2 Ihe E Mere 17:1-19

17  Jehọshafat+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya ma na-eme ka ọchịchị ya sie ike n’Izrel.  O wee debe ndị agha n’obodo niile e wusiri ike dị na Juda, o mekwara ka e nwee ebe ndị agha na-anọ eche nche n’ala Juda nakwa n’obodo ndị dị n’Ifrem bụ́ ndị Esa nna ya weghaara.+  Jehova wee nọnyere Jehọshafat,+ n’ihi na o jere ije n’ụzọ Devid nna nna ya+ jere, bụ́ onye dịrị ndụ tupu ya onwe ya, ọ chọghịkwa Bel.+  N’ihi na ọ bụ Chineke nke nna ya ka ọ chọrọ,+ ọ bụkwa n’iwu ya ka o jere ije,+ ọ bụghị dị ka omume Izrel si dị.+  Jehova wee mee ka alaeze ahụ guzosie ike n’aka ya;+ Juda dum wee na-enye Jehọshafat onyinye,+ o wee nwee akụnụba na ùgwù nke ukwuu.+  Obi wee sie ya ike ịgbaso ụzọ+ Jehova. O wepụrụ ọbụna ebe ndị dị elu+ na ogwe osisi ndị dị nsọ+ na Juda.  N’afọ nke atọ nke ọchịchị ya, o ziri ozi ka ndị o mere ndị isi bịa, ya bụ, Ben-hel na Obedaya na Zekaraya na Netanel na Mịkaya, iji zie ihe n’obodo ndị dị na Juda,  ndị Livaị sokwa ha, ya bụ, Shemaya na Netanaya na Zebadaya na Asahel na Shemiramọt na Jehọnatan na Adọnaịja na Tobaịja na Tob-adonaịja, bụ́ ndị Livaị, tinyere Elishama na Jehoram, bụ́ ndị nchụàjà.+  Ha wee malite izi ihe+ na Juda, ha jikwa akwụkwọ iwu Jehova;+ ha wee gazuo obodo niile dị na Juda na-ezi ndị mmadụ ihe. 10  Ụjọ+ Jehova wee jide alaeze niile nke ala niile gbara Juda gburugburu. Ha ebusoghịkwa Jehọshafat agha.+ 11  Ụfọdụ ndị Filistia na-ewetara Jehọshafat onyinye,+ na-atụkwara ya ụtụ ego.+ Ndị Arab+ na-akpụtakwara ya ewu na atụrụ, ya bụ, puku ebule asaa na narị asaa nakwa puku mkpi asaa na narị asaa.+ 12  Jehọshafat wee na-enwe ọganihu ma na-adịwanye nnọọ ukwuu;+ o wee na-ewu obodo ndị siri ike+ na obodo ndị a na-akwakọba ihe+ na Juda. 13  Ọ rụrụ ọtụtụ ihe n’obodo ndị dị na Juda; ndị agha+ ndị bụ́ dimkpa na dike+ nọkwa na Jeruselem. 14  Ndị a bụ ọrụ ha dị ka ụlọ ndị nna nna ha si dị: N’ime ndị si na Juda, bụ́ ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha, e nwere Adna bụ́ onyeisi, o nwere narị puku ndị dimkpa atọ bụ́ ndị dike.+ 15  Jehohenan bụ́ onyeisi nọ n’okpuru ya, o nwere narị puku mmadụ abụọ na iri puku asatọ. 16  Amasaya nwa Zikraị, bụ́ onye nyere onwe ya n’afọ ofufo+ maka ọrụ Jehova, nọkwa n’okpuru ya, o nwere narị puku ndị dimkpa abụọ bụ́ ndị dike. 17  N’ebo Benjamin,+ e nwere Elayada bụ́ dimkpa na dike, o nwere narị puku ndị ikom abụọ ndị na-eji ụta na ọta.+ 18  Jehọzabad nọ n’okpuru ya, o nwere otu narị puku ndị ikom na iri puku asatọ bụ́ ndị e kere ekike ịga agha. 19  Ọ bụ ndị a bụ ndị na-ejere eze ozi ma e wezụga ndị eze debere n’obodo e wusiri ike+ ndị dị na Juda dum.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji