2 Ihe E Mere 16:1-14
16 N’afọ nke iri atọ na isii nke ọchịchị Esa, Beasha+ eze Izrel busoro Juda agha wee malite iwu Rema,+ ka ọ ghara ikwe ka onye ọ bụla pụọ ma ọ bụ bata n’ebe Esa eze Juda nọ.+
2 Esa wee si n’akụ̀ dị n’ụlọ Jehova+ nakwa n’ụlọ eze+ wepụta ọlaọcha na ọlaedo zigara Ben-hedad+ bụ́ eze Siria,+ onye bi na Damaskọs,+ sị:
3 “Mụ na gị gbara ndụ, nna m na nna gị gbakwara ndụ. Lee, m na-ezitere gị ọlaọcha na ọlaedo. Gaa mebie ọgbụgba ndụ gị na Beasha+ eze Izrel, ka o wee hapụ m.”+
4 Ben-hedad wee gee Eze Esa ntị ma ziga ndị isi ndị agha ya, ha wee buso obodo ndị dị n’Izrel agha, ha wee bibie Aịjọn+ na Dan+ na Ebel-meyim+ na ebe niile a na-akwakọba ihe+ n’obodo ndị dị na Naftalaị.
5 O wee ruo na ngwa ngwa Beasha nụrụ ya, ọ kwụsịrị iwu Rema ozugbo, kwụsịkwa ọrụ ọ nọ na-arụ.+
6 Ma Esa bụ́ eze kpọọrọ Juda dum,+ ha wee buru nkume Rema+ na osisi ya, bụ́ ndị Beasha ji na-ewu ya,+ o wee jiri ha malite iwu Giba+ na Mizpa.+
7 N’oge ahụ, Hanenaị+ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Esa eze Juda wee sị ya: “Ebe ọ bụ na ị dabeere n’ebe eze Siria+ nọ, ị dabereghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ,+ n’ihi ya, ndị agha eze Siria agbapụwo n’aka gị.
8 Ọ̀ bụ na ndị Itiopia+ na ndị Libia+ abụghị ìgwè ndị agha dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya?+ Ọ̀ bụ na Jehova enyefeghị ha n’aka gị maka na ị dabeere n’ebe ọ nọ?+
9 N’ihi na anya+ Jehova na-ahụzu ụwa dum+ iji gosi ike ya maka ndị obi ha+ zuru ezu n’ebe ọ nọ. I zuzuru nzuzu+ n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.”+
10 Ma Esa wesoro onye ọhụ ụzọ ahụ iwe wee tụkpuo ya n’ụlọ ọtọsị,+ n’ihi na o wesoro ya oké iwe n’ihi ihe a.+ Esa wee malite ichi+ ụfọdụ n’ime ndị ala ya ọnụ n’ala n’oge ahụ.
11 Ma, lee, ihe metụtara Esa, ndị mbụ na ndị ikpeazụ, e dere ha n’Akwụkwọ+ Ndị Eze Juda na Izrel.
12 N’afọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Esa, ọrịa tụrụ ya n’ụkwụ ruo mgbe ọ rịasiwere ọrịa ike;+ ọbụna mgbe ọ nọ n’ọrịa, ọ chọghị Jehova,+ kama ọ chọrọ ndị na-agwọ ọrịa.+
13 N’ikpeazụ, Esa sooro nna nna ya hà dinaa,+ o wee nwụọ n’afọ nke iri anọ na otu nke ọchịchị ya.
14 Ha wee lie ya ná nnukwu ili+ o gwuuru onwe ya n’Obodo Devid;+ ha wee nyiwe ya n’ihe ndina nke jupụtara ná mmanụ bọlsọm+ na ụdị mmanụ otite+ dị iche iche ndị a gwara n’ụdị pụrụ iche.+ Ha surekwaara ya ihe nsure ọkụ dị ukwuu+ maka olili ya.