2 Ihe E Mere 15:1-19
15 Mmụọ+ Chineke wee dakwasị Azaraya nwa Oded.+
2 O wee gakwuru Esa sị ya: “Geenụ m ntị, Esa na Juda na Benjamin dum! Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya;+ ọ bụrụ na unu achọọ+ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.+
3 Izrel nọ+ n’enweghị ezi Chineke, n’enweghị onye nchụàjà na-ezi ihe,+ n’enweghịkwa Iwu, ruo ogologo oge.
4 Ma mgbe ha nọ n’ahụhụ,+ ha na-alọghachikwute Jehova bụ́ Chineke Izrel+ ma chọọ ya, mgbe ahụ, ọ na-ekwe ka ha chọta ya.+
5 N’oge ahụ, udo adịrịghị onye na-apụ apụ ma ọ bụ onye na-abata abata,+ n’ihi na e nwere ọgba aghara n’etiti ndị niile bi n’ala ndị a.+
6 Ha gweriri ibe ha, otu mba gweriri mba ọzọ,+ otu obodo egweriekwa obodo ọzọ, n’ihi na Chineke tinyere ha n’ọgba aghara site n’ime ka ụdị nsogbu ọ bụla dakwasị ha.+
7 Ma unu onwe unu, nweenụ obi ike,+ unu enwela nkụda aka,+ n’ihi na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ unu.”+
8 Ozugbo Esa nụrụ okwu ndị a na amụma Oded+ onye amụma buru, obi siri ya ike, o wee wepụsịa ihe arụ+ n’ala niile nke Juda na Benjamin nakwa n’obodo ndị o weghaara n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, ọ rụzikwara ebe ịchụàjà Jehova nke dị n’ihu ihe owuwu ụzọ mbata nke ụlọ Jehova.+
9 O wee malite ịkpọkọta Juda na Benjamin+ dum na ndị mbịarambịa+ bi n’etiti ha, bụ́ ndị si n’ebo Ifrem na Manase na Simiọn, n’ihi na ọtụtụ mmadụ si n’Izrel gbakwuru ya mgbe ha hụrụ na Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya.+
10 E wee mee ka ha gbakọta na Jeruselem n’ọnwa nke atọ, n’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Esa.
11 Ha wee chụọrọ Jehova àjà n’ụbọchị ahụ site n’ihe ndị ahụ ha kwatara, ya bụ, narị ehi asaa na puku atụrụ asaa.
12 Ha gbakwara ndụ+ na ha ga-eji obi ha dum na mkpụrụ obi ha dum chọọ Jehova bụ́ Chineke nke ndị nna nna ha;+
13 na a ga-egbu onye ọ bụla nke na-achọghị Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ ma onye nta ma onye ukwu,+ ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị.+
14 Ha wee jiri oké olu na iti mkpu ọṅụ na ịfụ opi dị iche iche ṅụọrọ Jehova iyi.+
15 Juda niile wee ṅụrịa ọṅụ+ n’ihi ihe ha ṅụrụ n’iyi; n’ihi na ha ji obi ha dum ṅụọ iyi, jirikwa obi ụtọ chọọ ya, o wee kwe ka ha chọta ya;+ Jehova nọkwa na-enye ha ezumike gbaa gburugburu.+
16 Ma Esa bụ́ eze+ chụturu Meaka+ nne ya ochie ka ọ ghara ịbụkwa nnukwu nwaanyị,+ n’ihi na o mere arụsị jọgburu onwe ya nke e ji efe ogwe osisi dị nsọ+ ofufe; Esa wee gbutuo arụsị+ ya jọgburu onwe ya, gwerie ya ma kpọọ ya ọkụ+ na ndagwurugwu Kidrọn.+
17 Ma e bibighị+ ebe ndị dị elu+ n’Izrel. Ọ bụ naanị na obi Esa zuru ezu n’ụbọchị ya niile.+
18 O wee webata ihe niile nna ya doro nsọ na ihe niile+ ya onwe ya doro nsọ, n’ụlọ ezi Chineke, ya bụ, ọlaọcha na ọlaedo na arịa dị iche iche.+
19 Ma a lụghị agha ruo n’afọ nke iri atọ na ise nke ọchịchị Esa.+