2 Ihe E Mere 14:1-15

14  N’ikpeazụ, Abaịja sooro nna nna ya hà dinaa,+ ha wee lie ya n’Obodo Devid;+ Esa+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya. Ala ahụ enweghị nsogbu+ n’ụbọchị ya ruo afọ iri.  Esa wee mee ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.  O wee wepụsịa ebe ịchụàjà ndị mba ọzọ+ na ebe ndị dị elu+ ma kụtusịa ogidi nsọ dị iche iche,+ gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ.+  Ọ gwakwara Juda ka ha chọọ+ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nakwa ka ha debe iwu ya+ na ntụziaka ya.+  O wee wepụ ebe ndị dị elu na ihe e ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ n’obodo niile dị na Juda; alaeze ahụ wee nọrọ n’enweghị nsogbu+ mgbe ọ na-achị.  O wee wuo obodo ndị siri ike na Juda,+ n’ihi na ala ahụ enweghị nsogbu ọ bụla; e busoghịkwa ya agha n’ime afọ ndị a, n’ihi na Jehova nyere ya ezumike.+  O wee sị Juda: “Ka anyị wuo obodo ndị a, wuo mgbidi+ gburugburu ha, wuokwa ụlọ nche,+ rụọkwa ọnụ ụzọ ámá ndị nwere ibo abụọ nakwa ihe ntụchi ha.+ N’ihi na ala a ka bụ nke anyị, n’ihi na anyị achọwo Jehova bụ́ Chineke anyị.+ Anyị achọwo ya, o wee nye anyị ezumike gbaa gburugburu.”+ Ha wee na-ewu ihe owuwu ma na-enwe ihe ịga nke ọma.+  Esa wee nwee ìgwè ndị agha na-ebu ọta ukwu+ na ube,+ narị puku mmadụ atọ ndị si na Juda.+ Ndị na-ebu obere ọta na ndị na-ekwe ụta,+ bụ́ ndị si na Benjamin, dị narị puku mmadụ abụọ na iri puku asatọ.+ Ndị a niile bụ ndị dimkpa bụ́ dike.  E mesịa, Zira onye Itiopia+ ji otu nde ndị agha+ na narị ụgbọ ịnyịnya atọ gawa ibuso ha agha, o wee ruo Marisha.+ 10  Esa wee gawa ibuso ya agha, ha wee hazie onwe ha n’usoro ibu agha na ndagwurugwu Zefata nke dị na Marisha. 11  Esa wee malite ịkpọku Jehova bụ́ Chineke ya,+ sị: “Jehova, a bịa n’inye aka, ma ndị mmadụ hà dị ọtụtụ ma ọ bụ na ha adịghị ike, o nweghị ihe o mere n’ebe ị nọ.+ Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị dabeere n’ebe ị nọ,+ anyị jikwa aha gị+ na-ebuso ìgwè mmadụ a agha. Jehova, ọ bụ gị bụ Chineke anyị.+ Ekwela ka mmadụ efu kara gị ike.”+ 12  Jehova wee merie ndị Itiopia+ n’ihu Esa nakwa n’ihu Juda. Ndị Itiopia wee gbaa ọsọ. 13  Esa na ndị so ya wee chụrụ ha ruo Gira,+ e wee na-egbu ndị Itiopia ruo mgbe ọ na-enweghị onye ọ bụla n’ime ha fọrọ ndụ; n’ihi na e tipịasịrị ha n’ihu Jehova+ nakwa n’ihu ndị agha ya.+ E mesịa, ha bukọọrọ ihe nkwata dị nnọọ ukwuu.+ 14  Ha bibikwara obodo niile gbara Gira gburugburu, n’ihi na ụjọ+ Jehova ji ha; ha wee bukọrọ ihe dị n’obodo niile ahụ, n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ha ga-akwara n’ime ha.+ 15  Ha bibiri ụlọikwuu+ nke ndị na-akpa anụ, ha wee kpụrụ+ ọtụtụ ìgwè ewu na atụrụ na kamel,+ e mesịa, ha laghachiri na Jeruselem.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji