2 Ihe E Mere 17:1-19
17 Jehọshafat+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya ma na-eme ka ọchịchị ya sie ike n’Izrel.
2 O wee debe ndị agha n’obodo niile e wusiri ike dị na Juda, o mekwara ka e nwee ebe ndị agha na-anọ eche nche n’ala Juda nakwa n’obodo ndị dị n’Ifrem bụ́ ndị Esa nna ya weghaara.+
3 Jehova wee nọnyere Jehọshafat,+ n’ihi na o jere ije n’ụzọ Devid nna nna ya+ jere, bụ́ onye dịrị ndụ tupu ya onwe ya, ọ chọghịkwa Bel.+
4 N’ihi na ọ bụ Chineke nke nna ya ka ọ chọrọ,+ ọ bụkwa n’iwu ya ka o jere ije,+ ọ bụghị dị ka omume Izrel si dị.+
5 Jehova wee mee ka alaeze ahụ guzosie ike n’aka ya;+ Juda dum wee na-enye Jehọshafat onyinye,+ o wee nwee akụnụba na ùgwù nke ukwuu.+
6 Obi wee sie ya ike ịgbaso ụzọ+ Jehova. O wepụrụ ọbụna ebe ndị dị elu+ na ogwe osisi ndị dị nsọ+ na Juda.
7 N’afọ nke atọ nke ọchịchị ya, o ziri ozi ka ndị o mere ndị isi bịa, ya bụ, Ben-hel na Obedaya na Zekaraya na Netanel na Mịkaya, iji zie ihe n’obodo ndị dị na Juda,
8 ndị Livaị sokwa ha, ya bụ, Shemaya na Netanaya na Zebadaya na Asahel na Shemiramọt na Jehọnatan na Adọnaịja na Tobaịja na Tob-adonaịja, bụ́ ndị Livaị, tinyere Elishama na Jehoram, bụ́ ndị nchụàjà.+
9 Ha wee malite izi ihe+ na Juda, ha jikwa akwụkwọ iwu Jehova;+ ha wee gazuo obodo niile dị na Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.
10 Ụjọ+ Jehova wee jide alaeze niile nke ala niile gbara Juda gburugburu. Ha ebusoghịkwa Jehọshafat agha.+
11 Ụfọdụ ndị Filistia na-ewetara Jehọshafat onyinye,+ na-atụkwara ya ụtụ ego.+ Ndị Arab+ na-akpụtakwara ya ewu na atụrụ, ya bụ, puku ebule asaa na narị asaa nakwa puku mkpi asaa na narị asaa.+
12 Jehọshafat wee na-enwe ọganihu ma na-adịwanye nnọọ ukwuu;+ o wee na-ewu obodo ndị siri ike+ na obodo ndị a na-akwakọba ihe+ na Juda.
13 Ọ rụrụ ọtụtụ ihe n’obodo ndị dị na Juda; ndị agha+ ndị bụ́ dimkpa na dike+ nọkwa na Jeruselem.
14 Ndị a bụ ọrụ ha dị ka ụlọ ndị nna nna ha si dị: N’ime ndị si na Juda, bụ́ ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha, e nwere Adna bụ́ onyeisi, o nwere narị puku ndị dimkpa atọ bụ́ ndị dike.+
15 Jehohenan bụ́ onyeisi nọ n’okpuru ya, o nwere narị puku mmadụ abụọ na iri puku asatọ.
16 Amasaya nwa Zikraị, bụ́ onye nyere onwe ya n’afọ ofufo+ maka ọrụ Jehova, nọkwa n’okpuru ya, o nwere narị puku ndị dimkpa abụọ bụ́ ndị dike.
17 N’ebo Benjamin,+ e nwere Elayada bụ́ dimkpa na dike, o nwere narị puku ndị ikom abụọ ndị na-eji ụta na ọta.+
18 Jehọzabad nọ n’okpuru ya, o nwere otu narị puku ndị ikom na iri puku asatọ bụ́ ndị e kere ekike ịga agha.
19 Ọ bụ ndị a bụ ndị na-ejere eze ozi ma e wezụga ndị eze debere n’obodo e wusiri ike+ ndị dị na Juda dum.