a n’ụlọ mkpọrọ,+ na-enyekwanụ ya obere ihe oriri+ na obere mmiri ruo mgbe m lọtara n’udo.”’”+ 27  Mịkaya wee sị: “Ọ bụrụ na e nwee ka i si lọta n’udo, mara na Jehova agwaghị m okwu.”+ O kwukwara, sị: “Nụrụnụ ya, unu niile.”+ 28  Eze Izrel na Jehọshafat eze Juda wee gbagoo Remọt-gilied.+ 29  Eze Izrel wee sị Jehọshafat: “M ga-ejigharị ejiji+ wee banye n’ọgbọ agha, ma gị onwe gị, yiri uwe gị.”+ Eze Izrel wee jigharịa ejiji, e mesịa, ha banyere n’ọgbọ agha.+ 30  Ma Eze Siria nyere ndị isi ụgbọ ịnyịnya ya iwu, sị: “Unu alụsola ma onye nta ma onye ukwu ọgụ, ma e wezụga naanị eze Izrel.”+ 31  O wee ruo na ozugbo ndị isi ụgbọ ịnyịnya ahụ hụrụ Jehọshafat, ha kwuru n’obi ha, sị: “Ọ bụ eze Izrel.”+ Ha wee tụgharịa ibuso ya agha; Jehọshafat wee malite iti mkpu enyemaka,+ Jehova wee nyere ya aka,+ Chineke wee rara ha ozugbo pụọ n’ebe ọ nọ.+ 32  O wee ruo na ngwa ngwa ndị isi ụgbọ ịnyịnya hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ozugbo ahụ ha kwụsịrị ịchụ ya wee laghachi.+ 33  E nwere otu nwoke nke gbara ụta n’ebughị onye ọ bụla n’obi, ma ọ gbatara+ ya eze Izrel n’agbata ebe ejiji agha ya nwere njikọ, o wee sị onye na-anya ụgbọ ịnyịnya ya:+ “Tụgharịa, bupụ m n’ọgbọ agha a, n’ihi na e merụwo m ahụ́ nke ukwuu.”+ 34  Agha ahụ nọ na-esiwanye ike n’ụbọchị ahụ, e wee kwụwa eze Izrel ọtọ n’ụgbọ ịnyịnya ahụ chee ya ihu n’ebe ndị Siria nọ ruo mgbede; o wee nwụọ mgbe anyanwụ dara.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji